Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ịnagide Ọrịa Gị—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ịnagide Ọrịa Gị—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
JIDE n’aka na mmetụta ị na-enwe bụ ihe dị otú o kwesịrị. Ọ bụ ezie na ọrịa ma ọ bụ nkwarụ i nwere pụrụ ịbụ ihe mere gị n’anụ ahụ, ihe dị n’uche gị na-eguzogide mgbanwe ndị ọrịa ahụ wetaara gị. Ọ pụrụ ịdị nnọọ ka gị na ọrịa gị ùnu na-agbarịta mgba, ịsọ mpi dị n’etiti onye ị bụbu na ihe ị pụrụ ịghọ. Ka ọ dị ugbu a, ọ pụkwara ịdị ka ọrịa gị ọ̀ na-enwe mmeri. Ma, ị pụrụ ịgbanwe ya. N’ụzọ dị aṅaa?
“Mgbe ọrịa mere ka a tụfuo ihe,” ka Dr. Kitty Stein na-ekwu, “ọ na-adị nnọọ ka ọ bụ ọnwụ.” N’ihi ya, mgbe ị tụfuru ihe dị gị oké mkpa dị ka ahụ ike gị, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị na ị ga-eru újú ma bee ákwá, dị nnọọ ka ị ga-eme ma onye ị hụrụ n’anya nwụọ. N’eziokwu, ị pụrụ ịtụfu ihe karịrị ahụ ike gị. Dị ka otu nwanyị na-akọwa, “akwụsịrị m ọrụ m. . . . Adịkwaghị m emere onwe m ihe m na-emebu mgbe nile.” Ọ bụrụgodị otú ahụ, na-ele ihe ndị funahụrụ gị anya n’ụzọ ziri ezi. “Ị ga-eru újú maka ihe funahụrụ gị,” ka Dr. Stein na-ekwukwasị, bụ́ onye na-arịa ọrịa multiple sclerosis, “ma ọ dịkwa gị mkpa ịghọta ihe ị ka nwere.” N’ezie, ozugbo i jisiri ike gafere oge anya mmiri ná mmalite, ị ga-ahụ na ọ ka dị ikike ndị dị mkpa i nwere. Otu ihe bụ na i nwere ikike nke ime mgbanwe.
Onye na-akwọ ụgbọ mmiri apụghị ịchịkwa oké ifufe, ma ọ pụrụ ịnagide ya site n’idozi ákwà ifufe nke ụgbọ ya. N’otu aka ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị enwe ike ịchịkwa ọrịa wakpoworo gị, ma ị pụrụ ịnagide ya site n’idozi “ákwà ifufe” gị, ya bụ, ume gị, ikike iche echiche na nke ịchịkwa mmetụta uche gị. Gịnị nyewooro ndị ọzọ na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala aka ime nke ahụ?
Mụta Banyere Ọrịa Gị
Mgbe ha dichara mmetụta mbụ ha nwere mgbe a chọpụtara ihe na-arịa ha, ọtụtụ ndị na-abịa chee na ịmara eziokwu ahụ nke na-egbu mgbu n’obi dị mma karịa ịtụ egwu ihe ị na-amaghị. Ọ bụ ezie na egwu pụrụ ijichi gị, ịmara ihe na-eme gị pụrụ inyere gị aka ịtụle ihe ị pụrụ ime—nke ahụ n’onwe ya na-enwekarịkwa mmetụta dị mma. “Rịba ama otú ihe ọ bụla na-eme ka i nwee nchegbu si ebelata karị mgbe i chepụtara ihe ị ga-eme banyere ya,” ka Dr. David Spiegel nke Mahadum Stanford na-ekwu. “Ogologo oge tupu i mee ihe ọ bụla n’ezie, ị na-eme ka ahụ erughị ala ị na-enwe belata site n’ime atụmatụ banyere ihe ị ga-eme.”
Ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịmarakwu banyere ọnọdụ gị. Dị ka otu ilu Bible na-ekwu, “onye nwere ihe ọmụma na-eme ka ike nwee ume.” (Ilu 24:5) “Nweta akwụkwọ n’ọbá akwụkwọ. Mụta banyere ọrịa gị ruo ókè i nwere ike,” ka otu nwoke na-adịghị esi n’àkwà ebili kwuru. Ka ị na-amụta banyere ọgwụgwọ ndị dịnụ na ụzọ isi nagide ya, ị pụrụ ịchọpụta ma eleghị anya na ọnọdụ gị adịrughị njọ ókè ị na-atụ egwu ya. Ị pụrụ ọbụna inwe ihe ụfọdụ mere ị ga-eji nwee nchekwube.
