Iji Ụra Ụgwọ—Nsogbu ahụ Ọ̀ Na-akawanye Njọ?
Iji Ụra Ụgwọ—Nsogbu ahụ Ọ̀ Na-akawanye Njọ?
ỌTỤTỤ nde mmadụ taa ji ezigbo “ụgwọ.” Ụgwọ a pụrụ ịbụ isi ihe ga-eme ka ha kpọkaa ụgbọala ha, ka a chụọ ha n’ọrụ, nke ga-emekwa ka ọbụna alụmdi na nwunye ha tisaa. Ọ pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ahụ́ ike ha nakwa ogologo oge ha ga-adịru ndụ. Ọ bụ ụgwọ nke so eme ka usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ gharazie ịdị ike, na-eme ka ọ dịrị mmadụ mfe ibute ọrịa dị iche iche. E kwuwo na ọ pụrụ ịkpata nsogbu ahụ́ ike ndị dị ka ọrịa shuga, ọrịa obi, na oké ibu, nakwa nsogbu ahụ́ ike ndị ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ọtụtụ amaghị na ha ji ụgwọ a.
Ihe na-akpata nsogbu a nile bụ iji ụra ụgwọ, bụ́ ọnọdụ mmadụ na-anọ na ya mgbe ọ na-ehighị ụra otú dị mma iji mee ka ahụ́ sie ya ike. Ihe pụrụ ịkpata nke a bụ mmadụ ichu onwe ya ụra n’ihi ụdị ndụ ọ na-ebi, ma ọ bụkwanụ ọrịa ichu mmadụ ụra.
Ndị na-eme nnyocha banyere ahụ́ ike na-eme atụmatụ na, ná nkezi, oge ndị bi n’ụwa ji ehi ụra ugbu a ji otu awa dị ala n’awa ole ha kwesịrị ihi ụra n’abalị. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ iyi obere ihe, ijeri awa isii a na-eji ụra ụgwọ kwa abalị emewo ka e mewa nnyocha banyere ụdị dị iche iche nke ọrịa ndị ụra na-akpata nakwa mmetụta ha na-enwe n’ọdịdị nke ndụ.
Ndị ọrụ ahụ́ ike cheburu na nanị nsogbu metụtara ụra e nwere bụ mmadụ ịnọgide na-abụ onye na-enweghị ike ihi ụra nke ọma. Otú ọ dị, otu òtù nke Nzukọ Ezumezu United
States guzobere, kwuru na e nwere nsogbu ihi ụra 17 dị iche iche. Ka o sina dị, ihe na-akpata nsogbu nke ehighị ụra nke ọma dị nnọọ ọtụtụ nke na a na-elekarị ya anya dị ka ihe mgbaàmà nke nsogbu ndị ọzọ, dị nnọọ ka ahụ́ ọkụ na-egosi na mmadụ pụrụ ibutewo ọrịa.
Ọbụna mmadụ ichu onwe ya ụra oge ụfọdụ, pụrụ ịkpata ọdachi. Tụlee banyere Tom. N’agbanyeghị na ọ bụ onye ịkwọ ụgbọala trela doro anya nke ọma, ọ sọnyere ụgbọala ya nwere ụkwụ 18 isi n’ígwè mgbochi na-adị n’akụkụ ụzọ ma kwafuo lita 400 nke mmanụ sulfuric acid n’otu ụzọ awara awara ụgbọala na-agbakarị. Tom na-ekweta, sị: “Ụra buuru m.” Nnyocha e mere n’ụzọ awara awara abụọ dị na United States na-egosi na ọ bụ ndị ọkwọ ụgbọala ụra na-atụ kpatara ihe dị ka pasent 50 nke mkpọkasị ụgbọala ndị tara isi ndị mmadụ.
