Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ọhịa Ndị Mmiri Na-ezo na Ha Nnukwu

N’India, ọ bụ nanị n’obodo Kerala dị n’ebe ndịda ka a maara e nwere oké ọhịa mmiri na-ezo na ya nnukwu. Otú ọ dị, na nso nso a, ọkà n’ihe banyere gburugburu ebe obibi bụ́ Saumyadeep Dutta chọpụtara otu oké ọhịa mmiri na-ezo na ya nnukwu bụ́ nke dị square kilomita 500, na-ejikọta obodo Assam na Arunachal Pradesh, bụ́ ndị dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ugwu, ka magazin New Delhi bụ́ Down to Earth na-akọ. Ọtụtụ ụdị anụ bi n’oké ọhịa ahụ—“ụdị anụ 32 na-enye nwa ara na ụdị nnụnụ 260, gụnyere ụdị enyí, agụ, agụ owuru tụrụ àgwà, anụ pangolin nke China, sloth bear, mgbada, hoolock gibbon, nnụnụ kalij pheasant, apịa, na ọbọgwụ ọhịa ndị a na-adịghị ahụkebe.” Otú o sina dị, ọchịchọ a na-achọ ihe ndị e si n’oké ọhịa enweta ná mba nile na-etinye ọtụtụ oké ọhịa mmiri na-ezo na ha nnukwu n’ihe ize ndụ, ka Down to Earth na-ekwu. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ihe ndị si n’okike na-atụ egwu na ọ bụrụ na e werechaa ihe ndị dị otú ahụ site n’iwerebiga ha ókè, oké ọhịa ndị mmiri na-ezo na ha nnukwu agaghịzi abụ ndị e chekwara echekwa kama a ga-agbanwe ha were ha mere nanị ebe a na-akọ ugbo.

Ịgbọ Ụja Agụ

Gịnị mere ịgbọ ụja agụ ji yie ka ọ na-emenye ọ bụghị nanị ụmụ anụmanụ ụjọ kamakwa ụfọdụ ndị mmadụ? Ndị ọkà mmụta sayensị si n’Ụlọ Ọrụ Na-eme Nnyocha Banyere Nzirịta Ozi n’Etiti Ụmụ Anụmanụ nke dị na North Carolina, U.S.A., “achọpụtawo na agụ na-ewepụta ‘ụda dị nnọọ ala,’ ide inwù nke dị ala nke na ụmụ mmadụ adịghị anụ ya,” ka The Sunday Telegraph nke London na-akọ. Ụmụ mmadụ pụrụ ịnụ nanị ụda ndị ọ̀tụ̀tụ̀ ha gafere hertz (Hz) 20, ma agụ “na-agwakọta ide inwù dị Hz 18 na nke dị ala karị na ịgbọ ụja anyị pụrụ ịnụ, ihe na-esikwa na ya apụta, dị ka Elizabeth von Muggenthaler bụ́ onyeisi ụlọ ọrụ ahụ si kwuo, bụ na ụmụ mmadụ pụrụ inwe mmetụta nke ịgbọ ụja agụ, mmetụta nke na-akpata ụjọ na-adịghị adịte aka,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-akọwa. Nke a emewo ọbụna ndị nọteworo aka n’ịzụ agụ.

Iji Ihe Ndị Na-agbawa Agbawa Eme Ka Anụ Dị Nro

Ndị osi nri na-emekarị ka anụ siri ike dị nro site n’ịkụtụ ya ihe ma ọ bụ itinye ya ntụ nwere enzyme na-eme ka anụ dị nro. Otú ọ dị, ndị nchọpụta nọ na Maryland, U.S.A, anwale iji ụzarị ọkụ dị ike eme ka anụ dị nro, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. Ndị nchọpụta ahụ na-etinye anụ ahụ n’efere ígwè nke e dotere n’ala ala ihe plastik e ji ekponye ahịhịa bụ́ nke a gbajuru mmiri na ya. Ha na-emezi ka ihe ha ka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu ogologo dynamite gbawaa n’ime ihe mkpofu ahịhịa ahụ. “Mmiri ahụ na-eme ka ụzarị ọkụ ahụ gabiga n’ime anụ ahụ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu, “ma n’ụzọ dị mwute, ihe mkpofu ahịhịa ahụ na-agbarisị.” E wezụga ime ka anụ dị nro, usoro ahụ na-egbukwa ụmụ nje dị ka E. coli, bụ́ nke pụrụ ịkpata ọrịa afọ a na-enweta n’ihi iri nri nje dị na ya. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka Randy Huffman nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Anụ n’America si kwuo: “Ihe ga-abụ ihe ịma aka n’ezie bụ iji nke a mee ihe ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị.”

