Otú E Si Mejụọ Akpịrị Na-akpọ M Nkụ n’Ụzọ Ime Mmụọ
Otú E Si Mejụọ Akpịrị Na-akpọ M Nkụ n’Ụzọ Ime Mmụọ
DỊ KA LUCIA MOUSSANETT SI KỌỌ
ÓGBÈ Valle d’Aosta dị n’agbata ugwu ndị dị n’akụkụ ebe ugwu ọdịda anyanwụ Ịtali, n’ebe dị nso n’Ugwu Alps nke Switzerland nakwa n’Ugwu Mont Blank a ma ama bụ́ nke dị na France. N’ebe ahụ ka a mụrụ m n’afọ 1941, n’ógbè nta bụ́ Challant St. Anselme.
Abụ m nwa mbụ n’ime ụmụ ise; ụmụnne m anọ bụ ndị nwoke. Nne m bụ onye na-arụsi ọrụ ike na onye ji okpukpe Katọlik kpọrọ ihe. Nna m sikwa n’ezinụlọ ji okpukpe kpọrọ ihe. Ụmụnne ya abụọ ndị nwanyị bụ ndị nọn. Ndị mụrụ m chụrụ ọtụtụ ihe onwunwe n’àjà n’ihi m, gụnyere ime ka o kwe m omume ịga akwụkwọ. Ụlọ akwụkwọ adịghị n’ógbè nta anyị, ya mere, n’oge m dị afọ 11, ndị mụrụ m zigara m n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi nke ndị nọn na-elekọta.
N’ebe ahụ ka m mụrụ asụsụ Latin na French, nakwa ihe ọmụmụ ndị ọzọ. E mesịa, mgbe m gbara afọ 15, amalitere m ichesi echiche ike banyere otú m pụrụ i si fee Chineke ofufe. Echere m echiche na ịbanye n’ebe obibi ndị nọn ga-abụ ụzọ kasị mma m pụrụ isi mee ya. Otú ọ dị, echiche a amasịghị ndị mụrụ m, ebe ọ bụ na ọ ga-eme ka ọ bụrụ nanị nne m ga na-elekọta ụmụnne m ndị nwoke. Ndị mụrụ m nweburu olileanya na agụmakwụkwọ m ga-eme ka m nweta ezigbo ọrụ ma nyere ezinụlọ anyị aka n’ụzọ akụ na ụba.
Ọ bụ ezie na mmeghachi omume nke ndị mụrụ m were m iwe, achọrọ m inwe ezi nzube ná ndụ ma chee na Chineke kwesịrị inwe ọnọdụ mbụ ná ndụ m. N’ihi ya, na 1961, abanyere m n’ebe obibi ndị nọn nke ndị Roman Katọlik.
Ndụ M Dị Ka Onye Nọn
N’ọnwa ndị mbụ, amụrụ m ụkpụrụ na iwu nke chọọchị ahụ ma rụọ ọrụ ọkpụkpụ aka gburugburu ebe obibi ndị nọn ahụ. N’August 1961, amalitere m ịmụ ọrụ nke ịghọ onye nọn ma malite iyi efe ndị nọn. Emekwara m ka ha mata na achọrọ m ịgbanwe aha m ka ọ bụrụ Ines, bụ́ aha nne m. Mgbe ha nabatara ya, a bịara mara m dị ka Sista Ines.
Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu ná ndị na-amụ ọrụ ịghọ ndị nọn na-arụ ọrụ na gburugburu ebe obibi ndị nọn ahụ, agụmakwụkwọ m nwere zuru ime ka m na-arụ ọrụ dị ka onye nkụzi ụlọ akwụkwọ praịmarị. Afọ abụọ mgbe e mesịrị, n’August 1963, e duru m n’iyi ọrụ, aghọkwara m onye nọn n’òtù Ndị Sista San Giuseppe na Aosta, Ịtali. Mgbe oge na-aga, ndị na-elekọta ebe obibi ndị nọn ahụ kwadoro ka m gụkwuo akwụkwọ site n’iziga m na Mahadum nke Maria Santissima Assunta dị na Rom.
