Gịnị Mere Ndị Ikom Ji Eti Ndị Inyom Ihe?
Gịnị Mere Ndị Ikom Ji Eti Ndị Inyom Ihe?
NDỊ ọkachamara ụfọdụ na-ekwu na ndị inyom yikarịrị ka ha ga-abụ ndị di ha gburu karịa ịbụ ndị ngụkọta nke ụdị mmadụ ndị ọzọ nile na-akpa arụ ga-egbu. Ná mgbalị iji kwụsị mmeso ọjọọ ọtụtụ ndị na-emeso nwunye ha, e mewo ọtụtụ nnyocha. Olee ụdị nwoke na-eti nwunye ya ihe? Olee otú o si tolite? Ọ̀ nọ na-eme ihe ike n’oge mbedo? Olee otú onye ahụ na-eti nwunye ya ihe si anabata ọgwụgwọ a na-enye ya?
Otu ihe ndị ọkachamara mụtaworo bụ na ndị nile na-eti nwunye ha ihe nwere ụdị dịrịtara iche ha ji eme ya. N’otu akụkụ, e nwere nwoke na-adịghị emekebe ihe ike. Ọ dịghị eji ngwá ọgụ eme ihe, ọ bụghịkwa onye na-emesokarị nwunye ya n’ụzọ na-adịghị mma. N’ebe ọ nọ, ime ihe ike abụghị ihe e ji mara ya, ọ na-eyikwa ka ò nwerịrị ihe ndị gbara ya gburugburu kpatara ya. N’akụkụ nke ọzọ, e nwere nwoke nke zụliteworo àgwà na-ekweghị ya nkwụsị nke iti nwunye ya ihe. Mmeso ọjọọ ya na-aga n’ihu n’ihu, ọ dịghịkwa egosicha mwute ma ọ bụrụ na ọ na-egosidị egosi.
Otú ọ dị, eziokwu ahụ bụ́ na e nwere ụdị dị iche iche nke ndị na-eti nwunye ha ihe apụtaghị na ụdị ụfọdụ nke iti nwanyị ihe dị mma. N’ezie, ụdị ọ bụla nke mmadụ iti nwunye ya ihe pụrụ ịkpata mmerụ ahụ—ọbụna ọnwụ. N’ihi ya, eziokwu ahụ bụ́ na otu nwoke adịghị eme ihe ike ugboro ugboro ma ọ bụ n’ụzọ jọgburu onwe ya dị ka nwoke ọzọ na-eme apụtaghị na ọ dịghị njọ. E nweghị nnọọ ihe dị ka iti ihe “dị mma.” Otú ọ dị, olee ihe ndị pụrụ ime ka nwoke tie nwanyị o kwere nkwa na ya ga na-ahụ n’anya ná ndụ ya nile ihe?
Ihe Jikọrọ Ya na Ezinụlọ
Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị ikom na-eti nwunye ha ihe bụ ndị a zụlitere ha onwe ha n’ezinụlọ ndị di na-eti nwunye ha ihe. “Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị na-eti nwunye ha ihe bụ ndị a zụlitere n’ezinụlọ ndị yiri ‘ọgbọ agha,’” ka Michael Groetsch, bụ́ onye tinyeworo ihe karịrị iri afọ abụọ n’ime nnyocha banyere imeso nwunye omume ọjọọ dere. “Dị ka ụmụ ọhụrụ na ụmụntakịrị, ha tolitere n’ebe a na-esekarị okwu, bụ́ ebe mmeso na-akpasasị uche na iti ihe bụ ‘ihe ndị dị otú ha kwesịrị.’” Dị ka otu ọkachamara si kwuo, nwoke a zụlitere na gburugburu ebe dị otú ahụ “pụrụ ịmụta àgwà nna ya nke ilelị ndị inyom n’oge ọ ka bụ nnọọ nwata. Nwata nwoke ahụ na-amụta na nwoke aghaghị ịdị na-achịkwa ndị inyom mgbe nile nakwa na ụzọ a ga-esi nwee nchịkwa ahụ bụ site n’iyi ha egwu,
ime ihe ga-egbu ha mgbu, na ilelị ha. N’otu oge ahụ, ọ na-amụta na otu ụzọ e ji n’aka isi mee ihe ga-amasị nna ya bụ ịkpa àgwà otú nna ya si akpa.”Bible na-eme ka o doo anya na àgwà nne ma ọ bụ nna pụrụ imetụta nnọọ nwa ya, n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ na-adịghị mma. (Ilu 22:6; Ndị Kọlọsi 3:21) N’ezie, ọnọdụ ezinụlọ mmadụ toro na ya abụghị ihe ngọpụ maka nwoke iti nwunye ya ihe, ma ọ pụrụ inye aka ịmata ebe iwe ọkụ ahụ si malite.
