Katidral—Ihe Ncheta nke Chineke Ka Ọ Bụ Mmadụ?
Katidral—Ihe Ncheta nke Chineke Ka Ọ Bụ Mmadụ?
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA FRANCE
NA Moscow, ihe yiri mbilite n’ọnwụ ewerewo ọnọdụ. E wughachiwo Katidral Christ the Savior, bụ́ nke Stalin bibiri na 1931, elu ụlọ ya e wuliri elu na-egbukepụ na mbara igwe Russia. N’obodo ukwu bụ́ Évry, nke dị nso na Paris, ndị ọrụ arụtọpụwo nanị otu katidral e wuru na France na narị afọ nke 20. E mere nke a nanị afọ ole na ole e dosịrị katidral nke Almudena dị na Madrid nsọ. N’ọnọdụ yiri nnọọ nke ahụ, New York City nwere katidral a na-akpọ St. John the Divine. N’ịbụ nke a nọworo na-ewu ruo ihe karịrị 100 afọ, ọ bụwo nke a na-akpọkarị St. John A Na-adịghị Arụcha Arụcha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ otu n’ime katidral ndị kasị ukwuu e nwere n’ụwa, ọ nọchiri mbara ala karịrị mita 11,000 n’akụkụ anọ ya.
Ná mba Krisendọm nile, akatamkpo katidral jupụtara n’ọtụtụ obodo ukwu. Nye ndị kwere ekwe, ha bụ ihe ncheta nke okwukwe n’ebe Chineke nọ. Ọbụna ndị na-ekweghị ekwe pụrụ iwere ha dị ka ọrụ nkà ma ọ bụ dị ka ihe nlereanya maka ịtụ ụkpụrụ ụlọ. Ka o sina dị, ịdị adị nke ụlọ ofufe ndị a buru ibu bụ́ ndị na-efukarịkwa nnukwu ego na-ewelite ajụjụ ndị kwesịrị nlebara anya: N’ihi gịnị ka e ji wuo ha, oleekwa otú e si wuo ha? Nzube dị aṅaa ka ha na-emezu?
Gịnị Bụ Katidral?
Mgbe Kraịst nwụsịrị, ndị na-eso ụzọ ya haziri onwe ha n’ọgbakọ dị iche iche, ọtụtụ n’ime ha nọ na-ezukọta n’ụlọ ndị mmadụ. (Faịlimọn 2) Ruo ọtụtụ iri afọ, ọ bụ “ndị okenye” ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nọ na-elekọta ọgbakọ ndị a. (Ọrụ 20:17, 28; Ndị Hibru 13:17) Otú ọ dị, mgbe ndị ozi nwụsịrị, e nwere ndapụ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst. (Ọrụ 20:29, 30) Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị okenye buliri onwe ha elu karịa ndị ọzọ ma ghọọ ndị a na-ele anya dị ka ndị bishọp na-elekọta ọtụtụ ọgbakọ—ihe Jisọs dọrọ aka ná ntị megide. (Matiu 23:9-12) Mgbe ahụ a malitekwara iji okwu ahụ bụ́ “chọọchị,” bụ́ nke a na-ejibu eme ihe n’ebe ndị Kraịst n’onwe ha nọ, eme ihe maka ebe ha na-anọ efe ofufe—ụlọ n’onwe ya. N’oge na-adịghị anya, ndị bishọp ụfọdụ nwara inwe chọọchị ndị kwekọrọ n’ọkwá ha. E chepụtara okwu ọhụrụ iji kọwaa chọọchị bishọp—katidral.
Okwu a sitere n’okwu Grik bụ́ kathedra, nke pụtara “oche.” Katidral si otú ahụ bụrụ ocheeze bishọp, ihe àmà nke ike o nwere n’ụwa. Site na katidral ya, bishọp na-elekọta otu ógbè, dayọsis.
“Oge Katidral Na-ewu Ewu”
Na 325 O.A., Kansụl nke Nicaea kwadoro ka a na-enwe ndị bishọp n’obodo ukwu dị iche iche. N’ịbụzi ndị Ọchịchị Rom kwadoro, ndị bishọp nọ na-enweta onyinye ala ndị buru ibu site n’aka ndị ọchịchị mgbe mgbe. Ha weghakwaara ọtụtụ ebe a na-anọ efe arụsị. Mgbe Alaeze Ukwu Rom dara, ụlọ chọọchị ndị ahụ dịgidere ma too bịa ghọọ ndị pụtara ìhè karị Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya. N’oge na-adịghị anya, oge ahụ ghọrọ ihe onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Georges Duby kpọrọ “Mgbe Katidral Na-ewu Ewu.”
