Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Ọdịnihu Dịịrị Okpukpe?

Gịnị Bụ Ọdịnihu Dịịrị Okpukpe?

Gịnị Bụ Ọdịnihu Dịịrị Okpukpe?

MMALITEGHACHI nke okpukpe ná mba ndị mejupụtaburu Soviet Union adịwo ịrịba ama. Nanị na Russia, pasent 50 nke ndị bi na ya na-ekwu ugbu a na ha bụ ndị Ọtọdọks, ọtụtụ nde ndị ọzọ na-ekpe okpukpe ndị ọzọ. Alakụba, okpukpe ndị Juu, na okpukpe Buddha so n’ime ndị dịteworo aka, ọ dịwokwa anya Ndịàmà Jehova nọwara n’ebe ahụ.

Laarị azụ na 1891, ndị nnọchiteanya Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova tupu 1931, letara Kishinev, Russia (ebe bụ ugbu a Chisinau, Moldova). Ha na ndị kwere ekwe ibe ha nwere nzukọ n’ebe ahụ. Na 1928, George Young, onye nnọchiteanya pụrụ iche nke Ndị Mmụta Bible, kpọtụụrụ ndị ọchịchị Soviet na Moscow, Russia, iji nata ikike maka ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na Soviet Union. Ka e mesịrị, a bịara mara Ndịàmà nke ọma n’ihi mgbalị dị iche iche Soviet mere iji kpochapụ ha.

Mgbe Soviet Union tisasịrị na mberede n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri gara aga, ndị mmadụ malitere ịjụ, sị: ‘Gịnị mere ndị Soviet ji chọọ ikpochapụ okpukpe?’ Ọtụtụ ndị e jiworo ozizi ekweghị na Chineke zighasịa isi eri ọtụtụ iri afọ bịara chọọ ịmata uru okpukpe bara. Bible, bụ́ nke e gbochiworo dị ka akwụkwọ a machibidoro iwu, ọ̀ pụrụ n’ezie ịgwọta nsogbu ndị na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu? Ndị Russia malitere ime nnyocha n’onwe ha.

Nsogbu Dị Iche nke Okpukpe

Mmasị ọtụtụ ndị na-enwe na Bible mere ka e nwee ụdị nsogbu dị iche nke okpukpe n’ebe bụbu Soviet Union. Akwụkwọ akụkọ Guardian nke London, England, kwuru n’afọ gara aga, sị: “O nwere ike ọ bụrụ na ‘agha a lụsoro Chineke’ ebiela, ma ka nanị afọ iri gasịrị ka e merisịrị, n’ụzọ na-eme ihere, mba nke mbụ n’ụwa kwupụtara n’ezoghị ọnụ na ya ekweghị na Chineke, agha nzuzo ọhụrụ nke okpukpe nwere ike ka bụrụ nke na-amalite amalite na Russia.” Gịnị bụ ihe a a na-akpọ agha nzuzo nke okpukpe nke akwụkwọ akụkọ ahụ na-ezo aka na ya?

Dị ka e kwuru n’isiokwu anyị bu ụzọ, Chọọchị Ọtọdọks nke Russia na ndị ndú Soviet rụkọrọ nnọọ ọrụ iji lanarị ma nweta ihe ùgwù. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian na-akọwa ịga n’ihu nke mmekọrịta dị otú ahụ, na-asị: “N’afọ 10 gara aga, chọọchị ahụ na mba ahụ na-enwebeghị ezigbo mgbanwe bụ́ nke na-emegidebu ya, anọwo na-enwe mmekọrịta chiri anya nke na-adịghị mma, na-akwado gọọmenti Russia mgbe nile (nkwado Onyeisi Chọọchị ahụ kwadoro agha a lụrụ na Chechnya) na òkè dị ukwuu ọ na-ekere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị iji kwụghachi ya ụgwọ.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ Los Angeles Times nke February 10, 1999, kpọtụrụ uche n’òkè chọọchị ahụ na-ekere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ọ na-ekwu banyere Iwu Nnwere Onwe nke Akọ na Uche na nke Ịhọrọ Okpukpe. Los Angeles Times kwuru na “Chọọchị Ọtọdọks nke Russia kwadoro” iwu a, bụ́ nke President Boris Yeltsin, nke na-achị n’oge ahụ, bịanyere aka na ya na September 1997. Iwu ahụ nyere chọọchị ahụ nakwa Alakụba, okpukpe ndị Juu, na okpukpe Buddha ọnọdụ kasị mma dị ka okpukpe ndị “dịteworo aka.” Tinyere ihe ndị ọzọ, iwu ahụ chọrọ ka e deba òtù okpukpe ndị dị na Russia n’akwụkwọ.