Mmetụta nke Ọdịbendị
N’ala ụfọdụ, a na-ele iti nwanyị ihe anya dị ka ihe dị mma, ọbụna dị ka ihe dị otú o kwesịrị. “Nnwere onwe di nwere iti nwunye ya ihe ma ọ bụ iyi ya egwu n’ụzọ anụ ahụ bụ ihe e kwenyesiri ike na ya n’ọtụtụ obodo,” ka otu ihe ndekọ nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu.
Ọbụna n’ala ebe ndị a na-adịghị ele mmeso ọjọọ dị otú ahụ anya ọma, ọtụtụ mmadụ na-azụlite àgwà nke ime ihe ike. Ụzọ ezi uche na-adịghị na ya ndị ikom ụfọdụ si eche echiche banyere nke a na-awụ akpata oyi n’ahụ. Dị ka akwụkwọ akụkọ South Africa bụ́ Weekly Mail and Guardian si kwuo, otu nnyocha e mere na Cape Peninsula gosiri na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị ikom, bụ́ ndị zọọrọ na ha adịghị emeso nwunye ha n’ụzọ dị njọ, chere na iti nwunye ha ihe dị mma nakwa na omume dị otú ahụ abụghị ime ihe ike.
Ihe àmà na-egosi na echiche dị otú ahụ gbagọrọ agbagọ na-amalitekarị na nwata. Dị ka ihe atụ, na Britain, otu ihe ọmụmụ gosiri na pasent 75 nke ụmụntakịrị nwoke dị afọ 11 na 12 chere na ọ dị mma bụ́ nwoke iti nwunye ya ihe ma ọ bụrụ na a kpasuo ya iwe.
E Nweghị Ihe Ngọpụ Maka Iti Ihe
Ihe ndị e kwuru n’elu pụrụ inye aka n’ịkọwa ihe bụ́ nwoke imejọ nwunye ya, ma ha adịghị eme ka o zie ezi. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, mmadụ iti onye òtù ọlụlụ ya ihe bụ mmehie dị oké njọ n’anya Chineke. Ndị Efesọs 5:28, 29.
N’Okwu ya, bụ́ Bible, anyị na-agụ, sị: “Ndị bụ́ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma, dị ka Kraịst na-emekwa nzukọ Ya.”—Ogologo oge gara aga, Bible buru amụma na na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a, ọtụtụ ndị ga-abụ “ndị na-emeso mmadụ n’ụzọ dị njọ,” na “ndị na-enweghị ịhụnanya ebumpụta ụwa,” nakwa “ndị na-eme ihe ike ike.” (2 Timoti 3:1-3; The New English Bible) Njupụta nke mmadụ imeso onye òtù ọlụlụ ya n’ụzọ dị njọ bụ nnọọ ihe ọzọ na-egosi na anyị na-ebi kpọmkwem n’oge ahụ amụma a kwuru banyere ya. Ma gịnị ka a pụrụ ime iji kwadoo ndị e tiri ihe? È nwere olileanya ọ bụla dịnụ na ndị na-eti nwunye ha ihe pụrụ ịgbanwe akparamàgwà ha?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
“Onye na-eti nwunye ya ihe bụ omempụ n’otu ụzọ ahụ nwoke kụrụ onye ọ na-amabughị ọkpọ bụ.”—When Men Batter Women
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ime Ihe Ike N’ebe Obibi—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
Ndị ikom dị nganga bụ́ ndị na-emegbu ndị inyom bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ, dị ka akụkọ ndị na-esonụ na-egosi.
Ijipt: Nnyocha were ọnwa atọ e mere n’Aleksandria gosiri na ime ihe ike n’ebe obibi bụ isi ihe na-akpatara ndị inyom mmerụ ahụ. Ọ bụ ya mere pasent 27.9 nke ndị inyom ji aga n’ebe a na-elekọta ndị nwere mkpasasị uche.—Ihe Ndekọ nke 5 nke Nzukọ Ezumezu Ụwa Nile Maka Ndị Inyom.