Mgbe m gụchara akwụkwọ na Rom ma lọghachi na Aosta na 1967, amalitere m ịkụzi ihe n’otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Na 1976, e nyere m ọkwá onye nduzi nke ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ bụ ezie na m ka na-akụziri klas ụfọdụ ihe, e kenyere m ọrụ ná ngalaba nlekọta nke ụlọ akwụkwọ ahụ, aghọkwara m onye so n’òtù bọọdụ ụlọ akwụkwọ ndị dị n’ógbè Valle d’Aosta.
Ọchịchọ m n’ezie bụ inyere ndị ogbenye aka. Ana m enwekarị ọmịiko n’ebe ha nọ. Ya mere, ahaziri m òtù dị iche iche na-enyere ndị mmadụ aka, gụnyere otu nke na-enyere ndị na-arịa ọrịa na-egbu egbu aka bụ́ ndị na-enweghị ikwu na ibe. Eguzobekwara m usoro ihe omume iji na-akụziri ụmụntakịrị ndị mụrụ ha si mba ọzọ kwabata, ihe. Ọzọkwa, anọ m na-achọtara ndị ogbenye ọrụ na ụlọ ma na-enyere ndị nlekọta ahụ́ ike dị mkpa aka inweta ya. Agbalịrị m ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ okpukpe nke chọọchị ahụ.
N’oge ahụ, anabatara m nkà mmụta okpukpe ndị Katọlik, gụnyere nkụzi chọọchị ndị dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na echiche ndị Katọlik banyere ọdịnihu ebighị ebi nke mmadụ. N’oge ahụ, nkà mmụta Katọlik kwenyekwara ná ngwakọta okpukpe.
Ihe Ndị Malitere Inye M Nsogbu n’Obi
N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ụfọdụ a na-eme na Chọọchị Katọlik nọ na-enye m nsogbu n’obi. Dị ka ihe atụ, tupu baptizim na ịkwọ aka n’isi, ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị ịmụta ihe nzọụkwụ ndị a pụtara. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu abịatụdịghị klas, ndị ọzọ emeghị mgbalị ọ bụla ịmụ ihe. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị a jụrụ ime baptizim na ịkwọ ha aka n’isi n’otu parish na-aga nnọọ na parish ọzọ iji bụrụ ndị e mere baptizim ma ọ bụ ndị a kwọrọ aka n’isi n’ebe ahụ. Nye m, nke ahụ bụ́ ihe a na-eme iji mezuo iwu, bụrụkwa omume ihu abụọ.
Mgbe ụfọdụ, ana m ajụ onwe m na ndị nọn ibe m, sị, “Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikwusa Okwuchukwu kama imikpu onwe anyị n’ụdị ọrụ ndị ọzọ dị iche iche?” Azịza ndị m na-enweta bụ, “Anyị na-ekwusa oziọma site n’ịrụ ọrụ ebere.”
Ọzọkwa, o siiri m ike ikwere na aghaghị m ịgakwuru ụkọchukwu iji kwupụta mmehie m. Echekwara m echiche na m nwere ike ịgwa Chineke okwu banyere ihe onwe onye ndị dị otú ahụ. Ọzọkwa, o siiri m ike ịnabata echiche nke ibu ekpere n’isi na ịgụ ya agụ. O sikwaara m ike ikwere na popu apụghị ime mmehie. Ka oge na-aga, echere m na m ga-enwe nkwenkwe nke m n’ihe ndị dị otú ahụ ma gaa nnọọ n’ihu n’okpukpe m.
