Aha Jehova n’Àgwàetiti Ndị Dị na Pacific
Aha Jehova n’Àgwàetiti Ndị Dị na Pacific
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA FIJI
O JURU ìgwè mmadụ ahụ anya nke ukwuu. Ndị bịara ọhụrụ n’àgwàetiti ha nke dị na Pacific mechiri anya tupu ha eriwe nri e siiri ha. “Gịnị ka unu na-eme?” ka ndị bi n’àgwàetiti ahụ jụrụ ha.
“Anyị na-ekele Chineke maka onyinye Ya,” ka ha zaghachiri.
“Olee ebe Chineke unu bi?” ka ndị ahụ bi n’àgwàetiti ahụ chọrọ ịmata.
“O bi n’eluigwe,” ka a gwara ha.
“Gịnị bụ aha Ya?”
“Jehova.”
“Chineke unu ọ̀ na-eri nri?” ka ndị bi n’àgwàetiti ahụ jụrụ.
“Chineke bụ Mmụọ,” ka ndị ahụ bịara ọhụrụ zaghachiri. “Ọ dịghị ka anyị; Ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ Ya kere ụwa, ígwé, oké osimiri, na ihe nile. Ọ bụ ya kere anyị.”
Eziokwu a dị mfe wụrụ ndị bi n’àgwàetiti ahụ ibobo n’ahụ́, ha jụkwara ndị ọbịa ahụ ihe mere ha ji bịa n’àgwàetiti ha. Ha nyere azịza dị mfe: “Anyị bịara ime ka unu mata ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova na Ọkpara Ya bụ́ Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Nzọpụta anyị.”—Site n’akwụkwọ bụ́ From Darkness to Light in Polynesia.
Olee ndị bụ ndị ọbịa a? Hà bụ Ndịàmà Jehova nke oge a? Ee e. Ha bụ ndị nkụzi na ndị na-ezisa ozi ọma, si Tahiti, bụ́ ndị bịara n’àgwàetiti bụ́ Mangaia (nke dị n’ebe ndịda Cook
Islands) na June 15, 1824. Gịnị mere ha ji jiri aha ahụ, bụ́ Jehova, mee ihe? Ọ̀ bụ nanị mgbe ahụ ka ha jiri ya mee ihe? Azịza nke ajụjụ ndị a na-akọwa ihe mere aha Jehova ka ji bụrụ ihe dị nnọọ mkpa n’ọtụtụ ọdịbendị nke àgwàetiti ndị dị na Pacific.E Jiri Aha Chineke Mee Ihe nke Ukwuu
Ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ, bụ́ ndị si England na America bịa na Pacific na narị afọ nke 19 jiri aha ahụ, bụ́ Jehova, mee ihe kwa ụbọchị mgbe ha na-ekwu okwu nakwa n’ihe odide ha. N’eziokwu, otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru ọbụna n’ụzọ na-ezighị ezi na ndị ozi ala ọzọ a, bụ́ ndị biri n’oge gboo, “bụ ụmụazụ Jehova kama ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst.”
Ndị ozi ala ọzọ ndị a na-amalitekarị akwụkwọ ozi ha site n’ide nkebi ahịrịokwu dị ka nke a: “Ka Chineke, ọbụna Onyenwe anyị bụ́ Jehova nakwa Jizọs Kraịst, bụ́ eze nke udo, zọpụta gị.” N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na Albert J. Schütz, bụ́ ọkà mmụta asụsụ, bụ́ onye a ma nnọọ ama, na-ekwu na akwụkwọ ọgụgụ bụ́ isi e bipụtara n’afọ 1825 na Fiji nwere nanị otu okwu e si na Bekee weta. Ọ bụ aha ahụ bụ́ Jehova.
