Ihe Mere Ike Ndụ Ji Agwụ Ndị Mmadụ
Ihe Mere Ike Ndụ Ji Agwụ Ndị Mmadụ
“Onye nke ọ bụla gburu onwe ya nwere ihe mere o ji mee ya: ọ bụ ihe dịịrị nnọọ nanị ya, ihe a na-apụghị ịmata amata, na ihe dị egwu.”—Kay Redfield Jamison, dibịa ọrịa uche.
“ỊDỊ ndụ bụ ịhụju anya.” Nke ahụ bụ ihe Ryunosuke Akutagawa, bụ́ onye edemede a ma ama na Japan ná mmalite narị afọ 20, dere n’oge na-adịghị anya tupu o gbuo onwe ya. Otú ọ dị, o ji okwu bụ́: “N’ezie, achọghị m ịnwụ, ma . . . ,” malite okwu ahụ o kwuru.
Dị ka Akutagawa, ọtụtụ n’ime ndị na-egbu onwe ha achọghị ịnwụ ma ha chọrọ “iweta ihe ọ bụla na-emenụ ná njedebe,” ka otu prọfesọ nkà akparamàgwà mmadụ kwuru. Ihe ndị gburu onwe ha na-edetukarị na-egosi nke ahụ. Nkebi ahịrịokwu ndị dị ka ‘Apụghịzi m idi ya’ ma ọ bụ ‘Olee ihe m dị ndụ eme?’ na-egosi ọchịchọ miri emi izere ihe ndị siri ike na-eme eme ná ndụ. Ma dị ka otu ọkachamara si kọwaa ya, igbu onwe onye “yiri iji bọmbụ nuklia agwọ azụ̀zụ̀.”
Ọ bụ ezie na ihe ndị mere ndị mmadụ ji egbu onwe ha na-adịgasị iche iche, ụfọdụ ihe ndị na-eme ná ndụ na-akpalikarị mmadụ igbu onwe ya.
Ihe Ndị Na-akpali Ya
Ọ bụghị ihe ọhụrụ ndị na-eto eto dara mbà n’obi, bụ́kwa ndị gburu onwe ha ime otú ahụ ọbụna n’ihi ihe ndị pụrụ iyi ihe na-enweghị ihe ha bụ n’anya ndị ọzọ. Mgbe ihe wutere ndị ntorobịa, bụ́ nke ha na-apụghịkwa ime ihe ọ bụla banyere ya, ha pụrụ ile ọnwụ ha anya dị ka ụzọ isi megwara ndị mere ha ihe wutere ha. Hiroshi Inamura, bụ́ ọkachamara n’ịgwọ ndị chọrọ igbu onwe ha na Japan, dere, sị: “Ụmụaka na-enwe mmasị ná mkpali ha nwere ịta onye mekpara ha ahụ ahụhụ site n’ịnwụ n’onwe ha.”
Otu nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya na Britain gosiri na mgbe e mesoro ụmụaka ihe n’ụzọ na-adịghị nnọọ mma, ọ na-eji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu asaa eyikarị ka hà ga-anwa igbu onwe ha. Ụmụaka ndị a na-enwe ihe mgbu nke uche n’ezie. Otu nwatakịrị nwoke dị afọ 13 bụ́ onye kwụgburu onwe ya hapurụ otu ibé akwụkwọ o depụtara aha mmadụ ise mekpara ya ahụ ma ọbụna ghọnara ya ego. “Biko zọpụtanụ ụmụaka ndị ọzọ,” ka o dere.
