Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ize Ndụ nke Ịrịọ Maka Mbupụtụ

Ihe Ize Ndụ nke Ịrịọ Maka Mbupụtụ

Ihe Ize Ndụ nke Ịrịọ Maka Mbupụtụ

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’AUSTRALIA

Otu ụbọchị anyanwụ na-achasi ike na 1990, onye Britain bu akpa ndị njem n’azụ, bụ́ Paul Onions dị afọ 24 rịọrọ ka e bupụtụ ya n’Ụzọ Awara Awara Hume, n’ebe ndịda Sydney, Australia. Paul nwere obi ekele mgbe onye ọ na-amaghị kwụsịrị iburu ya. Ọ maghị na ikwe ka o buru ya gaara nnọọ abụrụ ya ọnwụ. *

N’AMAGHỊ ihe ize ndụ dị na ya, Paul nọdụrụ n’oche ihu nke ụgbọala ahụ ma soro onye na-anya ya na-akpa nkata. N’ime minit ole na ole, onye ahụ na-anya ụgbọala bụ́ onye yiri ka o meere ya ihe ọma malitere sesawa ya okwu ma rụsịwa ya ụka. Mgbe ahụ, na mberede onye na-anya ụgbọala ahụ kwụsịrị n’akụkụ ụzọ, na-ekwu na ya chọrọ iwere tepụ egwú n’okpuru oche. O wepụtara, ọ bụghị tepụ, kama égbè—bụ́ nke ọ tụdoro Paul n’obi.

N’aṅaghị ntị n’iwu onye na-anya ụgbọala ahụ nyere ya ka ọ ghara ibili ọtọ, Paul dọpụrụ belt oche ya ngwa ngwa, mapụta n’ụgbọala ahụ, ma jiri ike ya nile gbara ọsọ na-aga n’okporo ụzọ awara awara ahụ. Onye ahụ na-anya ụgbọala jiri ụkwụ chụwa ya, ka ndị ọzọ na-anya ụgbọala na-ahụ ha. N’ikpeazụ ọ chụkwutere ya, jide ya n’ụwe polo ya, dọtuo ya n’ala. N’ịdọgapụ onwe ya, Paul gbaara ọsọ gawa n’ihu ụgbọala na-abịa abịa, nke mere ka onye na-anya ya ụjọ jidere, bụ́ nne bu ụmụ ya, kwụsị. Mgbe Paul rịọrọ ya arịrịọ, nne ahụ kweere ka ọ bata, o wee tinye isi n’ahịrị ụzọ nke ọzọ ma jiri oké ọsọ gbara gawa. Ọ bụ nanị n’ikpeazụ ka a matara onye ahụ wakporo Paul dị ka onye na-egbu ndị mmadụ otu otu nke gburu ndị njem asaa bu akpa n’azụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha dị mmadụ abụọ mgbe ha na-arịọ maka mbupụtụ.

Gịnị mere ndị a ji bụrụ ezigbo anụ oriri nye ogbu mmadụ ahụ? Mgbe a na-ekpe ogbu mmadụ ahụ ikpe, ọkàikpe kwuru, sị; “Nke ọ bụla n’ime ndị ahụ o gburu ka na-eto eto. Ha nọ n’agbata afọ 19 na 22. Nke ọ bụla gara ebe dị anya site n’ụlọ ha, nke na-egosi na a garaghị achọ ha achọ ruo ogologo oge ma ọ bụrụ na ihe ọ bụla emee ha.”

Nnwere Onwe Ịgagharị Agagharị

Ọtụtụ ndị taa na-emeli njem gaa mba ọzọ karịa ka ọ dị nanị n’afọ ole na ole gara aga. Dị ka ihe atụ, n’ime afọ ise, ọnụ ọgụgụ ndị Australia na-aga Esia jiri okpukpu abụọ rịa elu. N’ịbụ ndị na-achọ ahụmahụ ma ọ bụ ịnwale ihe ndị ọhụrụ, ọtụtụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na ndị ntorobịa na-eji ụgbọelu aga ebe ndị dị anya. Ọtụtụ n’ime ndị a na-eme njem na-eme atụmatụ ịrịọ maka mbupụtụ iji ghara imefu nnukwu ego. N’ụzọ dị mwute, n’ọtụtụ ebe n’ụwa, ịrịọ maka mbupụtụ abụkwaghị ụzọ isi eme njem nke na-adọrọ mmasị nakwa nke na-adịchaghị ize ndụ ọ bụbu—nye ndị ahụ na-arịọ ka e bupụtụ ha ma ọ bụ nye ndị na-eburu ha.