Tụleekwa banyere ihe ize ndụ mmadụ pụrụ ịnọ na ya n’ebe ọrụ mgbe ọ nọ onye ọrụ ibe ya nke ụra na-atụ nso. Onye Australia na-eme nchọpụta, bụ́ Ann Williamson, na-ekwu, sị: “Mgbe [ndị e ji mee nchọpụta] nọsịrị awa 17 ruo 19 n’ehighị ụra, ikike ha nwere n’ime ihe ụfọdụ e ji nwalee ha bịara hara ma ọ bụ ghara ịharu ka *
nke onye [mmanya na-aba n’anya nke dị n’ọbara ya dị] pasent 0.05.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị e ji mee nnwale ahụ rụrụ ọrụ dị ka à ga-asị na ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya nke dị n’ọbara ha hà ka ma ọ bụ karịa ọ̀tụ̀tụ̀ nke iwu mba ụfọdụ kwuru ka a hụdebe n’ọbara onye na-akwọ ụgbọala! Ebe ọ bụ na ụra na-akpata ọtụtụ narị puku ihe ọghọm ụgbọala nakwa nke ebe ọrụ kwa afọ, mfu ụlọ ọrụ nakwa ezinụlọ dị iche iche na-enwe n’ụwa nile, hiri nne.Olee ihe ndị pụrụ iso kpata iji ụra ụgwọ? Otu bụ ihe a na-ahụ n’etiti ndị mmadụ, bụ́ ịrụ ọrụ awa 24 n’ụbọchị, ụbọchị asaa n’izu. Akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today na-akọwa nke a dị ka “mgbanwe dị ukwuu n’ọdịbendị, bụ́ nke na-agbanwe ụzọ anyị si ebi ndụ,” na-ekwu na “ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-azụ ahịa na ndị na-arụ ọrụ awa iri abụọ na anọ, na-enweta uru ahịa site n’ileghara inye ọrụ na ụra oge kwesịrị ha, anya.” N’ọtụtụ ala, ndị mmadụ na-eji oge ndị ha kwesịrị iji na-ehi ụra ekiri ihe omume telivishọn ndị a na-emegide chi abọọ, ha na-ejikwa oge ahụ achọ ihe n’Intanet. Ihe ọzọ na-eso akpata ya bụ nsogbu mmetụta uche, nke na-agụnyekarị nchekasị, bụ́ nke nrụgide na ndụ gbalụ gbalụ na-eme ka ọ ka njọ. N’ikpeazụ, e nwere ọrịa anụ ahụ́ dịgasị iche iche bụ́ ndị pụrụ iso mee ka mmadụ jiri ụra ụgwọ.
Ọtụtụ ndị dọkịta na-ekwu na ọ na-esiri ha ike ime ka ndị ha na-agwọ were iji ụra ụgwọ dị ka nsogbu dị njọ. Otu dọkịta mere mkpesa na ụfọdụ ndị ọbụna na-ewere ike ọgwụgwụ na-adịghị akwụsị akwụsị dị ka “ihe ùgwù.” Ebe ọ bụkwa na ọnọdụ ha na-ejikarị nnọọ nke nta nke nta aka njọ, ndị na-echu onwe ha ụra nwere ike ghara ịchọpụta na ha nwere ajọ nsogbu ihi ụra. Ọtụtụ ndị na-eche, sị, ‘Akawalanụ m nká’ ma ọ bụ, ‘Ndụ na-esiri m ike, n’ihi ya ike anaghịzi adị m ime ihe ọ bụla’ ma ọ bụkwanụ, ‘Ike na-agwụ m mgbe nile n’ihi na enweghị m ike izu ike ruo ogologo oge otú ahụ́ m chọrọ.’
Ịkwụ ụgwọ a e ji ụra bụ ihe ịma aka tara akpụ. Ma ịghọta usoro ụra na-edozi ahụ́ si aga nakwa ịmụta otú e si amata ihe mgbaàmà nke iji ụra ụgwọ, pụrụ ịkwali mmadụ ime mgbanwe. Ịmata ihe mgbaàmà nke ajọ nsogbu ihi ụra pụrụ ịzọpụta ndụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 E kweere na ike ọgwụgwụ so kpata ọtụtụ n’ime ihe ọghọm ndị kasị njọ e nweworo na narị afọ nke 20. Lee Teta! nke February 8, 2001, peeji nke 6.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ọbụna mmadụ ichu onwe ya ụra oge ụfọdụ, pụrụ ịkpata ihe ọghọm dị oké njọ