Ọchịchọ Maka Ihe Ọmụma Bible
Ana m akwanyere nnọọ Bible ùgwù n’ụzọ miri emi, enwekwara m ọchịchọ ịmara ya. Mgbe ọ bụla n’Aịsaịa 43:10-12, ebe Jehova Chineke kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m,” na-amasịkarị m. Otú ọ dị, n’oge ahụ, aghọtaghị m ihe okwu ndị ahụ pụtara n’ozuzu ha.
m nwere mkpebi ime ma ọ bụ nwee mkpa maka nkwado Chineke, ana m agụ Bible. Ọ bụ ezie na ọ dịtụghị mgbe anyị mụrụ ya n’ebe obibi ndị nọn ahụ, agụrụ m ya n’onwe m. Ihe ndekọ dịMgbe m na-aga mahadum na Rom n’etiti afọ ndị 1960, enwetara m ihe ọmụmụ were afọ anọ na nkà mmụta okpukpe bụ́ nke ndị Vatican hụrụ maka ya. Ma e tinyeghị Bible dị ka otu n’ime akwụkwọ ọgụgụ nke ihe ọmụmụ ahụ. Mgbe m lọghachisịrị na Aosta, agara m ọtụtụ nnọkọ njikọ okpukpe, ọbụna ndị nke njikọ okpukpe dị iche iche na òtù dị iche iche na-abụghị nke ndị Katọlik hụrụ maka ha. Nke ahụ mere ka m nwekwuo ọchịchọ ịmata ozizi Bible. E nwere nnọọ nnukwute ọgba aghara n’etiti ìgwè ndị na-azọrọ na ha na-akụzi banyere otu akwụkwọ ahụ!
Ịmụtakwu Ihe Banyere Bible
Na 1982, otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara ebe ahụ m na-arụ ọrụ ọha na eze ma gbalịa iso m nwee nkwurịta okwu banyere Bible. Ọ bụ ezie na m ji nnọọ ọrụ n’aka, echiche nke ịmụ banyere Bible masịrị m. N’ihi ya, ekwuru m, sị: “Biko bịa n’ụlọ akwụkwọ m, mgbe m nwekwara ohere, anyị pụrụ ikwurịta okwu.”
Ọ bụ ezie na nwanyị ahụ mechara leta m, enweghị m “ohere” ọ bụla n’usoro ihe omume m. E mesịa, nne m chọpụtara na ya nwere ọrịa cancer, n’ihi ya, emesịrị m were ezumike iji nyere ya aka. Mgbe ọ nwụsịrị n’April 1983, alọghachiri m n’ọrụ m, ma ka ọ na-erule n’oge ahụ, Ndịàmà ahụ amaghịzi ebe m nọ. Otú ọ dị, oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Onyeàmà ọzọ dị ihe dị ka afọ 25 letara m iji gwa m okwu banyere Bible. Anọwo m na-agụ akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe n’onwe m. Ya mere, ajụrụ m ya, sị: “Olee ndị bụ́ 144,000 ahụ a kpọtụrụ uche n’ebe a ná Mkpughe isi 14?”
A kụziworo m na ndị ọma nile ga-aga eluigwe, n’ihi ya, ahụghị m ezi uche dị n’ikewapụ 144,000 n’ime ha iche n’eluigwe. Anọ m na-eche, sị, ‘Olee ndị bụ́ 144,000 ndị a? Gịnị ka ha na-eme?’ Ajụjụ ndị a nọgidere na-enye m nsogbu n’uche. Onyeàmà ahụ nọgidere na-agbalị ịhụ m, ma anaghị m anọkarị n’ụlọ nke mere na ọ dịtụghị mgbe ọ hụrụ m.
N’ikpeazụ, Onyeàmà ahụ nyere Marco, bụ́ otu okenye nọ n’ọgbakọ ya adres m. N’ikpeazụ, na February 1985, ọ hụrụ m. Ebe ọ bụ na m ji ọrụ n’aka, anyị kwurịtara okwu ruo nanị minit ole na ole ma yie agba maka mgbe ọzọ. Mgbe e mesịrị, ya na nwunye ya, bụ́ Lina, bịara na-eleta m mgbe mgbe, na-enyere m aka ịghọta Bible. N’oge na-adịghị anya, m bịara ghọta na ozizi ndị bụ́ isi nke ndị Katọlik dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na ọkụ ala mmụọ adaberetụghị na Bible.