A pụghị nnọọ iji mmasị na mkpali maka ime njem dochie anya ezi amamihe. “Inwe oké mmasị n’ime njem na-emekarị ka ndị na-eto eto mewe njem n’adịchaghị njikere maka njem ahụ nakwa n’aghọtachaghị ihe ize ndụ ma ọ bụ ibu ọrụ ndị ha nwere na ya,” ka otu akwụkwọ e dere maka ezinụlọ ndị na-achọ ụmụ ha furu efu na-ekwu.

Akwụkwọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ndị na-eso ìgwè a haziri ahazi, bụ́ ndị nwere nzube ime njem, ma ọ bụ ndị na-aga n’ụzọ ndị e mere ezi atụmatụ isi gaa adịghị efukebe. Ma ọ bụ n’Australia ma ọ bụ ná mba ọzọ, ihe ka n’ọtụtụ ndị a na-emesị were na ha efuola, yiri ka hà bụ ndị na-anyara akpa pụọ n’adịghị njikere imefu nnukwu ego.”

Ma mmadụ ọ̀ rịọrọ maka mbupụtụ ma ọ bụ na ọ rịọghị, ịga ebe ndị a na-emeghị atụmatụ ha—ọ bụ ezie na ọ na-amasị ụfọdụ ndị chọrọ inwere onwe ha—pụrụ ime ka mmadụ bụrụkwuo onye ihe ọjọọ pụrụ ime. Mgbe ndị ikwu na ndị enyi na-amaghị ebe onye njem nọ, ha agaghị enwe ike inyere ya aka n’ụzọ dị ukwuu ma ọ daba n’ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa. Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na e buga onye njem n’ụlọ ọgwụ mgbe ọ na-amaghị onwe ya, ọ dịghịkwa onye nọ n’ụlọ maara ebe ọ nọ?

Izilata Ozi

N’akwụkwọ ya bụ́ Highway to Nowhere, odeakụkọ si Britain bụ́ Richard Shears dere banyere mmadụ asaa na-arịọ maka mbupụtụ bụ́ ndị na-efu efu, ndị “kwụsịrịlarị na mberede iso ezinụlọ na ndị enyi ha ezirịta ozi.” Otú ọ dị, na mbụ ọtụtụ ezinụlọ nwere ike ghara ịma ma ndị ikwu ha hà efuola ka ọ̀ bụ nanị na ha adịghị ezitere ha ozi. Nke a pụrụ ime ka ha ghara ime ka gọọmenti mara ngwa ngwa mgbe ha na-enwetaghị ozi site n’aka ndị ahụ mere njem.

Ọtụtụ mgbe a kwụsịrị mkparịta ụka nke otu n’ime ndị ahụ na-arịọ maka mbupụtụ na ndị mụrụ ya na-enwe na telifon mgbe ego ya gwụrụ. Mgbe ha chọpụtara ihe merenụ, ndị mụrụ ya rịọrọ ezinụlọ dị iche iche ka ha nye nwa ha kaadị a na-eji akpọ òkù fon ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ha ga-eji kpọọ ha n’ụlọ. Ọ bụ ezie na nke a nwere ike ọ garaghị azọpụta ndụ nwa agbọghọ a, ikwurịta okwu mgbe nile pụrụ inyere onye njem aka ọtụtụ mgbe izere, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe, ọzọ imeri ihe isi ike ndị dị nta.

Ọ pụrụ ịbụwo na ndị njem asaa ahụ nwụrụnụ, bụ́ ndị bu akpa n’azụ gụrụ akwụkwọ njem ndị na-ekwu na Australia bụ otu n’ime mba ebe ndị na-arịọ maka mbupụtụ kasị enwe nchebe n’ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ịrịọ maka mbupụtụ maliteghachiri ịbụ ihe ize ndụ nye ndị mmadụ—ọbụna mgbe a dị abụọ na-eme njem, ọbụna kwa ná mba ndị “kasị dị nchebe.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 E kwesịrị ịrịba ama na n’ebe ụfọdụ, iwu megidere ịrịọ maka mbupụtụ.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị mụrụ ụmụ pụrụ izere nchegbu na-enweghị isi site n’inye ụmụ ha kaadị a na-eji akpọ òkù fon ma ọ bụ ihe ndị ọzọ iji kpọọ ha n’ụlọ