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times nke February 11, 1999, kọrọ na mgbe e mesịrị ka iwu a malite ịdị irè, “Chọọchị Ọtọdọks nọgidere na-enye ndị na-ama ya aka nsogbu.” Times kwukwara, sị: “N’August gara aga, Aleksei nke Abụọ, Onyeisi Chọọchị Ọtọdọks nke Russia, kpọrọ òkù ka a machibido okpukpe ndị na-eme ntọghata, karịsịa ndị na-agbalị ịrapụta ndị mmadụ ‘n’okpukpe ndị nna nna ha.’” Kemgbe ahụ, a nọgidewo na-eme mgbalị iji machibido okpukpe ndị a sịrị na ha na-eme ntọghata, na-eme ka e nwee ihe a kọwaworo dị ka “agha nzuzo nke okpukpe.”

Otu n’Ime Ndị E Lekwasịrị Anya

Ndịàmà Jehova abụwo otu n’ime ndị a kasị lekwasị anya ná mmegide ahụ Chọọchị Ọtọdọks nke Russia nọ n’isi ya. Na June 20, 1996, ọfịs ọkàiwu Moscow malitere ịtụle akwụkwọ Kọmitii Na-ahụ Maka Ichebe Ndị Ntorobịa Pụọ n’Okpukpe Ụgha, bụ́ nke na-agbaso òtù nzuzo mgba, gbara. Ọ bụ ezie na e bugharịrị ikpe ahụ ọtụtụ mgbe n’ihi enweghị ihe àmà na-egosi na Ndịàmà na-eme mpụ, a na-akpọliteghachi ya mgbe mgbe.

Ka ọ dịgodị, a bịara na-ekwu ọtụtụ okwu nduhie megide Ndịàmà. Komsomolskaya Pravda, akwụkwọ akụkọ Russia a na-ekesa ọnụ ọgụgụ ruru 1,200,000 na ya, kwuru ná mbipụta ya nke November 21, 1998, sị: “N’ime nanị afọ abụọ, Chọọchị Ọtọdọks nke Russia ebipụtawo ihe karịrị akwụkwọ iri, broshuọ, na obere akwụkwọ bụ́ ndị ‘e bipụtara maka’ Ndị Jehova.” Gịnị mere chọọchị ahụ ji lekwasị anya n’ịgbalị imebi aha Ndịàmà?

“Ma eleghị anya,” ka Komsomolskaya Pravda gara n’ihu ikwu, “n’ụzọ bụ́ isi ọ bụ n’ihi na n’ime nanị afọ asaa gara aga ọnụ ọgụgụ nke ndị nọ ná nzukọ ahụ ejiriwo okpukpu iri mụbaa, Chọọchị Ọtọdọks nke Russia, dịkwa ka òtù ọ bụla nwere ndị ndú, achọghị ndị ga-ama ya aka.”

Ná mmalite 1999, mgbe a kpọliteghachiri okwu ikpe ahụ metụtara Ndịàmà, ọ dọọrọ mmasị ụwa dum. Isi akụkọ dị na New York Times nke February 11 na-agụ, sị: “Ụlọikpe Moscow Atụlee Mmachibido Iwu nke Ndịàmà Jehova.” Isiokwu ahụ kwuru, sị: “Òtù ndị na-ahụ maka okpukpe na ihe ndị ruuru mmadụ na-ekiri okwu ikpe ahụ dị ugbu a n’aka ụlọikpe obodo dị na Moscow, nke ọma, bụ́ nke a nọ n’otu obere ọnụ ụlọikpe na-eleba anya, dị ka mgbalị mbụ pụtara ìhè a na-eme iji were [Iwu Nnwere Onwe nke Akọ na Uche na nke Ịhọrọ Okpukpe] gbochie ife ofufe.”

Lyudmila Alekseyeva, onyeisi nke Òtù Mba Nile nke Helsinki, kọwara ihe mere e ji na-ekiri ikpe a a na-ekpe Ndịàmà, nke ọma. O kwuru na ọ bụrụ na ndị ahụ na-agbalị igbochi Ndịàmà Jehova “enwee ihe ịga nke ọma n’ikpe a,” mgbe ahụ “ha ga-enwezi ohere imegide òtù ndị ọzọ” bụ́ ndị a na-ewerekwa dị ka okpukpe ndị na-adịtebeghị aka. Otú ọ dị, e yigharịrị ikpe ahụ ọzọ na March 12, 1999. Ma n’ọnwa sochiri ya, n’April 29, Ministri Okwu Ikpe na Russia nyere “Ebe Nlekọta Ọrụ nke Ndịàmà Jehova na Russia” satifiketi na-egosi na e debala aha ha n’akwụkwọ.