Mkpakọrịta nke Mụ na Ndịàmà
Mgbe m gara nzukọ Ndịàmà Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, o doro anya na ihe dị nnọọ iche n’ebe ahụ ma e jiri ya tụnyere Chọọchị Katọlik. Mmadụ nile, ọ bụghị nanị ndị òtù ukwe, bụrụ abụ. Ha kereziiri òkè ná nzukọ ahụ. Amalitekwara m ịhụ na ihe mejupụtara nzukọ ahụ bụ “ụmụnna nwoke” na “ụmụnna nwanyị.” Ha nile hụrụ ibe ha n’anya n’ezie. Ihe ndị a masịrị m.
N’oge ahụ, ana m eyi efe ndị nọn m aga nzukọ. O metụrụ nnọọ ụfọdụ ndị n’ahụ́ ịhụ onye nọn n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Enwetara m ọṅụ na afọ ojuju nke na-abịa site n’ịbụ onye ndị òtù nke nnukwute ezinụlọ gbara gburugburu n’ịhụnanya. Ọzọkwa, ka m na-amụ ihe, amalitere m ịhụ na ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ndị m na-agbaso ná ndụ ekwekọghị n’Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, Bible ekwughị ihe ọ bụla banyere ndị ohu Chineke iji ejiji pụrụ iche. Inwe ndị isi Chọọchị na ime oké ngosi dị nnọọ iche n’ihe Bible na-akụzi banyere ndị okenye dị umeala n’obi bụ́ ndị na-edu ndú n’ọgbakọ.
Ọ dị m ka a ga-asị na m guzo n’etiti mmiri na-achị ọkụ, ụkwụ esighịkwa m ike n’ala. O yiri ihe na-agaghị ekwe omume na anọwo m n’ìsì ruo afọ 24. N’agbanyeghị nke ahụ, amatara m nke ọma na nke a bụ eziokwu Bible. Atụrụ m ụjọ n’iche na n’afọ 44, aghaghị m ibidoghachi ndụ n’isi. Ma olee otú m ga-esi nọgide n’ìsì ugbu a m hụworo ihe Bible na-akụzi n’ezie?
Mkpebi Dị Mkpa
Amatara m na ịhapụ ebe obibi ndị nọn ahụ ga-apụta na agaghị m enwe ihe ọ bụla n’ụzọ akụ̀ na ụba. Otú ọ dị, echetara m okwu Devid bụ́ na ‘a dịghị ahapụ onye ezi omume, mkpụrụ ya adịghịkwa arịọ nri.’ (Abụ Ọma 37:25) Amaara m na agaghịzi m enwecha nchebe n’ụzọ anụ ahụ́, ma atụkwasịrị m Chineke obi ma chee, sị, ‘Gịnị ka m ga-atụdị egwu?’
Ndị ezinụlọ m chere na ara na-agba m. Ọ bụ ezie na okwu ahụ wutere m, echetara m okwu Jizọs bụ́: ‘Onye hụrụ nna ma ọ bụ nne ya n’anya karịa ka ọ hụrụ m ekwesịghị m.’ (Matiu 10:37) N’otu oge ahụ, otú Ndịàmà si meso m gbara m ume ma wusie m ike. Ka m yi uwe ndị nọn m na-agbada n’okporo ámá, ha na-abịakwute m ma kelee m. Nke a mere ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye nọkwu òtù ụmụnna nso na ịbụ akụkụ nke ezinụlọ ha.
N’ikpeazụ, ejekwuuru m onyeisi Ndị Mọda ma kọwaara ya ihe mere m ji kpebie ịhapụ ebe obibi ndị nọn ahụ. Ọ bụ ezie na m kwuru ka m gosi ya na Bible ihe mere m ji mee mkpebi a, ọ jụrụ ịṅa ntị, na-asị: “Ọ bụrụ na m chọọ ịghọta ihe ọ bụla n’ime Bible, m pụrụ ijekwuru onye ọkachamara na Bible!”