Ojiji a ndị ozi ala ọzọ mbụ jiri aha Jehova mee ihe nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ndị bi n’àgwàetiti ndị dị na Pacific. N’aka nke ha, e zipụrụ ụfọdụ n’ime ndị ozi ala ọzọ ndị a e ziri ihe, ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ndị nkụzi, iji buru ozi ha gaa n’àgwàetiti ndị ọzọ. N’ikwu banyere ọbịbịa ahụ e kwuru banyere ya n’elu, nke ndị ozi ala ọzọ abụọ ahụ bụ́ ndị Tahiti bịara n’àgwàetiti Mangaia, akwụkwọ bụ́ The Covenant Makers—Islander Missionaries in the Pacific na-ekwu, sị: “Nye ndị nkụzi ahụ, bụ́ ndị Tahiti, Jehova bụ onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ. O kere ụwa nile, mmadụ sokwa n’ihe ndị Chineke kere. . . . [Ha] zọọrọ na Jehova bụ onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ nakwa na Ọkpara Ya bụ́ Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ.”
Ka ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ mbụ ahụ ji ozi Bible na-aga n’àgwàetiti dị iche iche, ha zutere ihe ize ndụ ndị ọnụ na-apụghị ịkọ, ebe ọ bụ na ndị bi na ha na-eme ihe ike mgbe ụfọdụ. N’ịkọwa ihe isi ike dị na ya, akwụkwọ bụ́ Mission, Church, and Sect in Oceania na-ekwu, sị: “Okwukwe siri ike e nwere n’ebe Jehova nọ na-emekarị ka a kwụsị ịtụ ụjọ na inwe obi nkoropụ.”
E gosiri ihe atụ dị ịrịba ama nke inwe okwukwe n’ụzọ dị otú ahụ n’ebe Jehova nọ n’afọ 1823, bụ́ mgbe e ji ozi Bible gaa n’àgwàetiti Rarotonga, nke dị na Cook Islands. John Williams, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke ji ụgbọ mmiri mee njem, rutere n’ebe ahụ ma ziga di na nwunye abụọ n’ime obodo iji zie ndị Rarotonga ihe. Otú ọ dị, mgbe ha na eze nke mmanya na-egbu nwesịrị nghọtahie, e tiri ha eti eti. E zuuru ihe ha nile, ha chịkwa ndụ ha n’aka pụta.
Mgbe ha laghachiri n’ụgbọ mmiri ha, ndị ozi ala ọzọ ahụ kọwara ndị Rarotonga dị ka ndị kasị nwee obi ọjọọ ha hụtụworo. N’ịtụ ụjọ na ihe ka njọ ga-esi na ya pụta, Williams kpebiri ịhapụ àgwàetiti ahụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ. N’ihi ya, otu nwa okorobịa nke na-akụzi nkụzi, nke aha ya bụ Papeiha, wepụtara onwe ya ịgbalị izisa ozi ọma n’àgwàetiti ahụ nanị ya. “Ọ sọ ndị obi ọjọọ ahụ ha gbuo m, ọ sọkwanụ ha ha hapụ m,” ka o kwuru, “aga m agakwuru ha.”
N’okwu e hotaworo ọtụtụ mgbe n’ihe ndekọ banyere ọrụ ndị ozi ala ọzọ mbụ rụrụ, Papeiha kwuru, sị: “Ko Jehova toku tiaki! Tei roto au i tona rima! (Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ! Anọ m n’aka Ya!)” Mgbe ahụ, o yi obere uwe ma jiri akwụkwọ nwere akụkụ Bible ndị e dere n’asụsụ Tahitian wee maba n’ime mmiri ma gwupụta n’ala. Ọ bụghị nanị na ọ lanarịrị, ọ rụzukwara ihe o ji maka ya gaa. Mgbe o rutere n’àgwàetiti ahụ, ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị nabatara ihe ndị ọ nọ na-ezi.