N’agbanyeghị nkwado a gọọmenti kwadoro ha, mmegide a na-emegide Ndịàmà na okpukpe ndị ọzọ ka nta n’ọnụ ọgụgụ anọgidewo na-aga n’ihu na Russia na mba ndị ọzọ bụbu mba Soviet. Lawrence Uzzell, onye nduzi nke Ụlọ Ọrụ Keston dị n’Oxford, England, kwuru na “ọ na-abakarị uru ikiri Ndịàmà Jehova” n’ihi na ihe ọ bụla mere ha na-abụ “ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị bịara n’oge.” N’ezie, nnwere onwe ikpe okpukpe maka ọtụtụ iri nde ndị mmadụ nọ n’ihe ize ndụ!

Mmegide ahụ Ezighị Ezi

Na narị afọ mbụ, ndị isi nchụàjà na ndị ndú okpukpe ọzọ kpagburu ụmụazụ Jisọs. (Jọn 19:15; Ọrụ 5:27-33) N’ihi ya, e kwuru banyere Iso Ụzọ Kraịst, sị: “Ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” (Ọrụ 28:22) Ya mere, o kwesịghị ịbụ ihe ijuanya na a ga-ekwutọkwa ezi ndị Kraịst taa, dị ka a na-ekwutọ Ndịàmà Jehova.

Ma, mgbe ọ tụlesịrị ihe akaebe e wetara megide ndị Kraịst oge mbụ, Gameliel, onye Farisii a ma ama na onye nkụzi Iwu ahụ, dụrụ ọdụ, sị: “Wepụnụ aka n’ahụ mmadụ ndị a, hapụkwanụ ha: n’ihi na ọ bụrụ na izu a ma ọ bụ ọrụ a sitere n’aka mmadụ, a ga-akwatu ya n’ala: ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, unu agaghị apụ ịkwatu ha n’ala; ka a ghara ịhụ unu dị ka ndị na-alụkwa ọgụ megide Chineke ma eleghị anya.”—Ọrụ 5:38, 39.

Ndị nkatọ ejiriwokwa nlezianya nyochaa Ndịàmà Jehova taa. Olee ihe ndị si na ya pụta? Sergey Blagodarov, nke bụ́ onye Ọtọdọks, kwuru na Komsomolskaya Pravda, sị: “N’ime ihe karịrị otu narị afọ, ọ dịbeghị mba ọ bụla n’ụwa nwere ike igosi na ndị a na-eme mpụ, ma ọ bụ igosi na iwu akwadoghị ọdịdị ha dị.”

Gịnị Bụ Ọdịnihu Dịịrị Okpukpe?

Bible na-ekwu banyere ‘okpukpe nke dị ọcha,’ ma ọ bụ “ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ.” (Jemes 1:27a; leekwa New World Translation.) Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, Bible na-akọwa alaeze ụwa nke okpukpe ụgha dị ka “oké nwanyị ahụ na-akwa iko . . . onye ya na ndị eze ụwa kwara iko.” E kwuru na akwụna okpukpe a bụ́ ihe atụ—“Babilọn Ukwu ahụ”—‘ṅụbigara ọbara ndị nsọ na ọbara ndị àmà Jisọs ókè.’—Mkpughe 17:1-6.

Lee otú nkọwa a si kwesị okpukpe nke soworo ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa rụkọọ ọrụ n’ụzọ chiri anya iji chebe ọnọdụ dị ùgwù ọ nọ na ya! Ma, e kpebiwo ihe ga-abụ ọdịnihu nke oké akwụna okpukpe a bụ́ ihe atụ. “N’otu ụbọchị,” ka Bible na-ekwu, “ihe otiti ya nile ga-abịa, bụ́ ọnwụ, na iru újú, na ụnwụ; a ga-erechapụkwa ya n’ọkụ; n’ihi na Ọ dị ike, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, Onye kpere ya ikpe.” Ka a sịkwa ihe mere ịdọ aka ná ntị ahụ mmụọ ozi nyere ji chọọ ime ihe ngwa ngwa: “Sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara . . . ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile”!—Mkpughe 18:4, 7, 8.

Mgbe Jemes onye na-eso ụzọ kọwara ‘okpukpe nke dị ọcha,’ o mere ka a mata ya dị ka nke “na-enweghi ntụpọ site n’ụwa.” (Jemes 1:27b) Ọzọkwa, Jisọs Kraịst kwuru banyere ụmụazụ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Ya mere, ị̀ pụrụ ịhụ ihe mere Ndịàmà Jehova ji ewezụga onwe ha pụọ ná mmetụta ndị na-emerụ emerụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a? Ha na-eme otú ahụ n’ihi obi ike zuru ezu ha nwere ná nkwa Bible kwere, sị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ikpe ahụ e kpere na Moscow na February 1999. Ndị na-ekpechitere ndị a gbara akwụkwọ (n’aka ekpe), ọkàikpe (n’etiti), na ndị na-ekpechitere ndị gbara akwụkwọ (n’aka nri)

[Foto dị na peeji nke 23]

Bible na-akọwa ọdịnihu dịịrị okpukpe nile