Mkpebi m wụrụ Chọọchị Katọlik akpata oyi. Ha boro m ebubo ịbụ onye na-eme omume rụrụ arụ na onye isi mebiri. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị maara m maara na ebubo ndị ahụ bụ ụgha. Ndị mụ na ha rụkọrọ ọrụ meghachiri omume n’ụzọ dịgasị iche iche. Ụfọdụ lere ihe m na-eme anya dị ka omume obi ike. O wutere ndị ọzọ, bụ́ ndị chere na m na-azọnye ụkwụ n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọbụna ụfọdụ ndị nọ na-emetere m ebere.
Na July 4, 1985, ahapụrụ m Chọọchị Katọlik. N’ịmara otú e siworo mesoo ndị ọzọ mere otú ahụ , Ndịàmà tụrụ ụjọ maka nchebe m ma zoo m ruo ihe dị ka otu ọnwa. Ha na-eji ụgbọala abịa akwọrọ m aga nzukọ ma kwọghachi m n’ebe obibi m. Ekweghị m ka ndị mmadụ hụ m ruo mgbe ihe dajụrụ. E mesịa, n’August 1, 1985, amalitere m iso Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ozi.
Mgbe m gara Mgbakọ Distrikti nke Ndịàmà Jehova ná ngwụsị ọnwa August ahụ, ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi matara na ahapụwo m chọọchị ahụ, ha wee gbasaa akụkọ ya. Mgbe e mesịrị mee m baptizim na December 14, 1985, ụlọ ọrụ telivishọn na ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ ndị dị n’ógbè ahụ chere na ọ jọgburu nnọọ onwe ya nke na ha gbasara akụkọ ahụ ọzọ, na-ejide n’aka na onye ọ bụla nụrụ ihe m mere.
Mgbe m hapụrụ ebe obibi nke ndị nọn ahụ, ọ dịtụghị ihe onwunwe ọ bụla m nwere. Enweghị m ọrụ, enweghị m ụlọ, a dịghịkwa akwụ m ụgwọ
ezumike nká. Ya mere, ruo ihe dị ka otu afọ, arụrụ m ọrụ ilekọta onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Na July 1986, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Agafere m n’otu ógbè ebe e nwere obere ọgbakọ e kewapụtara ọhụrụ. N’ebe ahụ, akụziiri m ndị mmadụ ihe ndị metụtara asụsụ na ihe ndị ọzọ, wee si otú ahụ na-eji agụmakwụkwọ m eme ihe bara uru. Nke a mere ka m nwee usoro ihe omume nke a pụrụ ịgbanwe agbanwe.Ije Ozi n’Ubi Ala Ọzọ
Ugbu a m mụtaworo eziokwu Bible, achọrọ m ịkọrọ ya ọtụtụ ndị ruo ókè ọ ga-ekwe m omume. Ebe ọ bụ na m na-asụ French, echere m banyere ije ozi ná mba Africa ụfọdụ ebe a na-asụ French. Ka e mesịrị, n’afọ 1992, Ndịàmà Jehova nwetara nkwado iwu ná mba Albania nke dị nso. Ná ngwụsị nke afọ ahụ, e kenyere obere ìgwè ndị ọsụ ụzọ si Ịtali ije ozi ebe ahụ. Mmadụ abụọ n’ime ha bụ Mario na Cristina Fazio, bụ́ ndị si n’ọgbakọ m nọ na ya. Ha gwara m ka m bịa leta ha, nakwa ịtụle ije ozi n’Albania. N’ihi ya, mgbe m chebasịịrị ya echiche nke ọma ma kpesịa ekpere banyere ya, n’oge m dị afọ 52, ahapụrụ m ọzọ ebe nwetụrụ nchebe ma tinye isi n’akụkụ ụwa dịwagara nnọọ iche.
Nke ahụ bụ na March n’afọ 1993. Mgbe m bịarutere, ọ bụ ezie na anọchaghị m ebe dị anya site ná mba nke m, aghọtara m ozugbo ahụ na anọ m ná mba ọzọ. Ndị mmadụ na-eji ụkwụ aga ebe ọ bụla ha na-aga, ha na-asụkwa Albanian, bụ́ asụsụ nke m na-adịtụghị aghọta. Mba ahụ nọ na-eme mgbanwe dị ukwuu, na-esi n’otu usoro ọchịchị gaa n’ụdị usoro ọchịchị ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mmadụ nọ na-enwe agụụ maka eziokwu Bible ma na-enwe mmasị ịgụ ihe na ịmụ ihe. Ndị anyị na-amụrụ Bible nwere ọganihu ime mmụọ dị ngwa, nke a mere m obi ụtọ, na-enye aka eme ka ebe ọhụrụ ahụ mara m ahụ́.