Otu onye Rarotonga nke mesịrị ghọọ onye ozi ala ọzọ n’onwe ya bụ More Ta’unga. N’afọ 1842, ọ ghọrọ onye
ozi ala ọzọ mbụ nke mepere ebe obibi ndị ozi ala ọzọ n’àgwàetiti New Caledonia. N’akwụkwọ ndetu ihe ya, o dere banyere otu nwoke obodo ahụ nke ọ na-eleta mgbe nile, bụ́ onye ọ kụziiri ka e si ede na ka e si agụ, sị: “O jiri nke nta nke nta mụta ihe ndị a. Oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gwara m, sị, ‘Achọrọ m ikpe ekpere.’ Ma agwara m ya ka ọ ghara ịchụ ya n’ike. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ jụrụ m ọzọ sị, ‘Ị́ gaghị ekwe ka m kpee ekpere?’ Mgbe ahụ ọ jụrụ m ihe mere na m ekweghị ka ya kpee ekpere, n’ihi ya, asịrị m ya, ‘Ị ghaghị ibu ụzọ tufusịa arụsị gị, mgbe ahụ i nweziri ike ikpegara Jehova ekpere. Ọ bụ nanị ya ga-anụ ekpere gị.’ N’ihi ya, o buteere m nkata arụsị ya, wee kwuo, sị, ‘Kpọọ ha ọkụ. Ugbu a, Jehova ga-abụ Chineke m.’ Ọ bịara mụta otú e si ekpe ekpere.”Ndị Bi n’Àgwàetiti Ndị Dị na Pacific Anabata Jehova
Ebe ọ bụ na ndị ozi ala ọzọ ahụ na-eji aha Chineke eme ihe mgbe nile, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị ha kwusaara ozi ọma nabatara Jehova dị ka Chineke ha. Akwụkwọ bụ́ Missionary Adventures in the South Pacific na-akọwa nnukwute nzukọ e nwere n’otu àgwàetiti dị na Pacific mgbe ụgbọ mmiri bu ndị ozi ala ọzọ, bụ́ Morning Star, rutere n’ebe ahụ. Akwụkwọ ahụ kwuru na ndị bi n’àgwàetiti ahụ “mere ntụli aka, ihe ka ọtụtụ n’ime ha weliri aka abụọ elu ruo ogologo oge iji gosi na ha kwetasiri ike na ha ga-ahapụ ikpere arụsị ma fee Jehova. Ọzọkwa, ha ga-egbo mkpa nile nke ndị nkụzi ahụ. E wepụtara otu ibé ala ma rara ya nye Jehova ka e wuo chọọchị na ebe obibi ụkọchukwu na ya.”
N’ịkọwa ntọghata a tọghatara Malietoa, bụ́ chiifu nke ọkwá ya dị elu na Samoa, akwụkwọ bụ́ Wiliamu—Mariner-Missionary—The Story of John Williams na-ekwu, sị: “Malietoa gwara ndị ya okwu ruo ogologo oge, na-ekwe nkwa n’ihu ọha na ya ga-abụ onye na-efe Jehova nakwa na ya ga-ewu chọọchị ebe a ga-anọ na-efe Ya ofufe. O nyere ndị fọdụrụ n’ụlọ iwu ka ha malite ịmụ banyere Jehova na Jizọs Kraịst.”
Ihe a nile e mere nwere mmetụta na-adịgide adịgide ná ndụ ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti ndị dị na Pacific. Taa, ọbụna ná mba ndị dị ka Fiji na Samoa, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ ka a na-eji aha Jehova eme ihe na redio ma ọ bụ ịhụ ya n’akwụkwọ akụkọ obodo ahụ.
Ma nke ahụ abụghị nanị mmetụta ọ na-enwe. N’akwụkwọ ya bụ́ Treasure Islands, bụ́ nke e bipụtara na nke mbụ ya n’afọ 1977, Pearl Binder kọwara uru aha Jehova baara ndị Banaba. Na mbụ, ndị ahụ biri na Kiribati, ma e mesịrị mee ka ha birighachi n’àgwàetiti bụ́ Rabi, nke dị na Fiji. Binder na-ede, sị: “Ndị ozi ala ọzọ ahụ bịara na Banaba enyewo ndị Banaba ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ka ha maara. . . . Nkwenye ha kwenyere n’ebe Jehova nọ ekerewo òkè dị nnọọ mkpa ná ndụ ha, o mewo ka ha dị n’otu karịa ka ihe ọ bụla ọzọ pụrụ ime, site n’oké mkpagbu nke na-akawanye njọ, bụ́ nke a kpagburu ha ruo afọ iri asaa, ma taa, ọ ka na-eme ka ha dịrị ndụ n’ime mmụọ. E wezụga Jehova ndị ọcha (bụ́ onye ndị ọcha n’onwe ha na-eleghara anya n’ụzọ dị ukwuu) ndị Banaba agaraghị enwe olileanya.”
