Ịchọ Ahụ Mma—Mkpa Ọ Dị Iji Ezi Uche Mee Ihe
Echiche nke Bible
Ịchọ Ahụ Mma—Mkpa Ọ Dị Iji Ezi Uche Mee Ihe
“NGANGA na-emebi ezi uche,” ka onye France na-ede akwụkwọ ọgụgụ dere. N’ezie, ezi uche adịghị n’ọtụtụ n’ime ihe ụmụ mmadụ meworo onwe ha kemgbe ọtụtụ narị afọ n’ihi nganga. Dị ka ihe atụ, n’ịgba mbọ ka úkwù ha pee mpe ruo n’ókè o kwere mee, ndị inyom biri na narị afọ nke 19 na-eyi ihe oyiyi na-akpagide ha n’ahụ n’ụzọ na-afụ ụfụ ruo mgbe o siiri ha ike iku ume. Ụfọdụ kwuru na úkwù ha pere mpe ruo milimita 325. Ihe oyiyi ahụ na-akpagidesi ụfọdụ ndị inyom ike nke na ọgịrịga ha banyere n’imeju ha, na-akpatara ha ọnwụ.
Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe obi ụtọ na ejiji ahụ wuru ewu alaala, nganga kpatara ya ka dị taa dị ka ọ dị mgbe ahụ. Ndị ikom na ndị inyom na-eme ihe ndị siri ike, ọbụna dị ize ndụ, iji gbanwee ọdịdị ahụ ha bu pụta ụwa. Dị ka ihe atụ, ụlọ ebe ndị a na-egbunye akara n’ahụ ma na-akpọpu akụkụ ahụ, nke bụbu ebe nanị ndị ajọ mmadụ na-agachi anya, na-emepesị n’ebe azụmahịa na n’ógbè dị iche iche. N’eziokwu, n’otu afọ na-adịbeghị anya gara aga, igbunye akara n’ahụ bụ ọrụ achụmnta ego nke isii kasị gaa agaa na United States.
Ụdị ịchọ ahụ mma gabigara ókè karị na-arịwanyekwa elu, karịsịa n’etiti ndị na-eto eto. Ịkpọpu akụkụ ahụ dị iche iche—gụnyere ọnụ ara, imi, ire, nakwa ọbụna akụkụ ahụ e ji amụ nwa—na-abụwanye nke na-ewu ewu. Nye ndị ụfọdụ, ịkpọpu akụkụ ahụ ndị dị otú ahụ adịkwaghị akpali akpali. Ha na-anwale ihe ndị ka njọ, dị ka iji ígwè ọkụ adanye akara n’ahụ, ibepụ akụkụ ahụ, * na ibewa ahụ, bụ́ ebe a na-etinye ihe n’ime akpụkpọ ahụ iji mee ka o nwee nnukwu oghere ma fụlite elu nke ukwuu.
Ihe Omume Oge Ochie
Ịchọ ahụ mma ma ọ bụ ịgbanwe ihe n’ahụ abụghị ihe ọhụrụ. N’akụkụ ụfọdụ nke Africa, e jiriwo ọdịnala nke igbu egbugbu na ịka ihe n’ahụ mara òtù ezinụlọ ma ọ bụ ebo dị iche iche ruo ọtụtụ narị afọ. Ọ dị mma ịmara na n’ọtụtụ n’ime ala ndị a, a na-ele ụdị omume ndị ahụ anya ọjọọ ugbu a, ha na-ebelatakwa.
Ịka ihe n’ahụ, ịkpọpu akụkụ ahụ, na ibewa ahụ dịrị n’oge Bible. Ọ na-abụkarị mba ndị na-ekpere arụsị na-eme ha n’ihi okpukpe ha. O kwere nghọta na Jehova gbochiri ndị ya, bụ́ ndị Juu, iṅomi ndị ahụ na-ekpere arụsị. (Levitikọs 19:28) Dị ka “ihe nke aka” Chineke, e si otú a chebe ndị Juu pụọ n’omume okpukpe ụgha rụrụ arụ.—Deuterọnọmi 14:2.
Nnwere Onwe nke Ndị Kraịst
Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mosis, ọ bụ ezie na o setịpụrụ ụkpụrụ ụfọdụ e ji eme ihe n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Ndị Kọlọsi 2:14) N’ihi nke ahụ, ha nweere onwe ha ịhọrọ ime ihe kwesịrị ekwesị n’ihe metụtara ụdị ihe ịchọ mma ha na-ahọrọ. (Ndị Galetia 5:1; 1 Timoti 2:9, 10) Otú ọ dị, nnwere onwe a bụ nke a kpaara ókè.—1 Pita 2:16.
Pọl dere ná 1 Ndị Kọrint 6:12, sị: “Ihe nile ziiri m ezi n’iwu; ma ọ bụghị ihe nile na-abara m uru.” Pọl ghọtara na nnwere onwe ya dị ka onye Kraịst enyeghị ya ikike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ n’echebaraghị ndị ọzọ echiche. Ịhụnanya maka ndị ọzọ metụtara omume ya. (Ndị Galetia 5:13) “Unu nile n’otu n’otu elela ihe nke aka unu anya,” ka ọ dụrụ n’ọdụ, “kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.” (Ndị Filipaị 2:4) Echiche ya nke na-egosi achọghị ọdịmma onwe onye bụ ihe nlereanya magburu onwe ya nye onye Kraịst ọ bụla na-eche echiche banyere ụdị ọ bụla nke ịchọ ahụ mma.