Na 1993, mgbe m bịaruru Tiranë, bụ́ isi obodo nke mba ahụ, e nwere nanị otu ọgbakọ n’Albania nakwa Ndịàmà ji obere ihe karịa 100 nọgasị ná mba ahụ. N’ọnwa ahụ, ná mgbakọ pụrụ iche mbụ e nwere na Tiranë, mmadụ 585 bịara, e mere mmadụ 42 baptizim. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe m ghọtara, ọ bụ ihe na-akpali akpali ịnụ ka Ndịàmà ahụ na-abụ abụ na ịhụ ka ha nọ na-aṅa nnọọ ntị. N’April, e mere Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs Kraịst, mmadụ 1,318 bịakwara! Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, e nwere mmụba n’ọrụ Ndị Kraịst n’Albania.
Ana m anọbu na veranda nke okpukpu nke anọ nke ụlọ elu ebe m bi na Tiranë wee na-eche, sị, ‘Oleedị mgbe anyị ga-agakwurucha ndị a nile?’ Jehova Chineke hụrụ maka nke ahụ. Ugbu a, e nwere ọgbakọ 23 nke Ndịàmà Jehova na Tiranë. Ná mba ahụ nile, e nwere ọgbakọ 68 na ìgwè 22, nke nwere Ndịàmà 2,846. Uto nile ahụ n’ime nanị afọ ole na ole! Mmadụ 12,795 bịakwara Ememe Ncheta anyị n’afọ 2002!
N’ime afọ iri a m biworo n’Albania, enwewo m ihe ùgwù dị ukwuu inyere ọ dịkarịa ala mmadụ 40 aka iru eru maka baptizim. Ọtụtụ n’ime ha na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ndị ọsụ ụzọ nakwa n’ụdị ọzọ nke ozi oge nile. N’ime afọ ndị gafeworonụ, e zitere ìgwè ndị ọsụ ụzọ isii si Ịtali ịbịa nye aka n’ọrụ a na-arụ n’Albania. A haziri ihe ọmụmụ asụsụ were ọnwa atọ maka ìgwè nke ọ bụla, a kpọkwara m ịkụziri klas anọ ndị ikpeazụ ihe.
Mgbe mbụ ndị enyi m matara banyere mkpebi m ịhapụ chọọchị, ha meghachiri omume n’ụzọ dị nnọọ egwu. Otú ọ dị, mgbe afọ nile a gasịworo, àgwà ha akawo mma, ka ha na-ahụ na enwere m udo na ahụ́ iru ala. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndị ezinụlọ m, gụnyere nwanne nna m nke nwanyị dị afọ 93, onye ka bụ́ nọn, na-akwadokwa m nnọọ karị.
Kemgbe m bịara mara Jehova, o lekọtawo m gabiga nnọọ ọtụtụ ọnọdụ dịgasị iche iche! O duziri m gaa ná nzukọ ya. Ka m na-eleghachi anya azụ, ana m echeta ọchịchọ m nwere inyere ndị ogbenye, ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, na ndị nọ ná mkpa aka ma nwee ọchịchọ imikpu onwe m n’ijere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ ya mere m ji na-ekele Jehova, n’ihi na ọ hụwo na e mejụrụ akpịrị na-akpọ m nkụ n’ụzọ ime mmụọ.
[Foto dị na peeji nke 27]
Otu ezinụlọ bụ́ ndị Albania bụ́ ndị m mụụrụ Bible. E mewo mmadụ 11 n’ime ha baptizim
[Foto dị na peeji nke 27]
Ihe ka ukwuu n’ụmụ nwanyị a m mụụrụ Bible n’Albania nọ ugbu a n’ozi oge nile