Otú ọ dị, nzube gị abụghị nanị iji ezi uche amata ọrịa gị. Dr. Spiegel na-akọwa, sị: “Nnweta a a na-enweta ihe ọmụma bụ akụkụ nke usoro dị mkpa nke idi ọrịa, nke ịghọta ya, nke ile ya anya n’ụzọ ziri ezi.” Ikweta na ndụ gị agbanwewo nakwa na ọkụ anyụbeghị bụ usoro chọrọ nlezianya na nke na-agakarị nwayọọ nwayọọ. Ma ọganihu a—site n’iji ezi uche amata ọrịa gị ruo n’iji ikike mmetụta uche anakwere ya—bụ ihe ị pụrụ inwe. N’ụzọ dị aṅaa?
Inwe Echiche Ziri Ezi nke Chọrọ Nlezianya
Ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịgbanwe echiche gị banyere ihe ọ pụtara ịnakwere ọrịa gị. E kwuwerị, ikweta na ị na-arịa ọrịa abụghị ihe na-egosi na i nweghị ihe ịga nke ọma, dị nnọọ ka ọ
na-abụghị ihe na-egosi na onye na-akwọ ụgbọ mmiri enweghị ihe ịga nke ọma ịnakwere eziokwu bụ́ na oké ifufe na-enye ya nsogbu. Kama nke ahụ, ịnakwere ịdị adị nke oké ifufe ahụ na-akpali ya ime ihe. N’otu aka ahụ, ịnakwere ọrịa gị abụghị enweghị ihe ịga nke ọma, kama ọ pụtara “iche ọnọdụ ọhụrụ ihu,” ka otu nwanyị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala kwuru.Ọ bụrụgodị na ike ọkpụkpụ aka gị ebelatala, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ichetara onwe gị na ọ dịchaghị mkpa ka nke a metụta ọdịdị nke mmetụta uche na nke ime mmụọ gị. Dị ka ihe atụ, ị̀ ka nwere ọgụgụ isi na ike ịhazi ihe na iche echiche? Ikekwe ị ka na-amụmụ ezi ọnụ ọchị, na-eche banyere ndị ọzọ, ma nwee ike nke ịbụ onye na-ege ntị nke ọma na ezi enyi. Nke kasịkwa mkpa, ị ka nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ.
Ọzọkwa, buru n’uche na ọ bụ ezie na ị pụghị ịgbanwe ọnọdụ gị nile, ị ka pụrụ ikpebi otú ị ga-esi na-emeghachi omume n’ebe ha dị. Irene Pollin nke Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ọrịa Cancer na-ekwu, sị: “Ọ bụ gị ga-achịkwa otú i si emeghachi omume n’ebe ọrịa gị dị. I nwere ike a n’agbanyeghị otú ọrịa si na-arịa gị.” Helen, bụ́ nwanyị dị afọ 70 nke na-arịa ọrịa multiple sclerosis nọteworo aka na-akwado nke a, sị: “Ọ bụchaghị ọrịa gị kama ọ bụ mmeghachi omume gị n’ebe ọrịa gị dị na-ekpebi ma ị̀ ga-enweghachi echiche ziri ezi.” Otu nwoke nke nagideworo ọrụsị ruo ọtụtụ afọ na-ekwu, sị: “Inwe olileanya yiri ihe na-eme ka ụgbọ mmiri ghara ikpu.” N’ezie, Ilu 18:14 na-ekwu, sị: “Mmụọ mmadụ ga-anagide ọrịa ya; ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu, ònye ga-eburu ya?”
Inweta Onwe Gị
Ka ị na-enweghachi ike mmetụta uche ziri ezi, ajụjụ dị ka ‘Ebe ọ bụ na ihe a mere m, gịnị ka m ga-eme banyere ya?’ pụrụ ịnọchi ajụjụ ndị dị ka ‘N’ihi gịnị ka ihe a ji mee m?’ N’oge a, ị pụrụ ịhọrọ ime ihe ndị ọzọ iji mee ka ọnọdụ gị ugbu a ka mma. Ka anyị tụlee ole na ole.
