Ịkpọasị Agbụrụ Ọ̀ Ziri Ezi?
Echiche nke Bible
Ịkpọasị Agbụrụ Ọ̀ Ziri Ezi?
OLEE otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na a na-ele gị anya dị ka onye aghụghọ, onye na-eme ihe ike, onye nzuzu, ma ọ bụ onye na-eme omume rụrụ arụ nanị n’ihi na i si n’otu agbụrụ? * N’ezie, ọ ga-ewe gị iwe. N’ụzọ dị mwute, ọ bụ otú ahụ ka e si ele ọtụtụ nde mmadụ anya. Ọzọkwa, n’akụkọ ihe mere eme nile, e metọwo ma ọbụna gbuo ọtụtụ ndị ọ na-adịghị ihe ha mere nanị n’ihi agbụrụ ma ọ bụ mba ha si na ya. N’ezie, ọ bụ ịkpọasị agbụrụ na-akpata ihe ka ọtụtụ n’agha ndị a na-awụfu ọbara na ha. Ma, ọtụtụ ndị na-akwado ime ihe ike dị otú ahụ na-ekwupụta n’ezie na ha kwere na Chineke na Bible. E nwekwara ndị na-asị na ịkpa ókè agbụrụ ga-adịgide—na ọ bụ otu n’ime ihe ndị ụmụ mmadụ bu pụta ụwa.
Bible ọ̀ na-anabata ịkpọasị agbụrụ dị otú ahụ? È nwere ọnọdụ ndị ga-eme ka ịkpọ ndị ọdịbendị ma ọ bụ agbụrụ ha dị iche na nke anyị asị zie ezie? Ọ̀ dị olileanya ọ bụla dịnụ na a gaghị enwe ịkpọasị agbụrụ n’ọdịnihu? Gịnị bụ echiche nke Bible?
Ndị A Mara Ikpe n’Ihi Omume Ha
Ntụle na-emighị emi nke ụzọ Chineke si mesoo ihe a kpọrọ mmadụ n’oge mbụ pụrụ ime ka mmadụ ruo ná nkwubi okwu na-ezighị ezi—na Chineke kwadoro ịkpọasị agbụrụ n’ezie. Ọ̀ bụ na ihe ndekọ Bible adịghị egosi Chineke dị ka onye gbuchapụrụ agbụrụ na mba dị iche iche? Ha na-egosi, ma ọ bụrụ na e lerukwuo ha anya, ha na-egosi na Chineke mara ndị a ikpe n’ihi nleghara ha leghaara iwu ya anya n’ụzọ dị njọ, ọ bụghịkwa n’ihi agbụrụ ha si na ya.
Dị ka ihe atụ, Jehova Chineke mara ndị Kenan ikpe n’ihi ememe ha ndị gụnyere mmekọahụ rụrụ arụ na ife ndị mmụọ Deuterọnọmi 7:5; 18:9-12) Otú ọ dị, n’ọnọdụ ụfọdụ, ndị Kenan ụfọdụ gosipụtara okwukwe n’ebe Chineke nọ ma chegharịa. N’ihi ya, Jehova hapụrụ ha ndụ ma gọzie ha. (Joshua 9:3, 25-27; Ndị Hibru 11:31) Otu nwanyị onye Kenan, bụ́ Rehab, ghọrọ ọbụna nne ochie nke Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Jizọs Kraịst.—Matiu 1:5.
ọjọọ. Ọbụna ha na-akpọ ụmụaka ọkụ iji chụọrọ chi ụgha àjà! (Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel gosiri na ọ dịghị ele mmadụ anya n’ihu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ na-egosipụta ezi nchegbu maka ọdịmma nke mmadụ nile. Na Levitikọs 19:33, 34, anyị na-ahụ iwu na-esonụ Chineke nyere ụmụ Izrel, bụ́ nke na-egosipụta ọmịiko: “Mgbe ọbịa ga-anọnyere gị dị ka ọbịa n’ala unu, unu emela ya ihe ike. Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ́ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt: Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu.” Iwu ndị yiri ya dị n’akwụkwọ Ọpụpụ na Deuterọnọmi. O doro anya na Jehova ekwughị na ịkpọasị agbụrụ ziri ezi. O kwuru na a ghaghị inwe ịdị n’otu nke agbụrụ.
