Mmadụ Ọ̀ Na-ebibi Ebe O Si Enweta Ihe Oriri?
Mmadụ Ọ̀ Na-ebibi Ebe O Si Enweta Ihe Oriri?
“Ezigbo ihe isi ike anyị nwere taa abụghị iji ụgwọ na imefu oké ego ma ọ bụ asọmpi zuru ụwa ọnụ kama ọ bụ mkpa nke ịchọta ụzọ isi na-ebi ndụ nwere nzube, nke na-eju afọ n’ebibighị akụkụ mbara ala nwere ihe ndị dị ndụ na-akwado ndụ. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ ihe a kpọrọ mmadụ chere iyi egwu dị otú a ihu: ndakpọ nke kpọmkwem ihe ndị ahụ na-eme ka anyị dịgide ndụ.”—Ọkà n’Ihe Banyere Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa bụ́ David Suzuki.
ỌDị mfe ịghara iji mkpụrụ osisi apple akpọrọ ihe. Ọ bụrụ na i bi n’ebe mkpụrụ osisi apple na-amị n’ụba, ị pụrụ iche na a pụrụ inweta ha n’ụzọ dị mfe, nke kakwa mma abụrụ na ị pụrụ isi n’ụdị ya dị iche iche họrọ nke masịrị gị. Ma ị̀ maara na ụdị ole a pụrụ isi na ha họrọ taa pụrụ ịdị nnọọ nta n’iji ha tụnyere ole e nwere 100 afọ gara aga?
N’agbata afọ 1804 na 1905, e nwere ụdị 7,098 nke mkpụrụ osisi apple a na-akụ na United States. Taa, 6,121 n’ime ha—pasent 86—adịghịzi adị. Otú ahụ ka ọ dịkwa ube Bekee. Ihe dị ka pasent 88 nke ụdị 2,683 nke ube Bekee e nweburu adịghịzi adị. A bịakwa n’akwụkwọ nri, mbelata nke ọnụ ọgụgụ ụdị ha dị mwute ọbụna karị. Ọ dị ihe na-apụ n’anya, ọ bụkwa ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ—ọ bụghị nanị ọtụtụ ụdị nke ihe ndị dị ndụ kamakwa ọtụtụ ụdị e nwere n’otu ụdị ihe dị ndụ. Ụdị dị iche iche nke akwụkwọ nri a na-akọ na United States ejiriwo pasent 97 dalata n’ime ihe na-erughị afọ 80! Ma inwe ihe n’ụdị dị iche iche ọ̀ dị mkpa n’ezie?
Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ọ dị mkpa. Ọ bụ ezie na a ka na-arụ ụka banyere ọrụ ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ na-arụ, ọtụtụ ndị ọkachamara n’ihe banyere gburugburu ebe obibi na-ekwu na ọ dị oké mkpa maka ndụ n’elu ala. Ha na-ekwu na ọ dị oké mkpa nye akụ́kụ́ ndị anyị na-akụ maka oriri dịkwa nnọọ ka ọ dị mkpa nye ihe ndị na-eto n’oké ọhịa, nakwa n’ala ahịhịa nke ụwa. Inwe ụdị dị iche iche n’ime otu ụdị akúkụ́ dịkwa mkpa. Dị ka ihe atụ, ụdị osikapa dị nnọọ iche iche e nwere na-amụba ohere e nwere na a ga-enwe ụfọdụ ya ga-enwe ike iguzogide ọrịa ndị na-adakwasịkarị ha. N’ihi ya, otu akwụkwọ Worldwatch Institute bipụtara kwuru na nso nso a na otu ihe karịsịa pụrụ igosi ihe a kpọrọ mmadụ ókè ọ jọruru ná njọ ime ka ọnụ ọgụgụ ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa, belata—mmetụta ya n’ebe anyị si enweta ihe oriri dị.
Mkpochapụ nke akụ́kụ́ pụrụ imetụta ihe ọkụkụ ndị a na-eri eri ma ọ dịkarịa ala n’ụzọ abụọ: nke mbụ, ọ ga-ebibi akụ́kụ́ ndị dị n’ọhịa bụ́ ndị yiri ndị nke a na-akụ akụ, bụ́ ndị a pụrụ isi na ha nweta mkpụrụ ndụ ihe nketa maka ịzụlite ndị ọzọ n’ọdịnihu, nke abụọ kwa, ọ ga-ebelata ọnụ ọgụgụ ụdị dị iche iche nke otu ihe a na-akụ akụ. Dị ka ihe atụ, ná mmalite narị afọ nke 20, n’Esia, a na-akọ ihe pụrụ ịkarị 100,000 ụdị osikapa bụ́ ndị e si n’ebe ahụ nweta, na-enwe ma ọ dịkarịa ala ụdị 30,000 n’India nanị. Ugbu a, ihe mejupụtara pasent 75 nke ihe ọkụkụ India bụ nanị ụdị osikapa iri. E jiwo ụdị osikapa ise dochie anya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị osikapa 2,000 nile e nwere na Sri Lanka. Mexico, bụ́ ebe mbụ a malitere ịkọ ọka, na-akọzi nanị pasent 20 nke ụdị dị iche iche e nwere n’ebe ahụ n’afọ ndị 1930.
Ma ọ bụghị nanị ihe oriri nọ n’ihe ize ndụ. A na-esite n’akụ́kụ́ emepụta ihe dị ka pasent 25 nke ọgwụ ndị a na-ere ere, a nọgidewokwa na-achọpụta akụ́kụ́ ndị e ji agwọ ọrịa. Ma, a na-ekpochapụ akụ́kụ́ mgbe nile. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ̀ pụrụ ịbụ na anyị na-egbuji alaka osisi anyị nọ n’elu ya?
Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Nchekwa Ụwa si kwuo, ihe karịrị 11,000 n’ime ihe dị ka ụdị akụ́kụ́ na anụmanụ 18,000 e nyochara, na-eche mkpochapụ ihu. N’ebe ndị dị ka Indonesia, Malaysia, na Latin America, ebe ndị a sụchaworo ọhịa dị ukwuu maka ịkụ ihe na ha, ndị nnyocha pụrụ nanị ịkọ nkọ banyere ụdị akụ́kụ́ ole na-eche mkpochapụ ihu—ma ọ bụ bụrụ ndị e kpochapụwororịị. Ka o sina dị, ụfọdụ ndị na-ekwu na mkpochapụ ka na-aga n’ihu “n’ụzọ dị nnọọ oké ngwa,” ka The UNESCO Courier na-akọ.
N’ezie, ụwa ka na-emepụta ihe oriri buru ibu. Ma ruo ogologo oge hà aṅaa ka ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba nke ụmụ mmadụ ga na-enweta ihe oriri ma ọ bụrụ na ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ ana-adalata n’ọnụ ọgụgụ? Mba dị iche iche emewo ihe maka nchegbu ndị dị otú ahụ site n’iguzobe ebe nkwakọba nke ụdị mkpụrụ akụ́kụ́ dị iche iche, dị ka ụzọ isi gbochie mkpochapụ nke akụ́kụ́ ndị dị mkpa. A malitewo ọrụ ichekwa ụdị akụ́kụ́ dị iche iche n’ụfọdụ ubi ihe ọkụkụ. Sayensị ewepụtawo ngwá ọrụ ọhụrụ nke dị ike, bụ́ nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa. Ma ebe nkwakọba nke ụdị mkpụrụ akụ́kụ́ dị iche iche nakwa sayensị, hà pụrụ n’ezie ịgwọta nsogbu ahụ? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ a.