Ndị ọzọ pụrụ ịnwa igbu onwe ha mgbe ha bara ná nsogbu n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ihe metụtara iwu, mgbe mmekọrịta ịhụnanya ha tisara, mgbe ha nwetara akara ule na-adịghị mma, mgbe ha nwere nchekasị n’ihi ule, ma ọ bụ bụrụ ndị obi furu n’ihi nchegbu banyere ọdịnihu. N’etiti ndị nọ n’oge uto bụ́ ndị na-enweta akara mmụta dị elu n’ule, bụ́ ndị na-achọkarị
izu okè, ihe ndọghachi azụ ma ọ bụ ọdịda—ma ò mere eme ma hà chepụtara ya echepụta—pụrụ ime ka ha chọọ igbu onwe ha.Nye ndị toworo eto, nsogbu ego ma ọ bụ nsogbu ndị metụtara ọrụ bụ ihe ndị na-akpalikarị ya. Na Japan, ka ọtụtụ afọ nke ihe isi ike akụ̀ na ụba gasịrị, n’oge na-adịbeghị anya, ndị na-egbu onwe ha na-akarị mmadụ 30,000 kwa afọ. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Mainichi Daily News si kwuo, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke ndị ikom katatụrụ ahụ bụ́ ndị gburu onwe ha mere otú ahụ “n’ihi nsogbu ndị ụgwọ ha ji, ọdịda achụmnta ego, ịda ogbenye na enweghị ọrụ kpatara.” Nsogbu ezinụlọ pụkwara ime ka mmadụ gbuo onwe ya. Otu akwụkwọ akụkọ Finland kọrọ, sị: “Ndị ikom katatụrụ ahụ bụ́ ndị ọ na-adịbeghị anya a gbara ha alụkwaghịm” mejupụtara otu n’ime ìgwè nke ndị nọ nnọọ n’ihe ize ndụ nke igbu onwe ha. Otu nnyocha e mere na Hungary gosiri na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ agbọghọ bụ́ ndị na-eche echiche igbu onwe ha bụ ndị a zụlitere n’ezinụlọ ndị tisara etisa.
Ịla ezumike nká na nrịanrịa bụkwa ihe ndị bụ́ isi na-akpali ya, karịsịa n’etiti ndị agadi. Ọtụtụ mgbe a na-ahọrọ igbu onwe onye dị ka ụzọ isi zere nhụjuanya, ọ bụchaghị mgbe a na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta, kama mgbe onye ọrịa ahụ lere nhụjuanya ahụ anya dị ka ihe ọ na-apụghị ịnagide.
Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile na-ekwe ka ihe ndị a na-akpali ya kpalie ha igbu onwe ha. N’ụzọ megidere nke ahụ, mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ chere ọnọdụ ndị dị otú ahụ na-akpata nchekasị ihu, ha adịghị egbu onwe ha. N’ihi gịnịzi ka ụfọdụ ji ele igbu onwe onye anya dị ka ihe ngwọta, ebe ihe ka n’ọtụtụ na-adịghị eme otú ahụ?
Ihe Ndị Na-apụtaghị Ìhè Na-akpata Ya
“Ihe ka ukwuu ná mkpebi a na-eme ịnwụ ọnwụ na-adabere n’otú e si ghọta ihe ndị merenụ,” ka Kay Redfield Jamison, bụ́ prọfesọ nkà mmụta ọrịa uche na Mahadum Nkà Mmụta Ọgwụ nke Johns Hopkins, na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọtụtụ ndị, mgbe ọ na-adịghị ihe na-echegbu ha, adịghị ewere ihe ọ bụla merenụ dị ka nke dị njọ ruo n’ókè nke ha igbu onwe ha.” Eve K. Mościcki, nke Ụlọ Ọrụ Mba United States Na-ahụ Maka Ahụ Ike Uche, na-ekwu na ọtụtụ ihe—ụfọdụ n’ime ha bụ ihe ndị na-apụtaghị ìhè—na-ejikọta aka akpata àgwà nke ịchọ igbu onwe onye. Ihe ndị dị otú ahụ na-apụtaghị ìhè na-akpata ya gụnyere ọrịa uche na nsogbu nke iji ihe na-eri ahụ eme ihe, ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa mmadụ nwere, na ọdịdị nke ụbụrụ ya. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.