Ụgbọ Mmiri Na-ekesa Ọrịa

“Mmiri a na-agbanye n’ụgbọ mmiri iji mee ka ha dị arọ na-ekesa ọrịa n’ụwa nile, na-eyi ndụ ndị mmadụ, anụmanụ na ihe ọkụkụ egwu,” ka The Daily Telegraph nke London na-ekwu. Ụgbọ mmiri na-eji mmiri a na-agbanye n’ime ya eme ihe dị ka ihe na-eme ka ọ kwụsie ike ma na-agbapụkwa ya n’oké osimiri ma ọ bụ n’ọdụ ụgbọ mmiri ebe ndị ha na-akwụsịtụ. Na United States, ndị nchọpụta nọ n’Ụlọ Ọrụ Smithson Maka Ime Nnyocha Banyere Gburugburu Ebe Obibi, na Maryland, chọpụtara na ọnụ ọgụgụ nje bacteria na virus dị nnọọ ukwuu na-adị n’ime mmiri ahụ a na-agbanye n’ụgbọ mmiri. Ụmụ obere ihe ndị dị ndụ dị n’ime mmiri ahụ a na-agbanye n’ụgbọ mmiri bụ́ ndị dị n’ime ụgbọ mmiri 15 e nyochara n’Ọnụ Mmiri nke Chesapeake bucha nje bacteria na-akpata ọrịa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ. Dị ka ọ na-adịkarị, otu lita nke mmiri a nwere ihe dị ka nje bacteria dị nde 830 na nje virus dị nde 7,400—ihe ji site n’okpukpu isii ruo asatọ karịa ọnụ ọgụgụ nke ihe ndị ọzọ dị ndụ.

Ihe E Ji Egwuri Egwu Gafere Ókè

“Ụmụaka adịkwaghị enwe ike ime egwuregwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihi na a na-enye ha ihe e ji egwuri egwu gafere ókè, dị ka nchọpụta ọhụrụ e mere na-egosi,” ka The Sunday Times nke London na-akọ. Ihe so kpalie nchọpụta ahụ bụ nchegbu e nwere na Britain na “a na-agbanwegharị oge ịbụ nwata n’ụzọ na-enweghị mmekwata site ná ndị nne na nna iji ihe ndị e ji egwuri egwu, kọmputa na telivishọn na-edochi anya ha iwepụta oge soro ụmụ ha nọọ.” Ka ọ mụsịrị ihe banyere ụmụaka 3,000 dị malite n’afọ atọ ruo ise, Prọfesọ Kathy Sylva nke Mahadum Oxford kwubiri, sị: “Mgbe ha nwere ọtụtụ ihe e ji egwuri egwu, o yiri ka e nwere ihe ga na-adọpụ uche ha, mgbe ụmụaka nwekwara ihe ndọpụ uche, ha adịghị amụta ihe ma ọ bụ eme egwuregwu nke ọma.”

Ịda Mbà n’Obi n’Ebe Ọrụ

“N’ebe ọrụ . . . nchegbu, oké ike ọgwụgwụ, na ịda mbà n’obi na-arị elu n’ụzọ na-enweghị nchịkwa,” ka The Guardian nke London na-akọ. Dị ka Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Ọrụ nke òtù UN si kwuo, ihe ruru mmadụ 3 n’ime mmadụ 10 ọ bụla e were n’ọrụ na United Kingdom na-enwe nsogbu uche, a kọkwara na 1 onye n’ime ndị ọrụ 10 na United States na-enwe ịda mbà n’obi a pụrụ ịchọpụta n’ụlọ ọgwụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 7 nke ndị lachuru ezumike nká na Germany bụ n’ihi ịda mbà n’obi. Ihe karịrị ọkara nke ndị ọrụ nile nọ na Finland na-enwe mgbaàmà ọrịa ndị metụtara nrụgide. Na Poland, nchegbu a na-enwe n’ihi enweghị ọrụ nke na-amụba n’ike n’ike ji pasent 50 rịa elu na 1999, ebe igbu onwe onye mụbakwara. Akụkọ ahụ na-ekwu na ka a nọgidere na-agbanwe gaa na nkà na ụzụ na usoro nlekọta ndị ọhụrụ n’ebe ọrụ, ịda mbà n’obi ga-arị elu nke ukwuu. Ọ na-adọkwa aka ná ntị na “ka ọ na-erule 2020, nrụgide na ọrịa uche ga-akarị ihe mberede okporo ụzọ, ọrịa AIDS na ime ihe ike dị ka ihe bụ́ isi na-akpata arụghị ọrụ.”

Ihe Na-arị Elu Mpụ Na-efu

“Mpụ a na-eme n’England na Wales na-efu ọha na eze £60bn [ijeri dollar 85] kwa afọ,” ka The Independent nke London na-akọ. Ọnụ ego a, nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme n’Obodo kọwara dị ka nke e leziri anya mee ka ọ dị ala, bụ pasent 6.7 nke ihe nile mba ahụ na-emepụta. Igbu ọchụ na igbu mmadụ bụ mpụ ndị kasị efu ego, na-efu mba ahụ ihe karịrị £1 nde [nde dollar 1.4] ná nkezi maka otu, ebe ajọ mpụ ndị ọzọ nke ime ihe ike na-efu £19,000 [dollar 27,000] ná nkezi maka otu. Igwu wayo na ihe ndekọ adịgboroja na-ewe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ihe nile a na-emefu. Ọnụ ego ndị a agụnyeghị “ihe ịtụ egwu mpụ na-efu, mmetụta ọ na-enwe n’ahụ ezinụlọ nke ndị e mesoro ya, ego Gọọmenti na-emefu iji gbochie mpụ, . . . ma ọ bụ ụgwọ ụlọ ọrụ ịnshọransị na-akwụ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-agbakwụnye.