Site na narị afọ nke 7 ruo narị afọ nke 14, ọnụ ọgụgụ ndị Europe rịrị elu okpukpu atọ. Mmụba
a e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ baara obodo ukwu dị iche iche uru n’ụzọ bụ́ isi, bụ́ ndị nwekwuru ọganihu. N’ihi ya, ebe ndị kasị mma maka mmụba nke akatamkpo katidral bụ obodo ukwu ndị kasị baa ọgaranya bụ́ ndị nwere bishọp. N’ihi gịnị? N’ihi na akatamkpo ihe owuwu ndị a gara nke ọma nanị n’ebe ego na-abata n’esepụghị aka!Ihe ọzọ kpaliri owuwu nke katidral bụ ife Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri bụ́ ihe na-ewu ewu nakwa ihe ncheta mgbe ochie nke okpukpe. Nke a ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu na narị afọ nke 11 na nke 12 dị ka ọ na-erutụbeghị. Ndị bishọp gbasawanyere ofufe a, si otú ahụ na-eme ka katidral ha bụrụkwuo ndị a ma ama. A malitere idekwasị utu aha bụ́ Notre-Dame (Nwaada Anyị) na katidral ndị dị na France n’oge ahụ. “Oleedị obodo nke na-araraghị otu chọọchị nakwa mgbe mgbe katidral ya nye ya?” ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma ndị Katọlik bụ́ Théo na-ajụ. N’ihi ya, a raara katidral Saint-Étienne dị na Paris nye Notre-Dame. Katidral Notre-Dame dị na Chartres, France, ghọrọ òkwù arụsị mbụ e nwere n’ebe ugwu Europe. “Ọ dịghị onye ọ bụla a ma ama—ọbụnadị Kraịst n’Onwe Ya—chịkwara ndụ na echiche nke ndị wuru katidral ahụ kpam kpam dị ka Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri,” ka akwụkwọ bụ́ The Horizon Book of Great Cathedrals na-ekwu.
“Anyị Ga-ewu Katidral Buru Nnọọ Ibu . . . ”
Otú ọ dị, gịnị mere ọtụtụ n’ime ụlọ ndị ahụ ji buo nnọọ ibu? Laarị azụ na narị afọ nke anọ, katidral ndị dị na Trier, Germany, na Geneva, Switzerland, nọchiri ala ndị sara nnukwu mbara, n’agbanyeghị ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta nke ndị na-efe ofufe na ha. Na narị afọ nke 11, ọnụ ọgụgụ ndị Speyer, Germany, ejupụtalighị katidral ya sara mbara. Ya mere, The Horizon Book of Great Cathedrals kwubiri na “ibu na ịma mma nke [katidral] kpughere ọtụtụ ihe ndị kpaliri ya bụ́ ndị na-emetụtaghị okpukpe.” Otu n’ime ha bụ “oké mpako nke bishọp ma ọ bụ onyeisi ndị mọnk nke ga-elekọta ihe owuwu ahụ.”
Na narị afọ nke 12 na nke 13, katidral na-adị 100 mita ná nkezi, na-achọ nnọọ ịdịkwa elu otú ha dịruru n’ogologo. Katidral Winchester, bụ́ nke dị n’England, nke dị mita 169 n’ogologo, na Katidral Milan, bụ́ nke dị n’Itali, nke dị mita 145, dịcha ịrịba ama. “Anyị ga-ewu katidral buru nnọọ ibu nke na ndị hụrụ mgbe e wusịrị ya ga-eche na isi adịghị anyị mma,” ka otu onyeisi chọọchị Spain dị na Seville kwuru na 1402. N’ezie, a sịrị na katidral Seville bụ nke abụọ kasị ibu n’ụwa, na-enwe elu ụlọ dị mita 53 n’ịdị elu. Elu ụlọ pịrị ọnụ nke ụlọ mgbịrịgba katidral Strasbourg dị na France dị mita 142, ọ ha ka ụlọ elu dị okpukpu 40. Na narị afọ nke 19, e wulikwuru elu ụlọ nke ụlọ mgbịrịgba katidral Gothic Münster dị na Ulm, Germany, ruo mita 161, na-eme ka ọ bụrụ ụlọ elu okwute kasị elu n’ụwa. “Ọ dịghị ihe ọ bụla a chọrọ n’okpukpe nke ga-eme ka mmefu ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu otú ahụ zie ezi,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Pierre du Colombier na-ekwusi ike.
Na narị afọ nke 12 na nke 13, ndị na-akwalite owuwu nke katidral jikwa ‘ihe nkwali ọzọ na-emetụtaghị okpukpe’ mee ihe maka abamuru ha—ịhụnanya ndị bi n’obodo ukwu hụrụ mba ha. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Obodo dị iche iche nọ na-asọrịta mpi ndị ga-ewu katidral nke ga-akasị elu.” Ndị isi obodo, ndị a na-akwanyere ùgwù n’obodo, na òtù ndị ahịa dị iche iche ji katidral merezie ihe e ji amata obodo ha.