Tụlee ọnọdụ gị, chee banyere ihe dị gị mkpa ịgbanwe, mgbe ahụ chọọ ụzọ isi gbanwee ihe ga-ekwe mgbanwe. “Ọrịa gị bụ oge ịtụleghachi ndụ—oge ime ihe, ọ bụghị ngwụsị olileanya,” ka Dr. Spiegel na-ekwu. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị dị m mkpa tupu m rịawa ọrịa? Olee otú nke a siworo gbanwee?’ Jụọ ajụjụ ndị dị otú ahụ, ọ bụghị iji chọpụta ihe i na-enweghịzi ike ime, kama iji chọpụta ihe ị ka pụrụ ime, ikekwe site n’ime ihe n’ụzọ dị iche. Were dị ka ihe atụ, Helen, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite.
Eri afọ 25 gara aga, ọrịa multiple sclerosis emewo ka uru ahụ ya bụrụ nke na-esikwaghị ike. Na mbụ, ọ na-eji mkpara aga ije. Ka e mesịrị, mgbe ọ na-enweghịzi ike ịchịkwa aka nri ya, ọ malitere iji aka ekpe ya eme ihe. Mgbe nke ahụ gasịrị, aka ekpe ya enweghịzi ike ime ihe. N’ikpeazụ, ihe Matiu 28:19, 20) Helen na-akọwa otú o si eme ya, sị:
dị ka afọ asatọ gara aga, o nweghịzi ike ịga ije. Ọ dị ya mkpa ugbu a ka ndị ọzọ na-asa ya ahụ, na-enye ya nri, ma na-eyiwe ya ákwà. Nke a na-eme ya obi ọjọọ, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ekwu, sị: “Ụkpụrụ nduzi m ka bụ, ‘Chee banyere ihe ị pụrụ ime, ọ bụghịkwa ihe ị na-emebu.’” Sitekwa n’enyemaka di ya na nke ndị nọọsụ na-abịa eleta ya nakwa ihe ụfọdụ ọ na-echepụta n’onwe ya, ọ na-ejisi ike anọgide na-eme ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ na-eme mgbe nile. Dị ka ihe atụ, ikwusa nkwa Bible kwere maka ụwa ọhụrụ nke udo gaje ịbịa abụrụwo ihe o ji akpọrọ ihe ná ndụ ya kemgbe ọ dị afọ 11, ọ ka na-emekwa nke a taa kwa izu. (“M na-agwa onye nọọsụ na-abịa eleta m ka o jidere m akwụkwọ akụkọ. Anyị na-agụkọ ịma ọkwa ndị metụtara ọnwụ mmadụ ọnụ ma họrọ ụfọdụ n’ime ha. Mgbe ahụ m na-agwa nọọsụ ahụ ihe ndị m ga-achọ ka e denye n’akwụkwọ ozi m ga-edere ndị ikwu nke onye ahụ nwụrụ anwụ, nọọsụ ahụ na-ejikwa ígwè typewriter ede akwụkwọ ozi ahụ. M na-ezigakọta akwụkwọ ozi ahụ na broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, * bụ́ nke na-akọwa olileanya na-akasi obi nke Bible na-enye maka mbilite n’ọnwụ. M na-eme nke a n’ehihie Sunday ọ bụla. Ọ na-eme m obi ụtọ na m ka pụrụ ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke.”
Na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha bụ́kwa ndị ị pụrụ iru. Otu ihe mere Helen ji na-agbalị ịgbanwe ihe ga-ekwe mgbanwe bụ n’ihi na ọ na-eme ka o nwee ike isetịpụ ma ruo ihe mgbaru ọsọ dị iche iche. Nke a dịkwa gị mkpa. N’ihi gịnị? N’ihi na isetịpụ ihe mgbaru ọsọ na-eme ka ị na-echeta ọdịnihu, iru ihe mgbaru ọsọ na-emekwa ka i nwee afọ ojuju n’ihe ị rụzuru. Ọ pụkwara ime ka i nweghachi obi ike onwe onye i nweburu. Otú ọ dị, jide n’aka na ị na-akapị ihe mgbaru ọsọ ị na-esetịpụ ọnụ. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ikpebi, sị: ‘M ga-agụ otu isiakwụkwọ nke Bible taa.’ Ọzọkwa, setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ị ga-eru. Ebe ọ bụ na mmetụta anụ ahụ gị na nke uche gị dị iche na nke ndị ọzọ na-arịa ọrịa ndị na-adịte aka, ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị enwe ike iru otu ihe mgbaru ọsọ ahụ ha pụrụ iru.—Ndị Galetia 6:4.