Ụkpụrụ Bible Ndị E Kwesịrị Ịtụle
Otu n’ime iwu ndị e nyere ndị Kraịst bụ ikwusa na ịkụzi ozi ọma ahụ. (Matiu 28:19, 20; Ndị Filipaị 2:15) Onye Kraịst agaghị achọ ka ihe ọ bụla, tinyere ọdịdị ahụ ya, dọpụ uche ndị ọzọ n’ige ntị n’ozi ahụ.—2 Ndị Kọrint 4:2.
Ọ bụ ezie na ụdị ịchọ mma ndị dị ka ịkpọpu akụkụ ahụ ma ọ bụ ịka ihe n’ahụ pụrụ ịdị na-ewuru ụfọdụ ndị, ọ dị onye Kraịst mkpa ịjụ onwe ya, sị, ‘Olee ụdị mmeghachi omume ịchọ mma dị otú ahụ ga-akpalite n’ógbè m bi? À ga-ele m anya dị ka onye so ná ndị ndụ ha na-edoghị anya n’obodo? Ọ bụrụgodị na akọ na uche m ga-anabata ya, olee mmetụta ịkpọpu akụkụ ahụ m ma ọ bụ ịka ihe n’ahụ m ga-enwe n’ebe ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nọ? Hà ga-ele ya anya dị ka ihe àmà nke “mmụọ nke ụwa”? Ọ̀ pụrụ ime ka e nyowe inwe “uche zuru okè” m enyowe?’—1 Ndị Kọrint 2:12; 10:29-32; Taịtọs 2:12.
Ụdị ụfọdụ nke ịgbanwe ihe n’ahụ mmadụ na-akpata oké ihe ize ndụ ndị ga-achọ ọgwụgwọ. E kwuwo na iji ntụtụ na-adịghị ọcha aka ihe n’ahụ so na-agbasa ịba ọcha n’anya na nje HIV. Mgbe ụfọdụ ágbá nteji e jiri mee ihe na-akpata ọrịa akpụkpọ ahụ. Ịkpọpu akụkụ ahụ pụrụ iwe ọtụtụ ọnwa tupu ọ laa, ọ pụkwara ịdị na-afụ ụfụ n’ihe ka ukwuu n’ime oge ahụ. Ha pụkwara ịkpata nsí ịba mmadụ n’ọbara, oké ọbara ọgbụgba, mkpụkọ ọbara, mmebi akwara, na ajọ ọrịa ndị na-efe efe. Ọzọkwa, usoro ụfọdụ anaghị adị mfe mgbanwe. Dị ka ihe atụ, na-adabere n’otú akara e gbunyere n’ahụ hà nakwa otú ọ na-acha, ọ pụrụ ịchọ ọgwụgwọ na-afụ ụfụ, na-efu oké ego, nke a ga-anara ugboro ugboro, nke e ji ígwè laser enye iji wepụ ya. Ịkpọpu akụkụ ahụ pụrụ ime ka mmadụ nwee àpà ga-adịgide oge ndụ ya nile.
Ma mmadụ ọ̀ ga-anakwere ihe ize ndụ ndị a ma ọ bụ na ọ gaghị anakwere ha bụ mkpebi onwe onye. Ma onye na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na-amata na ịbụ onye Kraịst na-agụnye mmadụ iji onwe ya nyefee Chineke. Ahụ anyị bụ àjà dị ndụ e chere n’ihu Chineke ka o jiri mee ihe. (Ndị Rom 12:1) Ya mere, ndị Kraịst tozuru okè adịghị ele ahụ ha anya dị ka ihe onwunwe nke aka ha, nke ha ga-emebi ma ọ bụ megharịa ọdịdị ya otú ha si chọọ. Karịsịa e ji inwe anya udo, uche zuru okè, na ezi uche mara ndị ruru eru ibute ụzọ n’ọgbakọ.—1 Timoti 3:2, 3.
Ịzụlite na iji ike nke uche e ji Bible zụọ eme ihe ga-enyere ndị Kraịst aka izere omume gabigara ókè nke ụwa a nke inwe mmasị n’inwe ahụ ụfụ, bụ́ nke ‘e kewapụrụ n’ụzọ olileanya na-adịghị na ya n’ebe ndụ nke Chineke dị.’ (Ndị Efesọs 4:18) Ha pụrụ isi otú a mee ka inwe ezi uche ha bụrụ nke mmadụ nile maara.—Ndị Filipaị 4:5, NW.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 E nwere ezi ọdịiche dị n’ibewa ahụ iji gwọọ ọrịa ma ọ bụ ọbụna iji maa mma ile anya na ibewa ahụ ma ọ bụ ibekasị ahụ n’ihi mkpali efu nke ọtụtụ ndị na-eto eto, karịsịa ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma, na-eme. Ibewa na ibekasị ahụ n’ihi mkpali efu dị otú ahụ na-abụkarị mgbaàmà nke oké nchekasị ma ọ bụ ajọ mmetọ mmetụta uche, bụ́ nke pụrụ ịdị mkpa ka onye ọkachamara nye aka na ya.