Nke bụ́ isi n’ime ihe ndị a bụ ọrịa uche na nsogbu iji ihe na-eri ahụ eme ihe, ndị dị ka ịda mbà n’obi, ọrịa uche na-emetụta ụbụrụ, isi mgbaka, na ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Nnyocha e mere ma na Europe ma na United States na-egosi na e jikọtara ihe karịrị pasent 90 nke ndị gburu onwe ha na nsogbu ndị dị otú ahụ. N’eziokwu, ndị Sweden na-eme nnyocha chọpụtara na ọnụ ọgụgụ ndị na-egbu onwe ha n’etiti ndị ikom bụ́ ndị na-enweghị ụdị nsogbu ndị ahụ dị mmadụ 8.3 n’ime mmadụ 100,000 ọ bụla, ma n’etiti ndị dara mbà n’obi, ọnụ ọgụgụ ahụ rịrị nnọọ elu ruo mmadụ 650 n’ime mmadụ 100,000 ọ bụla! Ndị ọkachamara
na-ekwukwa na ihe ndị ahụ na-akpata igbu onwe onye yikwara ihe ndị na-akpata ya n’ala ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ka o sina dị, ọbụna mgbe e nwere ma ịda mbà n’obi ma ihe ndị na-akpali igbu onwe onye, ọ dịghị eme ka igbu onwe onye bụrụ ihe a na-apụghị izere ezere.Prọfesọ Jamison, bụ́ onye nwara n’otu oge igbu onwe ya, na-ekwu, sị: “O yiri ka ndị mmadụ hà na-enwe ike ịnagide ịda mbà n’obi ma ọ bụrụhaala na ha kwenyere na ihe ga-aka mma.” Otú ọ dị, ọ chọpụtawo na ka obi nkoropụ ahụ nke na-akawanye njọ na-ekweghịzi odidi, ikike uche nwere igbochi ọchịchọ igbu onwe onye na-eji nke nta nke nta na-ebelata. O jiri ọnọdụ ahụ tụnyere otú ịzọ brek ụgbọala mgbe mgbe si eme ka ọ kwọchasịa.
Ọ dị oké mkpa ịmata na e nwere ọnọdụ dị otú ahụ n’ihi na a pụrụ ịgwọta ịda mbà n’obi. A pụrụ ịgbanwe mmetụta nke enweghị enyemaka. Mgbe e mere ihe banyere ihe ndị na-apụtaghị ìhè na-akpata ya, ndị mmadụ pụrụ imeghachi omume n’ụzọ dị iche n’ebe obi mgbu na nchekasị ndị na-akpalikarị igbu onwe onye dị.
Ụfọdụ na-eche na ọdịdị mkpụrụ ndụ ihe nketa nke mmadụ nwere pụrụ ịbụ ihe na-apụtaghị ìhè na-eme ka ọtụtụ ndị gbuo onwe ha. N’eziokwu, mkpụrụ ndụ ihe nketa na-ekere òkè n’ịchịkwa mmetụta mmadụ na-enwe, nnyocha na-egosikwa na usoro ọmụmụ ezinụlọ ụfọdụ na-enwe ndị na-egbu onwe ha karịa usoro ọmụmụ ndị ọzọ. Ma, “ikike nke mkpụrụ ndụ ihe nketa nwere ịkpali mmadụ igbu onwe ya apụtaghị ma ọlị na a pụghị izere igbu onwe onye ezere,” ka Jamison na-ekwu.
Ọdịdị nke ụbụrụ pụkwara ịbụ ihe na-apụtaghị ìhè na-akpata ya. N’ụbụrụ, ọtụtụ ijeri akwara ozi na-esite ná mmiri ọgwụ ezirịta ozi n’usoro yiri nke ike eletrik. N’isi gbara ngalaba nke akwara ozi ndị ahụ, e nwere obere ohere a na-akpọ synapse, nke akwara mbufe ozi na-esi ná mmiri ọgwu ebufe ozi na ya. Ọnụ ọgụgụ akwara mbufe ozi, ọ̀tụ̀tụ̀ serotonin, pụrụ ime ka mmadụ bụrụ onye e kpughepụrụ nye igbu onwe ya. Akwụkwọ bụ́ Inside the Brain na-akọwa, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala nke serotonin . . . pụrụ imebi obi ụtọ ná ndụ, na-eme ka mmasị mmadụ nwere ịdị ndụ belata ma na-eme ka ohere mmadụ nwere ịda mbà n’obi na igbu onwe ya na-ebuwanye ibu.”
Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị onye e kere igbu onwe ya. Ọtụtụ nde ndị mmadụ na-anagide obi mgbu na nchekasị. Ọ bụ otú uche na obi si emeghachi omume n’ebe nrụgide dị na-eme ka ụfọdụ ndị gbuo onwe ha. Ọ bụghị nanị ihe ndị na-akpali ya ozugbo ka a na-aghaghị ime ihe banyere ha kamakwa a ghaghị ime ihe banyere ihe ndị na-apụtaghị ìhè na-akpata ya.
Ya mere, oleezi ihe a pụrụ ime iji mee ka e nwekwuo nchekwube nke ga-eme ka a zụlitetụghachi mmasị n’ịdị ndụ?
[Igbe dị na peeji nke 16]
Ịbụ Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị na Igbu Onwe Onye
Dị ka otu nnyocha e mere na United States na-egosi, ọ bụ ezie na ndị inyom ji okpukpu abụọ ruo okpukpu atọ yie ka hà ga-anwa igbu onwe ha karịa ndị ikom, ndị ikom ji okpukpu anọ yie ka hà ga-emezu ya karịa ha. Ndị inyom ji ma ọ dịkarịa ala okpukpu abụọ yie ka hà ga-ada mbà n’obi karịa ndị ikom, bụ́ nke pụrụ ịkọwa ihe mere e ji nwee ọtụtụ ndị inyom na-anwa igbu onwe ha karịa ndị ikom. Otú ọ dị, o nwere ike ha agaghị enwe oké ịda mbà n’obi, n’ihi ya kwa ha pụrụ ịchọ igbu onwe ha n’ụzọ ndị na-adịghị oké njọ. N’aka nke ọzọ, ndị ikom pụrụ ịdị na-achọ igbu onwe ha n’ụzọ ndị dị njọ na ndị dị irè karị iji hụ na ha mezuru ya.
Otú ọ dị, na China, ndị inyom na-enwe ihe ịga nke ọma karịa ndị ikom. N’eziokwu, otu nnyocha e mere na-egosi na ihe dị ka pasent 56 nke ndị inyom gburu onwe ha n’ụwa weere ọnọdụ na China, karịsịa n’ime ime obodo. A na-ekwu na otu n’ime ihe ndị kpatara ndị inyom ji anwa ọtụtụ mgbe igbu onwe ha n’ebe ahụ, bụ́ nke ha na-emesịkwa mezuo, bụ nnweta a pụrụ inweta ọgwụ ahụhụ n’ụzọ dị mfe.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 17]
Igbu Onwe Onye na Owu Ọmụma
Owu ọmụma bụ otu n’ime ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ daa mbà n’obi ma gbuo onwe ha. Jouko Lönnqvist, bụ́ onye duziri otu nnyocha e mere banyere igbu onwe onye na Finland, kwuru, sị: “Nye ọtụtụ [ndị gburu onwe ha], ndụ ha na-adị kwa ụbọchị bụbu nke owu ọmụma. Ha na-enwe nnọọ ohere ma ha adịghị enwekebe ndị ha na ha na-akpakọrịta.” Kenshiro Ohara, bụ́ dibịa ọrịa uche na Mahadum Nkà Mmụta Ọgwụ nke Hamamatsu dị na Japan, kwuru na “nkewapụ iche” bụ ihe bụ́ isi mere e ji nwee ịrị elu nke ndị ikom katatụrụ ahụ gburu onwe ha n’oge na-adịbeghị anya ná mba ahụ.
[Foto dị na peeji nke 15]
Nye ndị toworo eto, nsogbu ego ma ọ bụ nsogbu ndị metụtara ọrụ bụ ihe ndị na-akpalikarị ya