O Furu Oké Ego n’Oge Gara Aga, Ọ Na-efu Oké Ego n’Oge A
Otu onye edemede kọwara owuwu katidral dị ka “ọkụ na-eri ego.” Oleezi otú e si kwadoo ihe owuwu ndị a—nke na-efu ego na-adịwanye ukwuu n’ilekọta ọbụna ugbu a—n’ụzọ ego n’oge gara aga? N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị ụkọchukwu, dị ka Maurice de Sully nọ na Paris, kwụrụ ụgwọ maka ha site n’ego akpa ha. Mgbe ụfọdụ ndị ọchịchị, dị ka Eze James nke Mbụ nke Aragon, kwụrụ ihe ndị e mefuru. Otú ọ dị, n’ozuzu, ọ bụ ego dayọsis ahụ nwetara ka e ji kwadoo katidral ndị ahụ. Ego ndị a gụnyere ụtụ isi ndị nwe ala na ego ndị e
nwetara site n’ihe onwunwe. N’eziokwu, Bishọp nke Bologna dị n’Itali nwere ala na ụlọ 2,000! A gụnyekwara ego okpukpe ndị a na-enweta site n’ịna ụtụ, ụgwọ ndị a kwụrụ iji nweta mgbaghara mmehie, na nhà ndị e riri maka mmehie. Na Rouen, France, ndị zụtara ikike nke iri ihe ndị e ji mmiri ara ehi mepụta n’oge Lent na-akwụ ụgwọ maka ihe a sị na ọ bụ Ụlọ Elu Butter nke katidral ahụ.Ndị ụfọdụ bụ́ ndị na-enye onyinye na-emesapụ nnọọ aka n’ụzọ pụrụ iche, a na-akwanyekwara ha ùgwù site n’ime ka e see onyinyo ha n’ugegbe windo ndị tụrụ àgwà dị na chọọchị nakwa iji onyinyo ha tụọ ihe ọtụtụ. O doro nnọọ anya na ha echefuwo ụkpụrụ ndị Kraịst nke inye ihe n’emeghị ka ndị ọzọ mara. (Matiu 6:2) Ọ dị mkpa ka ego nọgide na-abata, ebe ọ bụ na a na-emefukarị ego gabiga ihe e mere atụmatụ ya. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ọchịchọ siri ike inweta ego na-edugakarị n’iri ego na nnapụ. Dị ka ihe atụ, ebubo na mmadụ jụrụ okwukwe na-edugakarị ná njichi nke ihe onwunwe ya. Nke a mere ka o kwe omume ịkwakọrọ ihe onwunwe nke ndị a sị na ha bụ ndị jụrụ okwukwe, dị ka ndị Cathar, nke a mekwara ka a hụ ego e ji kwadoo ọtụtụ ihe owuwu nke chọọchị. *
N’ezie, chọọchị aghaghị ịnọgide na-arụgide ndị mmadụ iji mee ka ego nọgide na-abata. Ọ bụghị—dị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ụfọdụ zọrọwooro—na ọha mmadụ ahụ nwere mkpali n’onwe ha iwu nnukwu ihe owuwu ndị dị otú ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Henry Kraus na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị na ndị mmadụ nọ Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya ji nnọọ okpukpe kpọrọ ihe, iwu chọọchị abụghị ihe ka mkpa nye ndị mmadụ.” N’ihi ya, ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme katọrọ chọọchị maka oké mmefu ego ya. Akwụkwọ bụ́ The Horizon Book of Great Cathedrals na-ekweta, sị: “A pụrụ ijiwo ego chọọchị ji wuo ihe owuwu mee ihe n’inye ndị agụụ na-agụgbu nri . . . ma ọ bụ n’ilekọta ụlọ ọgwụ na ụlọ akwụkwọ dị iche iche. N’ihi ya, a pụrụ ikwu na katidral ndị ahụ tara isi ọtụtụ narị puku mmadụ.”
Otú E Si Wuo Ha
Katidral dị iche iche bụ ihe na-egosi inwe nkà nke ụmụ mmadụ. Ọ dị ịtụnanya n’ezie na e ji nkà na ụzụ oge gboo wuo akatamkpo ihe owuwu ndị dị otú ahụ. Nke mbụ, e sere ụkpụrụ ihe owuwu ahụ n’ụzọ zuru ezu. N’ebe a na-agbari okwute, a na-eji ihe nduzi eme ihe iji jide n’aka na ihe ndị e ji chọọ blọk okwute ndị ahụ mma dị n’otu ụdị nakwa na ha haruru otú kwesịrị ekwesị. E ji nlezianya kanyechaa blọk ndị ahụ akara iji gosi kpọmkwem ebe ha ga-adị n’ihe owuwu ahụ. Usoro ime njem n’oge ahụ na-egbu oge ma dị oké ọnụ, ma n’agbanyeghị nke a, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme onye France bụ́ Jean Gimpel si kwuo, ‘n’agbata afọ 1050 na 1350, France gbariri okwute karịa Ijipt oge ochie.’