Aha Chineke ná Nsụgharị Bible Dị Iche Iche
Otu n’ime nzube bụ́ isi nke ndị ozi ala ọzọ mbụ ahụ bụ ibipụta nsụgharị Bible ndị a pụrụ ịghọta aghọta n’asụsụ dị iche iche nke ndị bi n’àgwàetiti ndị ahụ dị na Pacific. N’ihi mgbalị siri ike ha tinyere, a bịara nwee Bible n’ọtụtụ n’ime asụsụ ndị a na-asụ n’ógbè Pacific nile. O yiri ihe ezi uche dị na ya n’anya ndị nsụgharị ndị a iji mkpụrụ akwụkwọ nke asụsụ ahụ ha na-asụgharị dee aha Jehova, dị nnọọ ka ha ji mkpụrụ akwụkwọ nke asụsụ ahụ ha na-asụgharị dee aha ndị ọzọ nile dị na Bible.
Ọ bụụrụ ndị mmụta Bible dị uchu ihe obi ụtọ na ndị nsụgharị Bible mbụ ndị a jiri aha Jehova mee ihe ọ bụghị nanị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ha sụgharịrị kamakwa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bụ́ nke a na-akpọ Agba Ọhụrụ. Nnyocha e mere n’ihe banyere asụsụ asaa ndị a na-asụ n’àgwàetiti Pacific na-egosi na e ji aha Jehova mee ihe n’amaokwu 72 dị iche iche n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ha abụghị nanị nsụgharị ndị e bipụtara na narị afọ nke 19. E nwekwara nsụgharị ọgbara ọhụrụ nke asụsụ Rotuman, bụ́ nke e wepụtara n’afọ 1999. Bible a jiri aha Jehova mee ihe n’amaokwu 48 dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
Ná ngwụsị narị afọ nke 19, William Wyatt Gill, bụ́ onye jeworo ozi dị ka onye ozi ala ọzọ
ruo ogologo oge na Pacific, dere banyere otu n’ime nsụgharị mbụ ndị ahụ, sị: “N’ịbụ onye jiworo Bible Rarotongan mee ihe ruo iri afọ anọ na abụọ, ọ bụghị itu ọnụ ma m kwuo na elere m ya anya dị ka nsụgharị dị mma nke Bible mbụ. . . . Dị ka ọ dị ná nsụgharị ndị ọzọ nile nke Pacific na New Guinea, e ji mkpụrụ akwụkwọ nke asụsụ Rarotongan dee aha nsọ ahụ bụ́ ‘Jehova,’ a sụgharịghị ya asụgharị, si otú a mee nnọọ ka ọdịiche nke dị n’etiti Chineke nke na-adị ndụ mgbe nile na ihe dị iche iche ndị ọgọ mmụọ na-efe ofufe, pụta ìhè.”Ihe Mere Ha Ji Jiri Aha Chineke Mee Ihe
N’ihi gịnị ka ndị ozi ala ọzọ ndị a, ndị nsụgharị Bible, na ndị nkụzi ji jiri aha aka Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe n’ụzọ dị ukwuu? Karịsịa, ọ bụ n’ihi na ha hụrụ mkpa ọ dị igosi ọdịiche dị n’etiti Jehova, onye nanị ya bụ́ ezi Chineke ahụ, na imerime chi ụgha ndị bi n’àgwàetiti ndị dị na Pacific na-efe ofufe. (Jọn 17:3; 1 Ndị Kọrint 8:5, 6) Nke ọ bụla n’ime chi ndị a nwere aha, dị ka ọ na-adịkarịkwa, ndị na-efe ha na-ajụ, sị, “Ònye bụ Chi unu? Gịnị bụ aha ya?” Iji aha ndị obodo ahụ na-akpọ “chi” mee ihe gaara agbagwoju ndị na-ajụ ajụjụ anya ma ọ bụ ikekwe ọ gaara eme ka ha chee nnọọ na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile bụ otu n’ime ọtụtụ chi ha na-efe. N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na ndị ozi ala ọzọ ndị mbụ a jiri aha Jehova mee ihe n’ụzọ dị ukwuu.