“N’agbanyeghị ókè ihe mgbaru ọsọ pụrụ iyiru nke na-ehighị nne, iru ya na-akwali gị imekwu ihe,” ka Lex, bụ́ onye bi na Netherlands, na-ekwu. N’ihe karịrị afọ 20 gara aga, mgbe ọ
dị afọ 23, o nwere ihe mberede nke kpataara ya ahụ mkpọnwụ. N’oge ọtụtụ usoro ọgwụgwọ mmega ahụ ndị sochirinụ, a gbara ya ume isetịpụ ihe mgbaru ọsọ dị iche iche, dị ka iji ákwà asa ihu ya. Ọ bụ ihe na-agwụ ike ime, ma o nwere ihe ịga nke ọma. Mgbe ọ chọpụtara na ya ejisiwo ike ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ, o setịpụrụ ọzọ—iji aka ya na-ekwughe ma na-ekwuchi ihe e ji asa ezé. Ọzọkwa, o nwere ihe ịga nke ọma. “Ọ bụ ezie na ọ dịghị mfe,” ka Lex na-ekwu, “achọpụtara m na enwere m ike ime karịa otú m chere na m pụrụ ime.”N’ezie, site ná nkwado nke nwunye ya, bụ́ Tineke, Lex ruru ihe mgbaru ọsọ ndị ka ukwuu. Dị ka ihe atụ, ọ na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ ugbu a iji soro ndị ọzọ na-ekerịta ihe ọmụma Bible ka Tineke na-esonyere ya ma na-akwagharị ya n’oche nkwagharị. Ọ na-emekwa nleta kwa izu iji gbaa otu nwoke nwere nnukwu ọrụsị ume bụ́ onye ọ na-amụrụ Bible. “Inyere ndị ọzọ aka,” ka Lex na-ekwu, “na-enye m afọ ojuju dị ukwuu.” Dị ka Bible na-akwado, “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Ị̀ pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ iji nyere ndị ọzọ aka? Ịbụ onye na-arịa ọrịa ma ọ bụ onye nwere nsogbu pụrụ inyere gị aka ịbụ onye nkasi obi nwere nnọọ nkà n’ihi na nsogbu gị na-eme ka ihe mgbu nke ndị ọzọ na-emetụ gị n’ahụ.
Soro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe. Ihe ndị a chọpụtara n’ọmụmụ nkà ọgwụ na-egosi na isoro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe dị mma maka ahụ ike gị. Ma emeghị otú ahụ adịghị mma maka ahụ ike gị. “Njikọ dị n’etiti ikewapụ onwe onye n’ebe ndị ọzọ nọ na ọnwụ siri . . . ike ka njikọ dị n’etiti ise siga . . . na ọnwụ,” ka otu onye nchọpụta na-ekwu. O kwukwara, sị: “Ọ pụrụ ịdị ahụ ike gị mkpa ka mmekọrịta gị na ndị ọzọ ka mma dị ka ọ dị mkpa ịkwụsị ise siga.” Ka a sịkwa ihe mere o ji kwubie na nkà anyị n’iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe “bara uru maka ndụ”!—Ilu 18:1.
Otú ọ dị, dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, nsogbu dịnụ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime ndị enyi gị akwụsịwo ileta gị. Maka ọdịmma nke gị, ọ dị gị mkpa ịkwụsị nkewapụ ị na-ekewapụwanye onwe gị. Ma n’ụzọ dị aṅaa? Ị pụrụ ịmalite site n’ịgwa ndị enyi gị ka ha bịa leta gị.
Na-eme ka nleta a na-eleta gị bụrụ ahụmahụ dị ụtọ. * Ị pụrụ ime otú ahụ site n’ịkpa ókè n’ihe ndị ị na-ekwu banyere ọrịa gị ka ike ịnụ banyere ha ghara ịgwụ ndị na-eleta gị. Otu nwanyị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala gwọrọ nsogbu a site n’ibelata mkparịta ụka ya na di ya na-enwe banyere ọrịa ya. “Anyị aghaghị ịkpara nnọọ nke a ókè,” ka ọ na-ekwu. N’eziokwu, ọ dịghị mkpa ka ọrịa gị gbochie ihe ọ bụla ọzọ ị pụrụ ikwu. Mgbe otu onye sosịịrị enyi ya na-adịghị esi n’àkwà ebili bụ́ onye ọ gara ileta kwurịta banyere nkà, akụkọ ihe mere eme, na ihe ndị mere o ji nwee okwukwe na Jehova Chineke, o kwuru, sị: “O kwebeghị ka ọrịa ya karịa ya. Ọ bụ ihe magburu onwe ya iso ya kwurịta okwu.”