N’ebe a na-ewu ihe owuwu ahụ n’onwe ya, ndị ọrụ na-arụ ihe ndị dị egwu, na-eji ngwá mgbe ochie e ji ebuli ihe elu bụ́ ndị e nwere n’oge ahụ—ihe mkpọre na injin na-adọli ihe elu, bụ́ ndị ndị ikom na-eme ka ọ na-arụ ọrụ site n’ịzọ ụkwụ na steepụ e ji osisi rụọ. N’oge ahụ, a maghị usoro mgbakọ na mwepụ ndị injinia ji eme ihe taa. Ndị na-ewu ihe owuwu aghaghị ịdabere n’amamihe ebumpụta ụwa nakwa n’ahụmahụ. Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ihe ọghọm ndị dị njọ weere ọnọdụ. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1284, elu ụlọ e wuliri elu nke katidral Beauvais dị na France dara n’ihi na o bubigara ibu ókè. Otú ọ dị, ihe ọhụrụ ndị dị ka idé ndị na-adị n’akụkụ mgbidi, idé ndị gbalitere elu na-akwagide azụ mgbidi, uko e wuliri elu nke ime ụlọ na ọnụ pịrị apị nke elu ụlọ mgbịrịgba mere ka ndị na-ewu ụlọ nwee nnọọ ọganihu.
Owuwu ha were site n’ihe dị ka afọ 40 maka ndị nke e wuru ọsọ ọsọ (Salisbury, England) ruo ọtụtụ narị afọ. A rụchabeghịdị ụfọdụ n’ime ha, dị ka katidral ndị dị na Beauvais na Strasbourg, France.
“Amaghị Ihe Ka Mkpa”
‘Ihe owuwu ndị a furu oké ego ma maa mma,’ dị ka Popu Honorius nke Atọ si kwuo ya, kpatara esemokwu site ná mmalite. Ndị ụkọchukwu ụfọdụ kwuru okwu megide ọrụ ahụ na
oké ego ha ga-efu. Pierre le Chantre, bụ́ ụkọchukwu nke Notre-Dame de Paris na narị afọ nke 13 kwuru, sị: “Ọ bụ mmehie iwu chọọchị dị ka a na-ewu ya n’oge a.”Ọbụna taa, katidral dị na Évry, ịkpọtụ nanị otu aha, na-akpalite nkatọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Dị ka akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Monde si kọọ, ọtụtụ ndị na-eche na katidral dị iche iche na-egosipụta “amaghị ihe ka mkpa” nakwa na chọọchị “kwesịrị itinye ego maka ọdịmma ndị mmadụ nakwa n’izisa ozi ọma kama ịbụ n’okwute nakwa n’ihe ịchọ mma.”
Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ ndị keere òkè n’owuwu nke ụlọ ndị a buru ibu nwere ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ. O doro anya na ndị dị otú ahụ “na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ,” ma “ọ bụghị dị ka mmazu si dị.” (Ndị Rom 10:2) Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs Kraịst kwuru ka ụmụazụ ya na-ewu akatamkpo ụlọ ofufe dị iche iche. Ọ gbara ezi ndị na-efe ofufe ume ka ha ‘kpọọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.’ (Jọn 4:21-24) N’agbanyeghị ịma mma ha, akatamkpo katidral dị iche iche nke krisendọm na-emegide ụkpụrụ a. Ha pụrụ ịbụ ihe ncheta nke ndị wuru ha, ma ha adịghị enye Chineke otuto.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 18 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Cathar—Hà Bụ Ndị Kraịst E Gburu Maka Okwukwe Ha?” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke September 1, 1995, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, peeji nke 27-30.
[Foto dị na peeji nke 27]
Katidral nke Santiago de Compostela, Spain
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
N’elu: Windo nwere ugegbe tụrụ àgwà yiri okooko osisi “rose” bụ́ nke dị na Notre-Dame, Chartres, France
N’elu elu: Onye a kpụrụ akpụ na-akụwa okwute, Notre-Dame, Paris
[Foto dị na peeji nke 29]
Katidral Notre-Dame, Paris nke narị afọ nke 12
[Foto dị na peeji nke 29]
Ime katidral Notre-Dame, Amiens. Ọ bụ ụlọ okpukpe kasị ukwuu nke France, nke nwere elu ụlọ e wuliri elu nke dị mita 43 n’ịdị elu