Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya nke Dịịrị Ndị Nwere Nsogbu Ahụ

Olileanya nke Dịịrị Ndị Nwere Nsogbu Ahụ

Olileanya nke Dịịrị Ndị Nwere Nsogbu Ahụ

N’OGE gara aga, ndị mmadụ na-ezerekarị ndị nwere nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche. N’ihi ya, ọtụtụ ndị nwere nsogbu ahụ ghọrọ ndị na-abaghị n’ihe n’anya ndị mmadụ. A chụrụ ụfọdụ ndị n’ọrụ ma ọ bụ jụ iwe ha n’ọrụ. Ndị ọzọ bụ ndị ndị òtù ezinụlọ ha zeere. Mgbe mgbe, nke a mere nnọọ ka nsogbu ahụ ka njọ ma mee ka ndị nwere ya ghara inweta enyemaka.

Otú ọ dị, n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwewo ọganihu dị ukwuu n’ịghọta nsogbu nke ịda mbà n’obi na nke ihe imetụ mmadụ n’isi. Ugbu a, ọ bụ ihe a maara nke ọma na a pụrụ ịgwọ nsogbu ndị a agwọ. Ma inweta enyemaka anaghị adị mfe mgbe nile. N’ihi gịnị?

Ịmata Ihe Mgbaàmà Ya

A dịghị achọpụta nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche site n’inyocha ọbara ma ọ bụ ise foto X ray. Kama nke ahụ, a na-enyocha akparamàgwà mmadụ, ụzọ o si eche echiche, na ụzọ o si ele ihe anya, ruo oge ụfọdụ. A ghaghị ịhụ ọtụtụ ihe mgbaàmà tupu e kwubie na onye ahụ nwere nsogbu ahụ. Ihe bụ́ nsogbu bụ na mgbe ụfọdụ, ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi adịghị aghọta na ihe ha na-ahụ bụ ihe àmà na-egosi nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche. “Ọbụna mgbe ndị mmadụ kwetara na mmadụ na-akpazi àgwà otú ọ na-adịghị akpabu,” ka Dr. David J. Miklowitz na-ede, “ha pụrụ inwe echiche dịgasị iche iche banyere ihe mere onye ahụ ji akpa àgwà otú ahụ.”

Ọzọkwa, ọbụna mgbe ndị òtù ezinụlọ chere na ọnọdụ ahụ apụwala n’egwú, ọ pụrụ isi ike ime ka onye nwere nsogbu ahụ kweta na ọ dị mkpa ka e lebara ahụ́ ike ya anya. Ma ọ̀ bụkwanụ, ọ bụrụ na ọ bụ gị nwere nsogbu ahụ, e nwere ike ị gaghị achọ inweta enyemaka. Dr. Mark S. Gold na-ede, sị: “Ikekwe ị na-ekwere ihe ị na-adị eche mgbe ị dara mbà n’obi—na ọ dịghị uru ị bara, n’ihi ya na ọ dịghị mkpa ịchọwa enyemaka mgbe olileanya na-adịrịghị gị. Ma eleghị anya ọ ga-amasị gị ịga hụ mmadụ maka ya, ma ị na-eche na ịda mbà n’obi bụ ihe ihere, na ọ bụ gị ka o si n’aka. . . . Ma eleghị anya, ị maghị na mmetụta ị na-enwe bụ ịda mbà n’obi.” Ka o sina dị, n’ebe ndị nwere oké ịda mbà n’obi nọ, ọ dị oké mkpa ka e lebara ahụ́ ike ha anya.

N’ezie, onye ọ bụla na-enwe nkụda mmụọ n’oge ụfọdụ, nke a adịchaghịkwa egosi na mmadụ nwere nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche. Ma gịnị ma ọ bụrụ na mmetụta ndị a eyie ka hà dị njọ karịa nkụda mmụọ nkịtị? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ha adịgide ruo ogologo oge karịa otú ha kwesịrị ịdịru—ikekwe, izu abụọ ma ọ bụ karịa? Ọzọkwa, ka e were ya na ịda mbà n’obi ahụ na-egbochi gị ime ihe otú ị na-emebu, ma ọ̀ bụ n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ n’etiti ndị mmadụ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ịga hụ onye ọkachamara bụ́ onye ruru eru ịchọpụta ma gwọọ nsogbu nke ịda mbà n’obi.