Ahịhịa Dị Mma Karịa Ọgwụ E Ji Egbu Ahụhụ

Ndị ọrụ ugbo nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa na-eji ahịhịa eme ka ọka ha kọrọ mee nke ọma kama iji ọgwụ e ji egbu ahụhụ, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. Ọ dị ajọ ihe abụọ na-enye ndị na-akọ ọka n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa nsogbu. Otu bụ Striga, bụ́ ahịhịa na-eto n’ahụ ahịhịa ndị ọzọ, bụ́ nke na-ebibi kwa afọ ọka a kọrọ akọ ndị ọnụ ego ha ruru nde $10. Onye Kenya na-eme nchọpụta bụ́ Ziadin Khan chọpụtara na Striga agaghị eto ma ọ bụrụ na a kụọ ahịhịa a na-akpọ desmodium n’agbata otu ahịrị ọka na ọzọ. Ihe nke ọzọ na-enye ha nsogbu bụ erùrù nke ahụhụ ahụ na-akpọpu ogwe osisi bụ́ stem borer, bụ́ nke na-erichapụ otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ọka ndị a kọrọ n’ihe ka ukwuu n’ọtụtụ afọ. Otú ọ dị, Khan achọpụtawo na ahụhụ ndị na-akpọpu ogwe osisi na-enwe mmasị karị n’iri ahịhịa e nwere n’ógbè ahụ, nke a na-akpọ napier. Site n’ịkụ ahịhịa a n’ubi ha, ndị ọrụ ugbo na-arara ahụhụ ndị ahụ pụọ n’ọka ha. Ihe na-anyakụdo anyakụdo ahịhịa ahụ na-ewepụta na-ejide ma na-egbu erùrù ahụ. “Ọ ka ọgwụ e ji egbu ahụhụ mma, ọ kakwa nnọọ ọnụ ala,” ka Khan kwuru. “O mewokwa ka ihe ndị a na-enweta n’ubi n’ebe a jiri pasent 60 ruo 70 mụbaa.”

Wayo nke Onye Ọkà Mmụta Ihe Ochie

Ọ bawo n’ihe ndekọ na otu n’ime ndị ọkà mmụta ihe ochie kasịnụ nke Japan, bụ́ onye a kpọworo ọkà n’igwu ihe n’ihi nchọpụta ya ndị yiri ihe ndị na-atụ n’anya, na-egwu wayo. Otu kamera vidio nke ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ akụkọ bụ́ Mainichi Shimbun guzobere nwụdere onye ọkà mmụta ihe ochie ahụ ka ọ na eli ihe nkà ndị e ji nkume tụọ n’ebe a na-egwupụta ihe mgbe ochie n’ala tupu ìgwè ndị ahụ na-egwu ihe abịaruo. Ebe ọ na-enweghị ike ịgọnahụ ihe àmà ahụ, ọkà mmụta ihe ochie ahụ kwetara na ya na-eli ihe ndị si n’ihe ndị ọ chịkọtara, n’ala. Ugbu a, a na-enyochagharị ihe nile o gwutere kemgbe afọ 30. Ndị na-ebipụta akwụkwọ na-eche na o kwesịrị ekwesị inyochagharị akwụkwọ ndị na-akọ banyere ihe mgbe ochie e gwutara n’ala na akwụkwọ ọgụgụ ụlọ akwụkwọ dị iche iche n’ihi nke a.

Ihe Mberede Ụmụaka

Dị ka nchọpụta nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) mere ná mba 26 gosiri, ihe mberede bụ isi ihe na-akpata ọnwụ ụmụaka ná mba ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa. “Mmerụ ahụ kpatara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwụ nke pasent 40 nke ụmụaka ndị dị 1 afọ ruo 14 ná mba ndị e mere nnyocha na ha,” na-aghọ ngụkọta nke ihe dị ka mmadụ 20,000 na-anwụ kwa afọ, ka akwụkwọ akụkọ Japan bụ́ Mainichi Daily News na-akọ. Ihe ndị so na-akpata mmụba n’ohere e nwere maka ụmụaka imerụ ahụ na-agụnye ịda ogbenye, ndị nne ma ọ bụ nna ịzụ ụmụ nanị ha, ezinụlọ ndị buru ibu, na ndị nne na nna iji ihe ndị na-eri ahụ eme ihe. UNICEF gbara ume ka e lebara ‘ihe ndị a nwapụtara na-azọ ndụ anya: okpu ígwè, ọ̀tụ̀tụ̀ ụgbọala ga-agbaru n’ọsọ n’ógbè ndị mmadụ bijuru, oche dị nchebe maka ụmụaka n’ụgbọala, belt oche, ihe nkwụchi ọgwụ ụmụaka a na-agaghị emepeli, ihe mgbaàmà anwụrụ ọkụ n’ebe obibi, na ihe nchebe kwesịrị ekwesị n’ebe ngwuri egwu.’