Inwe àgwà ịchị ọchị ga-emekwa ka ọ na-amasị ndị enyi gị ịbịa na nke gị. E wezụga nke a, ịchị ọchị ga-abara gị uru. “Àgwà ịchị ọchị ga-enyere gị aka ịnagide ihe n’ime ọtụtụ ọnọdụ,” ka otu nwoke na-arịa ọrịa Parkinson kwuru. N’ezie, ịchị ọchị pụrụ ịbụ ezigbo ọgwụ. Ilu 17:22 na-ekwu, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ dị mma.” Ọbụna minit ole na ole ị chịrị ọchị ga-emezi gị ahụ. Ọzọkwa, “n’adịghị ka ụfọdụ ihe ngwọta ndị ọzọ anyị na-anwale, ịchị ọchị adịtụghị ize ndụ, o nweghị nsí, ọ na-enyekwa ọṅụ,” ka Susan Milstrey Wells na-ede akwụkwọ, bụ́ onye na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala n’onwe ya, kwuru. “Nanị ihe anyị na-agakwaghị enwe bụ obi ọjọọ.”
Chọta ụzọ ndị ị ga-esi na-ebelata nchekasị. Nnyocha ndị e mere na-akwado na nchekasị pụrụ ime ka mgbaàmà ndị a na-ahụ anya nke ọrịa ka njọ, ebe ibelata nchekasị na-enye aka eme ka e nwee ike ịnagide ha. N’ihi ya, na-eme mgbanwe site n’oge ruo n’oge. (Eklisiastis 3:1, 4) Ekwela ka ọrịa gị bụrụ nanị ihe ị ga na-eche ná ndụ. Ọ bụrụ na ị dịghị esi n’ụlọ apụta, ị pụrụ ịgbalị ibelata nchekasị ị na-enwe site n’ige egwú dị jụụ, ịgụ akwụkwọ, ịsa ahụ ruo ogologo oge, ide akwụkwọ ozi ma ọ bụ abụ uri, ise ihe, ịkpọ ngwá egwú, ịgwa enyi gị ị tụkwasịrị obi okwu, ma ọ bụ ime ihe omume ndị yiri ha. Ime otú ahụ agaghị eme ka ị gwọta nsogbu gị kpam kpam, ma ọ pụrụ ime ka i nweretụ onwe gị ruo nwa oge.
Ọ bụrụ na ị pụrụ ịgagharị agagharị, na-aga ije, na-aga ahịa, na-aga ugbo, na-anya ụgbọala ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, na-aga ezumike. N’eziokwu, ime njem pụrụ isi ike karị n’ihi ọrịa gị, ma site n’ime nkwadebe tupu oge eruo nakwa iji echiche eme ihe, ị pụrụ imeri ihe mgbochi dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Lex na Tineke, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha ná mmalite, jisiri ike gaa mba ọzọ. “Ahụ erughị m ala ná mmalite,” ka Lex na-ekwu, “ma anyị nụrụ ụtọ ezumike ahụ!” N’ezie, ọrịa gị pụrụ ịbụ akụkụ ndụ gị, ma o kwesịghị ịchịkwa ndụ gị.
Na-enweta ume site n’okwukwe. Ezi ndị Kraịst bụ́ ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịnagide oké nsogbu na-ekwu na ọ bụ okwukwe ha nwere n’ebe Jehova Chineke nọ nakwa mkpakọrịta ha na ọgbakọ ndị Kraịst na-enwe na-enyekarị ha nkasi obi na ume. * Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ihe ha kwuru banyere abamuru nke ikpe ekpere, ịmụ Bible, ịtụgharị uche banyere ọdịnihu, na ịga nzukọ ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
● “Mgbe ụfọdụ, m ka na-ada mbà n’obi. Mgbe nke a mere, m na-ekpeku Jehova ekpere, ọ na-emekwa ka m kpebisie ike ọzọ ịnọgide na-eme ihe m nwere ike ime.”—Abụ Ọma 55:22; Luk 11:13.