Mgbe ihe kpatara ya bụ mmiri ọgwụ ahụ́ ahaghị otú kwesịrịnụ, a pụrụ idepụtara onye ahụ ọgwụ ụfọdụ ọ ga-aṅụ. N’ọnọdụ ndị ọzọ, a pụrụ ịtụ aro maka usoro nke inye ya ihe ọmụma iji nyere ya aka ịmata otú ọ pụrụ isi na-anagide ọnọdụ ya. N’ọnọdụ ụfọdụ, ụzọ abụọ ahụ arụpụtawo ihe bara uru mgbe e jikọtara ha ọnụ. * Ihe dị mkpa bụ mmadụ ịchọ na inweta enyemaka. “Ọtụtụ mgbe, ndị nwere nsogbu ahụ na-atụ ụjọ ma na-eme ihere banyere ọnọdụ ha,” ka Lenore, bụ́ onye ihe na-emetụ n’isi, nke a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, na-ekwu. “Otú ọ dị, ihe bụ́ ihe ihere n’ezie bụ inwe mmetụta na i nwere nsogbu ma ghara ịchọ enyemaka nke dị gị oké mkpa.”

Lenore na-ekwu site n’ahụmahụ ndị o nweworo. “Anọwo m n’ọnọdụ fọrọ nke nta ka m ghara isi n’àkwà bilie ọtọ ruo otu afọ,” ka ọ na-ekwu. “E mesịa, otu ụbọchị ahụ́ sitụrụ m ike, ekpebiri m ịkpọ dọkịta na fon ma gwa ya na m ga-abịa ịhụ ya.” A chọpụtara na ihe na-emetụ Lenore n’isi, e depụtakwaara ya ọgwụ ndị ọ ga na-aṅụ. Ọ bụ n’oge a ka ọ malitere inwe mgbanwe ná ndụ ya. “Ahụ́ na-adị m mma mgbe m ṅụrụ ọgwụ m,” ka Lenore na-ekwu, “ọ bụ ezie na aghaghị m ịnọgide na-echetara onwe m na ọ bụrụ na m akwụsị ịṅụ ọgwụ, ihe mgbaàmà nile m na-enwe ga-alọghachite.”

Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe Brandon nọ, bụ́ onye nwere nsogbu nke ịda mbà n’obi. “Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma,” ka ọ na-ekwu, “ana m echekarị echiche igbu onwe m n’ihi mmetụta gabigara ókè nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe bụ́ nke m na-enwe. Ọ bụ rịị mgbe m dị afọ 30 ka m gara hụ onye dọkịta.” Dịkwa ka Lenore, Brandon na-aṅụ ọgwụ iji na-anagide nsogbu ya, ma e nwekwara ihe ndị ọzọ na-enye aka. “Iji nyere onwe m aka,” ka ọ na-ekwu, “ana m elebara uche m na ahụ́ m anya. Ana m ezu ike ma na-akpachapụ anya banyere ihe m na-eri. Ana m ejikwa echiche ndị dị mma sitere na Bible emejupụta uche na obi m.”

Otú ọ dị, Brandon na-eme ka ọ pụta ìhè na ịda mbà n’obi bụ nsogbu ahụ́ ike—ọ bụghị nke ime mmụọ. Ịghọta nke a dị oké mkpa maka mgbake. Brandon na-akọ, sị: “N’otu oge, otu Onye Kraịst ibe m na-ebughị ihe ọjọọ n’obi gwara m na ebe ọ bụ na Ndị Galeshia 5:22, 23 na-ekwu na ọṅụ bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, ọ ghaghị ịbụ na m dara mbà n’obi n’ihi na m anọwo na-eme ihe na-egbochi mmụọ ahụ. Nke ahụ mere ọbụna ka m nwekwuo obi amamikpe na ịda mbà n’obi. Ma ozugbo m malitere inweta enyemaka, obi mgbarụ m na-enwe malitere ịkwụsị. Ahụ́ bịara dị m nnọọ mma karị! Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nwetara enyemaka ahụ ngwa ngwa karị.”

Inwe Mmeri n’Ọgụ Ahụ

Ọbụna mgbe a chọpụtasịworo nsogbu ahụ ma malite ịgwọ ya, o yiri ka ọ̀ ga-anọgide na-ewetara onye nwere ya ihe ịma aka. Kelly, bụ́ onye ya na oké ịda mbà n’obi na-alụ, nwere ekele maka enyemaka onye ọkachamara nyere ya bụ́ nke doziworo akụkụ metụtara ahụ́ ike nke ọnọdụ ya. Otú ọ dị, tụkwasị na nke a, ọ chọpụtawo na agbamume nke ndị ọzọ dị oké mkpa. Na mbụ, obi akachaghị Kelly ịchọ enyemaka ndị ọzọ n’ihi na ọ chọghị ka e lee ya anya dị ka ibu arọ. “Abịara m mụwa ọ bụghị nanị ịchọ enyemaka kamakwa ịnakwere ya,” ka ọ na-ekwu. “Ọ bụ nanị mgbe m kọọrọ ndị ọzọ banyere ya ka m bịara nwee ike ịkwụsị ịdawanye mbà n’obi.”

Dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, Kelly na ndị kwere ekwe ibe ya na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ọbụna oge obi ụtọ ndị a na-eweta ihe ịma aka. “Mgbe mgbe, ọkụ eletrik, ngagharị nke ụmụ mmadụ, na ụzụ, pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ahụ́ m. Mgbe ahụ, m na-amalite inwe obi amamikpe, ịda mbà n’obi m na-arịkwa elu n’ihi na ọ na-adị m ka nsogbu m aghaghị ịbụ ihe na-egosi ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.” Olee otú Kelly na-esi achịkwa ọnọdụ a? Ọ na-ekwu, sị: “Amụtawo m na ịda mbà n’obi bụ ọrịa m na-aghaghị ịnagide. Ọ bụghị ihe na-egosipụta ókè ịhụnanya m nwere n’ebe Chineke ma ọ bụ Ndị Kraịst ibe m nọ haruru. Ọ bụghị ihe na-egosipụta n’ezie ma m̀ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.”

Lucia, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ n’usoro isiokwu ndị a, nwere ekele maka nlekọta ahụ́ ike bụ́ ịgba nke o nwetaworo. “Ịgakwuru ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike nke uche enyeworo m nnọọ aka ịmụta ịnagide mgbanwe ọnọdụ uche bụ́ nke ya na ọrịa a na-agakọ,” ka ọ na-ekwu. Lucia na-emesikwa ike mkpa izu ike dị. “Ụra bụ isi ihe dị mkpa n’ịchịkwa ime ara ara,” ka ọ na-ekwu. “Ọ bụrụ na m ehighị ụra nke ọma, m ga na-eme ara ara karị. Ọbụna mgbe ụra na-ekweghị atụ m, kama ibili ọtọ, azụwo m onwe m idinara ebe m dina ma zuo ike.”

Sheila, bụ́ onye a kpọtụkwara aha na mbụ, ahụtawo ya dị ka ihe na-enye aka inwe akwụkwọ ọ na-edetu otú obi dị ya kwa ụbọchị. Ọ chọpụtara na ihe akawo mma n’ụzọ o si ele ihe anya. Ka o sina dị, e nwere ihe ịma aka. “N’ihi ihe ụfọdụ, ike ọgwụgwụ na-eme ka echiche ndị na-ezighị ezi na-abata m n’uche,” ka Sheila na-ekwu. “Ma amụtawo m iwepụ ha n’uche m ma ọ bụkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ịbịanyụtụ ha.”

Nkasi Obi Sitere n’Okwu Chineke

Bible bụụrụ ọtụtụ ndị na-enwe “nchegbu” ihe enyemaka na-eme ka ha dị ike. (Abụ Ọma 94:17-19, 22) Dị ka ihe atụ, Cherie hụtara Abụ Ọma 72:12, 13 dị ka ihe na-agba ume karịsịa. N’ebe ahụ, ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere Eze Chineke họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.” Okwu Pọl onyeozi nke e dekọrọ ná Ndị Rom 8:38, 39, gbakwara Cherie ume: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke.”

Elaine, bụ́ onye ihe na-emetụ n’isi, hụtara mmekọrịta ya na Chineke dị ka ihe na-akwado ya. Ọ na-enweta nnọọ nkasi obi site n’okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.” (Abụ Ọma 51:17) “Ọ bụwo ihe na-akasi obi n’ezie ịmara na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, na-aghọta,” ka ọ na-ekwu. “Ọ bụwo ihe na-enyekwu m ume bụ́ ịbịaru ya nso n’ekpere, karịsịa n’oge oké nchegbu na ahụhụ.”

Dị ka a pụrụ ịhụ, inwe nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche na-eweta ihe ịma aka ndị pụrụ iche. Otú ọ dị, Cherie na Elaine chọpụtara na ịdabere n’ebe Chineke nọ n’ekpere nakwa inweta ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị mere ka ha nwee ike ime ka ọnọdụ ha ka mma. Otú ọ dị, olee otú ndị ezinụlọ na ndị enyi pụrụ isi nyere ndị dara mbà n’obi ma ọ bụ ndị ihe na-emetụ n’isi, aka?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Teta! adịghị akwado usoro ọgwụgwọ ọ bụla. Ndị Kraịst kwesịrị ijide n’aka na usoro ọgwụgwọ ọ bụla ha ji eme ihe emegideghị ụkpụrụ Bible.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

“Ozugbo m malitere inweta enyemaka, obi mgbarụ m na-enwe malitere ịkwụsị. Ahụ́ bịara dị m nnọọ mma karị!”—BRANDON

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ihe Otu Di Chọpụtara

“Tupu Lucia amalite inwe nsogbu, nghọta dị nkọ o nwere metụtara ndụ ọtụtụ ndị n’ụzọ dị mma. Ọbụna ugbu a, mgbe ndị mmadụ letara nwunye m n’oge ọ nọ jụụ, omume ịhụnanya ya yiri ka ọ̀ na-amasị ha. Ihe ọtụtụ ndị na-aghọtaghị bụ na kemgbe afọ anọ gara aga, Lucia ediwo nsogbu uche nke na-eme ya nwee oké ịda mbà n’obi n’oge a, n’oge ọzọ ya emewe ara ara.