Thailand: N’ógbè Bangkok dịpụrụ adịpụ bụ́ nke kasị buo ibu, a na-eti pasent 50 nke ndị inyom lụrụ di ihe mgbe mgbe.—Ụlọ Ọrụ Ógbè Pacific Maka Ahụ Ike Ndị Inyom.
Hong Kong: “Ọnụ ọgụgụ ndị inyom bụ́ ndị sịrị na di ha etiwo ha ihe ji nnọọ ihe karịrị pasent 40 rịa elu n’afọ gara aga.”—South China Morning Post, July 21, 2000.
Japan: Ọnụ ọgụgụ ndị inyom na-achọ ebe mgbaba rịrị elu site na 4,843 na 1995 ruo 6,340 na 1998. “Ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ kwuru na ha na-achọ ebe mgbaba n’ihi àgwà ime ihe ike nke di ha.”—The Japan Times, September 10, 2000.
Britain: “Kwa sekọnd isii, ndina n’ike, iti ihe ma ọ bụ ịma mmà na-ewere ọnọdụ n’otu ebe obibi na Britain nile.” Dị ka akụkọ sitere n’aka ndị uwe ojii Scotland Yard si kwuo, “kwa ụbọchị ndị uwe ojii na-enweta òkù fon 1,300 sitere n’aka ndị e mesoro ihe ike n’ebe obibi—ihe karịrị 570,000 kwa afọ. Pasent 81 bụ ndị inyom ndị ikom wakporo.”—The Times, October 25, 2000.
Peru: Pasent 70 nke mpụ nile a kọsaara ndị uwe ojii na-emetụta ndị inyom di ha tiri ihe.—Ụlọ Ọrụ Ógbè Pacific Maka Ahụ Ike Ndị Inyom.
Russia: “N’ime otu afọ, di ndị inyom Russia dị 14,500 gburu ha, a kwarụkwara ndị inyom ọzọ dị 56,400 ma ọ bụ merụọ ha ajọ ahụ ná mwakpo ebe obibi.”—The Guardian.
China: “Ọ bụ nsogbu ọhụrụ. Ọ na-amụba n’ụzọ dị ngwa, karịsịa n’ebe ndị mepere emepe,” ka Prọfesọ Chen Yiyun, bụ́ onye ntụzi ọrụ na Jinglun Family Center kwuru. “Nrụgide nke ndị agbata obi adịghịzi egbochi ime ihe ike n’ebe obibi.”—The Guardian.
Nicaragua: “Imeso ndị inyom ihe ike na Nicaragua na-arị elu. Otu nnyocha e mere na-egosi na nanị n’afọ gara aga, pasent 52 nke ndị inyom Nicaragua bụ ndị di ha mesoro ụdị ụfọdụ nke ihe ike n’ebe obibi.”—Akụkọ Ụwa BBC.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Ihe Ndị Na-egosi na Agwọ Nọ n’Akịrịka
Dị ka otu nnyocha nke Richard J. Gelles duziri na Mahadum nke Rhode Island, U.S.A., gosiri, ihe ndị na-esonụ bụ ihe ndị na-egosi na a pụrụ inwe iti ihe na mmeso na-akpasasị uche n’ebe obibi:
1. Nwoke ahụ etinyetụwo aka n’ime ihe ike n’ebe obibi na mbụ.
2. O nwekwaghị ọrụ.
3. Ọ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe ma ọ dịkarịa ala otu ugbo n’afọ.
4. Mgbe o bi n’ụlọ ha, ọ na-ahụ ka nna ya na-eti nne ya ihe.
5. Nwoke na nwanyị ahụ na-ebikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye.
6. Ọ bụrụ na e were ya n’ọrụ, ọ bụ ọrụ a na-adịghị akwụ ezigbo ego na ya.
7. Ọ gụchaghị kọleji.
8. Ọ nọ n’agbata afọ ndụ nke 18 na 30.
9. Otu n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ na-emeso ụmụ ha ihe ike n’ebe obibi ha.
10. Ego ọ na-akpata apụghị iwepụta ha n’ọnọdụ ogbenye ọnụ ntụ.
11. Nwoke ahụ na nwanyị ahụ si n’ọdịbendị dịgasị iche iche.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ime ihe ike n’ebe obibi pụrụ imetụta ụmụaka n’ụzọ siri ike