● “Ịgụ Bible na ịtụgharị uche n’ihe m na-agụ na-enyere m aka nke ukwuu ịnọgide na-enwe obi iru ala.”—Abụ Ọma 63:6; 77:11, 12.
● “Ọmụmụ Bible na-echetara m na ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie ka dị n’ihu nakwa na agaghị m enwe ọrụsị ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 35:5, 6; Mkpughe 21:3, 4.
● “Inwe okwukwe n’ọdịnihu e kwere nkwa ya na Bible na-enye m ume iji nagide nsogbu nke ndụ ka ụbọchị na-aga.”—Matiu 6:33, 34; Ndị Rom 12:12.
● “Ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ka uche m dị n’ihe ndị na-agba ume, ọ bụghịkwa n’ọrịa m.”—Abụ Ọma 26:12; 27:4.
● “Mkpakọrịta na-agba ume nke mụ na ndị nọ n’ọgbakọ na-enye m obi ụtọ.”—Ọrụ 28:15.
Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova dị mma, Ọ bụ ebe e wusiri ike n’ụbọchị ahụhụ; Ọ bụkwa onye na-ama ndị na-agbaba n’ime Ya.” (Nehum 1:7) Iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya na iso ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọrịta bụ ihe ndị na-enye nkasi obi na ume.—Ndị Rom 1:11, 12; 2 Ndị Kọrint 1:3; 4:7.
Nye Onwe Gị Oge
Inwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọria siri ike ị na-arịa ma ọ bụ ọrụsị i nwere bụ ihe “a ga-eme ruo ogologo oge, ọ bụghịkwa nke a ga-eme na mberede,” ka onye ọrụ ebere bụ́ onye na-enyere ndị mmadụ aka ịnagide mmetụta nke ọrịa na-adịte aka na-ekwu. Nye onwe gị oge, ka ọkachamara ọzọ na-adụ ọdụ ya, n’ihi na ị na-amụ “nkà ị na-enwetụbeghị: ịnagide ọrịa siri ike.” Mara na n’agbanyeghị na i nwere nchekwube, ọ pụrụ ịdị ụbọchị ma ọ bụ izu obi na-agaghị adị gị mma bụ́ mgbe mmetụta nke ọrịa gị ga-eme ka ike gwụ gị. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ị pụrụ inwe ọganihu. Nke ahụ bụ ihe mere otu nwanyị, bụ́ onye kwuru, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ mgbe m chetara na anọchawo m otu ụbọchị dum n’echetụdịghị banyere ọrịa cancer. . . . N’oge ụfọdụ gara aga, ọ dịghị mgbe m gaara eche na ọ ga-ekwe omume.”
N’ezie, ozugbo ị tụsịrị egwu ná mmalite ma setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ọhụrụ, ọ pụrụ iju gị anya ịhụ ókè ị ga-enweru ike ịtachi obi—dị ka isiokwu na-esonụ na-egosi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 17 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
^ par. 24 N’ezie, aro ndị a tụrụ banyere ụzọ isi na-emeso ndị bịara ileta gị na-emetụta ọbụna karịsịa ụzọ i si emeso onye òtù ọlụlụ gị, ụmụ gị, ma ọ bụ onye na-elekọta gị.
^ par. 28 Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ ihe ndị a chọpụtara n’ọmụmụ nkà ọgwụ egosiwo na okwukwe na-akwalite ahụ ike na ọdịmma. Dị ka Prọfesọ Dale Matthews nke Ngalaba Nkà Ọgwụ na Mahadum Georgetown si kwuo, “e gosiwo na okwukwe nwere abamuru.”
[Foto dị na peeji nke 19]
Ịmara banyere ọrịa gị pụrụ inyere gị aka ịnagide ya
[Foto dị na peeji nke 20]
Site n’enyemaka nke ndị ọzọ, Helen na-ede akwụkwọ ozi ndị na-agba ume
[Foto dị na peeji nke 20]
“Ọ na-eme m obi ụtọ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke”
[Foto ndị dị na peeji nke 21]
“Achọpụtara m na ọ bụ ezie na m nwere ahụ mkpọnwụ, enwere m ike ime karịa otú m chere na m pụrụ ime.”—Lex