Ndị Tọrọ Atọ n’Alụmdi na Nwunye Ịhụnanya Kọrọ
Ndị Tọrọ Atọ n’Alụmdi na Nwunye Ịhụnanya Kọrọ
“N’ọha mmadụ nwere oké ịgba alụkwaghịm, ọ bụghị nanị na ọtụtụ alụmdi na nwunye obi ụtọ kọrọ pụrụ itisa n’ịgba alụkwaghịm, kamakwa, ọtụtụ alụmdi na nwunye pụrụ ịghọ ndị obi ụtọ kọrọ.”—KANSỤL NA-AHỤ MAKA EZINỤLỌ N’AMERICA.
E KWUWO na ihe ka ukwuu n’obi ụtọ na nhụsianya nke ndụ na-esite n’otu ebe—alụmdi na nwunye mmadụ. N’ezie, ọ bụ ihe ole na ole ná ndụ pụrụ ịkpata oké ọṅụ—ma ọ bụ nhụjuanya dị ka ya. Dị ka igbe dị n’isiokwu a na-egosi, ọtụtụ di na nwunye na-enwe nke ikpeazụ ahụ gabiga ókè.
Ma ndekọ ọnụ ọgụgụ nke ndị na-agba alụkwaghịm na-egosi nanị otu akụkụ nke nsogbu ahụ. Maka alụmdi na nwunye ọ bụla tisaranụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-etisaghị etisa ma nọrọ ná nsogbu. “Ezinụlọ anyị nweburu obi ụtọ, ma afọ 12 gara aga adịtụghị mma,” ka otu nwanyị lụrụ di eri ihe karịrị afọ 30 kọrọ. “Di m enweghị mmasị ná mmetụta m. N’ezie, ọ bụ ya kasị bụrụ onye iro m n’ụzọ mmetụta uche.” N’otu aka ahụ, otu onye bụworo di ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 25, kwara arịrị, sị: “Nwunye m agwawo m na ya ahụghịzi m n’anya. Ọ na-ekwu na ọ bụrụ nanị na anyị pụrụ ibikọ ọnụ n’otu ọnụ ụlọ, onye ọ bụla ana-agakwara onwe ya n’oge ntụrụndụ, a pụrụ ịnagide ọnọdụ a.”
Otú ọ dị, ndị ụfọdụ bụ́ ndị nọ n’ajọ nsogbu dị otú ahụ, na-etisa alụmdi na nwunye ha. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị, ịgba alụkwaghịm abụtụghị ihe ha ga-eme. N’ihi gịnị? Dị ka Dr. Karen Kayser si kwuo, ihe ndị dị ka ụmụ, ihe ihere ọ bụ n’anya obodo, ego, ndị enyi, ndị ikwu, na nkwenkwe okpukpe pụrụ ime ka di na nwunye nọgide na-ebi, ọbụna n’ọnọdụ ịhụnanya kọrọ. “Ebe ọ na-eyighị ka ha ga-agba alụkwaghịm n’ụzọ iwu kwadoro,” ka ọ na-ekwu, “di ma ọ bụ nwunye ndị a na-ekwe ka ha na onye òtù ọlụlụ ha gbara alụkwaghịm n’obi ha, nọgide na-ebi.”
Di na nwunye mmekọrịta ha mebiworo hà ga-anọrịrị na-ebi ndụ na-adịghị enye afọ ojuju? Alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ ọ̀ bụ nanị ihe a ga-eji dochie ịgba alụkwaghịm? Ahụmahụ na-egosi na a pụrụ ịzọpụta ọtụtụ alụmdi na nwunye nwere nsogbu—ọ bụghị nanị pụọ n’oké ihe mgbu nke nkewa kamakwa pụọ ná nhụsianya nke ụkọ ịhụnanya.
[Igbe dị na peeji nke 3]
ỊGBA ALỤKWAGHỊM N’ỤWA NILE
• Australia: Ọ fọrọ nke nta ka ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm jiri okpukpu anọ rịa elu eri mmalite afọ ndị 1960.
• Britain: Dị ka e kwuru, alụmdi na nwunye 4 n’ime 10 ga-etisa n’ịgba alụkwaghịm.
• Canada na Japan: Ịgba alụkwaghịm na-emetụta ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke alụmdi na nwunye.
• United States: Kemgbe 1970, ndị na-alụ di na nwunye nwere ohere dị nanị pasent 50 nke inwe ike ibikọ na pasent 50 nke enweghị ike ịnọgide na-ebikọ.
• Zimbabwe: Ịgba alụkwaghịm na-etisa ihe dị ka alụmdi na nwunye 2 n’ime 5 ọ bụla.