Jizọs Kwadoro Agbụrụ Ịnagiderịta Ibe Ha
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ndị Juu na ndị Sameria na-elelị ibe ha anya. N’otu oge, ndị nọ n’obodo nta dị na Sameria anabataghị Jizọs nanị n’ihi na ọ bụ onye Juu nke na-aga Jeruselem. Olee otú ị gaara esi emeghachi omume n’ọjụjụ dị otú ahụ? Ọ pụrụ ịbụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs gosipụtara ajọ mbunobi jupụtara ebe nile n’oge ahụ mgbe ha jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ chọrọ ka anyị gwa ọkụ ka o si n’eluigwe daa wee laa ha n’iyi?” (Luk 9:51-56) Jizọs ò kwere ka ajọ mbunobi nke ndị na-eso ụzọ ya metụta ya? N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ baara ha mba ma chọọ ebe ha ga-ehi n’obodo nta ọzọ ka udo wee dị. Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs tụrụ ilu banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi. Nke a na-egosipụta n’ụzọ siri ike na agbụrụ mmadụ adịghị eme ka ọ bụrụ onye iro. N’eziokwu, ọ pụrụ imesị bụrụ ezigbote onye agbata obi!
Ndị Si n’Agbụrụ Dị Iche Iche Nọ n’Ọgbakọ Ndị Kraịst
N’oge ọ na-eje ozi n’elu ala, Jizọs lekwasịrị anya karịsịa n’ime ndị na-eso ụzọ n’etiti ndị obodo ya. Ma o gosiri na ndị ọzọ ga-emesịa ghọọ ụmụazụ ya. (Matiu 28:19) À ga-anabata ndị si n’agbụrụ nile? Ee! Pita onyeozi kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Pọl onyeozi mesịrị kwado echiche a site n’ikwu n’ụzọ doro anya na agbụrụ mmadụ si na ya adịghị mkpa n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Ndị Kọlọsi 3:11.
Ihe ọzọ na-egosi na Chineke na-anabata ndị si n’agbụrụ nile dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe. N’ọhụụ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, Jọn onyeozi hụrụ “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta,” bụ́ ndị Chineke zọpụtara. (Mkpughe 7:9, 10) “Oké ìgwè mmadụ” a ga-abụ ntọala nke ọha mmadụ ọhụrụ bụ́ ebe ndị sitere n’ebe nile ga-ebikọ n’udo, bụrụ ndị ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ mere ka ha dịrị n’otu.
Ka ọ dịgodị, Ndị Kraịst ga-eme nke ọma iguzogide mkpali nke ịma ndị ọzọ ikpe n’ihi agbụrụ ha si na ya. Ile ndị mmadụ anya n’otu n’otu, n’ụzọ Chineke si ele ha, ọ bụghịkwa nanị dị ka ndị si n’otu agbụrụ bụ ihe ziri ezi ma na-egosi ịhụnanya. Nke ahụ ọ́ bụghị otú ị chọrọ ka e si na-ele gị anya? Jizọs na-adụ anyị ọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ibi ndụ n’enweghị ịkpọasị agbụrụ dị mma. Ọ na-eme ka e nwee udo nke uche ka ukwuu ma mee ka e soro ndị ọzọ dịrị n’udo. Nke ka mkpa, ọ na-eme ka anyị na Onye Okike anyị na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, bụ́ Jehova Chineke, dịrị n’otu. Lee ezi ihe ọ bụ mere anyị ga-eji jụ ịkpọasị agbụrụ!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 “Agbụrụ,” dị ka e si jiri ya mee ihe n’isiokwu a, pụtara ndị sitere n’otu ebo, mba, ma ọ bụ ndị nwere ọdịbendị yiri ibe ha.