Nke a ọ̀ pụtara na ndị nile na-eji aha Jehova eme ihe ghọtara onye ọ bụ n’ezie? Ee e. Ka ha na-ebibi arụsị ha, Hiram Bingham, onye nsụgharị bụ́ onye ozi ala ọzọ, bụ́kwa nwa onye ozi ala ọzọ a ma ama na Hawaii, nke ya na ya na-aza otu aha ahụ, hụrụ ka ndị bi n’Abaiang (nke dị na Kiribati), na-eti, sị, “e nwere nanị otu ezi Chineke—Jehova.” Ma akwụkwọ ahụ bụ́ Missionary Adventures in the South Pacific na-ekwu banyere ihe a merenụ, sị:
“Otú ọ dị, Bingham maara na mbibi e bibiri arụsị ndị ahụ apụtaghị na ndị ahụ na-anabata Iso Ụzọ Kraịst n’ezie—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ha amalitebeghị. Ha aghọtachabeghị ihe oziọma ahụ pụtara n’ezie, ma ha amalitewo ịghọta ya.” N’ụzọ doro anya, a chọrọ ihe karịrị nanị ịmata aha ahụ bụ́ Jehova. Ọ dị ezi Ndị Kraịst mkpa ịmata Jehova dị ka onye ma na-erubere ya isi n’ihe nile.—Ndị Rom 10:13-17.
Ọ dị ọbụna Mozis kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ nwoke nke maara aha Jehova ma jiri ya mee ihe mkpa ịmatakwu ya. O kpere ekpere, sị: “Ugbu a, biko, ọ bụrụ na ahụtawo m amara n’ihu Gị, biko, mee m ka m mara ụzọ Gị nile, m ga-amarakwa Gị, ka m wee hụta amara n’ihu Gị.” (Ọpụpụ 33:13) Ee, Mozis chọrọ ịmata karịa aha Jehova nanị. Ọ chọrọ ịmata àgwà dị iche iche nke Jehova na ụzọ isi na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. N’ihi arịrịọ a, e nyere Mozis ihe ùgwù magburu onwe ya, nke bụ́ ịhụ ngosipụta nke metụtara ihe aha Jehova pụtara.—Ọpụpụ 33:19; 34:5-7.
N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova n’ógbè Pacific dum na-eji Bible ndị ndị ozi ala ọzọ mbụ ahụ sụgharịrị n’onwe ha na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịbịa ghọta ọ bụghị nanị ihe aha Jehova pụtara kamakwa ihe ndị Ọ chọrọ n’aka ndị ga-efe ya “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:23, 24) Ee, a na-eto aha Jehova “n’ala nile nke dị oké osimiri gburugburu.” N’ihi ya, ọtụtụ puku mmadụ na-enwe olileanya n’ebe aha ya dị ebube dị.—Aịsaịa 24:15; 42:12; 51:5; Ilu 18:10.
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị bi n’àgwàetiti ndị dị na Pacific, bụ́ ndị mụtara aha Chineke site n’ọnụ ndị ozi ala ọzọ mbụ nke Krisendọm, mere ka ndị ọzọ mara ya
[Ebe E Si Nweta Foto]
Nkwụ na foto dị n’aka ekpe: Site n’akwụkwọ bụ́ Gems From the Coral Islands
[Foto dị na peeji nke 17]
John Williams
[Ebe E Si Nweta Foto]
Culver Pictures
[Foto dị na peeji nke 17]
Papeiha
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto e nwetara site n’ikike nke Institute of Pacific Studies nyere, nke sitere n’akwụkwọ bụ́ Mission Life in the Islands of the Pacific, nke Aaron Buzacott dere
[Foto dị na peeji nke 19]
Ndịàmà Jehova na-eme ka a mara aha Chineke n’ụwa nile