“N’oge ọ na-eme ara ara, Lucia na-amụkarị anya ruo elekere mbụ, abụọ, ma ọ bụ ọbụna elekere atọ nke ụtụtụ, na-enwe nnọọ echiche ndị magburu onwe ha. Ọ na-abịa nwee nnọọ ike. Ọ na-emeghachi omume n’ụzọ gabigara ókè n’ihe ndị na-enweghị nnọọ ihe ha bụ ma na-emefu ego aghara aghara. Ọ na-etinye onwe ya n’ọnọdụ ndị dị nnọọ ize ndụ, na-eche na ọ dịghị ihe ga-eme ya, na e nweghị ihe ize ndụ ọ bụla dịnụ—n’ụzọ omume, n’ụzọ anụ ahụ́, ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ. E nwekwara ihe ize ndụ na ọ pụrụ igbu onwe ya n’ihi oké mkpali ndị a. Ihe na-esochikarị ime ara ara ya bụ ịda mbà n’obi bụ́ nke na-akpụkarị ọkụ n’ọnụ dị ka ara ara o bu ụzọ mee.

“Ndụ m agbanwewo nnọọ. N’agbanyeghị na Lucia na-enweta ọgwụgwọ, ihe anyị pụrụ ịrụzu taa pụrụ ịdị iche n’ihe anyị gaara arụzu ụnyaahụ ma ọ bụ ihe anyị ga-arụzu echi. Ọ na-agbanwe ka ọnọdụ anyị na-agbanwe. A manyere m ịdị na-eme mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ dịnụ karịa ka m cheburu na m ga-enweli ike ime.”—Mario.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

Mgbe E Depụtara Ọgwụ A Ga-aṅụ

Ụfọdụ ndị na-eche na ịṅụ ọgwụ bụ ihe na-egosi na mmadụ adịghị ike. Ma legodị ya anya otú a: Onye na-arịa ọrịa shuga aghaghị ịdị na-enweta usoro ọgwụgwọ, nke pụrụ ịgụnye ịdị na-agba ọgwụ ndị ga-eme ka o nwee mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ insulin. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe àmà nke adịghị ike? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ nnọọ ụzọ isi mee ka ihe ndị na-edozi ahụ́ dịrị otú kwesịrịnụ iji mee ka onye nwere nsogbu ahụ nọgide na-enwe ahụ́ ike.

Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’ịṅụ ọgwụ maka nsogbu nke ịda mbà n’obi nakwa nke ihe imetụ mmadụ n’isi. Ọ bụ ezie na e nyeworo ọtụtụ ndị aka site n’inye ha ihe ọmụma nke meworo ka ha nwee ike ịghọta nsogbu ha, ọ ka dịkwa mkpa ịkpachapụ anya. Mgbe ihe kpatara ya bụ na mmiri ọgwụ ahụ́ adịghị otú kwesịrịnụ, a pụghị ime ka nsogbu ahụ kwụsị nanị site n’inye onye nwere ya ihe ọmụma ezi uche dị na ya. Steven, bụ́ onye ihe na-emetụ n’isi, na-akọ, sị: “Onye dọkịta nke nọ na-agwọ m si otú a kọwaa ya: Ị pụrụ ịkụziri mmadụ ụzọ nile e si akwọ ụgbọala, ma, ọ bụrụ na i bunye onye ahụ ụgbọala na-enweghị ihe e ji anyagharị ya ma ọ bụ breeki, mgbe ahụ, ihe ndị ahụ ị kụziiri ya agaghị abacha uru. N’otu aka ahụ, inye onye dara mbà n’obi nanị ihe ọmụma ezi uche dị na ya nwere ike ọ gaghị arụzu ihe ndị a chọrọ. Nzọụkwụ mbụ bara uru bụ ime ka mmiri ọgwụ na-adị n’ụbụrụ dịrị otú kwesịrịnụ.”

[Foto dị na peeji nke 10]

Bible bụụrụ ọtụtụ ndị na-enwe echiche na-ezighị ezi ihe enyemaka na-eme ka ha dị ike