Olee Otú Omume Dị Taa?
Olee Otú Omume Dị Taa?
N’otu ụtụtụ, n’April 1999, a kpasuru ọgba aghara n’obodo bụ́ Littleton, dịdewere Denver, Colorado, U.S.A. Ndị ntorobịa abụọ yi kootu ojii banyere na kọleji obodo ahụ ma malite ịgba ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi égbè. Ha gbawakwara bọmbụ. Ụmụ akwụkwọ iri na abụọ na otu onye nkụzi nwụrụ, ihe karịrị mmadụ 20 merụkwara ahụ. Ndị mere mpụ ahụ wetara mgbukpọ ahụ ná njedebe site n’igbu onwe ha. Ha dị nanị afọ 17 na 18 ma kpọọ òtù ụfọdụ ajọ asị.
Ọ DỊ mwute ikwu na ihe atụ ahụ e hotara n’elu abụghị nanị n’ebe ahụ ka o metụrụla. Akwụkwọ akụkọ, redio, na telivishọn na-akọ banyere ihe ndị yiri ya n’ụwa nile. Dị ka Ụlọ Ọrụ America Na-ahụ Maka Ihe Ndekọ Agụmakwụkwọ si kwuo, a kọrọ na e nwere ihe dị ka ihe ike 11,000 e ji ngwá ọgụ mee n’ụlọ akwụkwọ ndị dị n’America na 1997. Na Hamburg, Germany, akụkọ banyere ime ihe ike jiri pasent 10 mụbaa na 1997, pasent 44 nke ndị a na-enyo enyo bụkwa ndị ntorobịa na-erubeghị afọ 21.
A na-ahụkarị nrụrụ aka n’etiti ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọrụ ọchịchị. Otu akụkọ sitere n’aka kọmishọna nke Njikọ nke Mba Ndị Europe (EU), bụ́ Anita Gradin na 1998
kwuru na nrụrụ aka e nwere na EU na 1997 furu ihe dị ka ijeri dollar 1.4. Nke a gụnyere site n’ịkagbu tiketi ndị e nyere ndị ọkwọ ụgbọala dara iwu ruo n’iji ụzọ aghụghọ anara onyinye ego e nyere maka ọrụ ugbo ma ọ bụ ndị EU nyere maka ihe ndị ọzọ. E kwewo ka a na-ebupụ ego buru ibu ná mba ọzọ nakwa ka a na-agba mgbere ngwá agha na ọgwụ ọjọọ, òtù ndị omempụ enyewokwa ndị ọrụ EU aka azụ ka ha mechie ọnụ. Ndị Isi nile nke EU gbara arụkwaghịm na 1999.Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị nọ n’ọkwá ndị dị elu n’ụwa na-aghọ aghụghọ. Otu akụkọ sitere n’aka Ụlọ Ọrụ EU bụ́ nke na-akọ banyere ndị ọrụ iwu na-akwadoghị kwuru na ihe ruru pasent 16 nke ngụkọta ego EU na-enweta n’otu afọ gụnyere ego a na-enweta n’achụmnta ego ndị a na-enwetaraghị akwụkwọ ikike nakwa ndị a na-adịghị akwụ ụgwọ n’isi ha. Na Russia, a kọrọ na ego a na-enweta n’ụzọ iwu na-akwadoghị mejupụtara ihe ruru pasent 50 nke ngụkọta ego nile e nwere. Ọzọkwa, na United States, Òtù Na-enyocha Wayo kwuru na ụlọ ọrụ ndị dị n’America na-atụfu ihe karịrị nnọọ ijeri dollar 400 kwa afọ n’ihi nzuru ndị ọrụ ha na-ezuru ego ma ọ bụ ihe onwunwe ha.
Ọtụtụ ndị na-edina ụmụaka bụ́ ndị na-achọ ịrata obere ụmụaka inwe mmekọahụ iwu na-akwadoghị ejiwo Internet mee ihe. Dị ka otu onye nọ na Sweden bụ́ ọnụ na-ekwuchitere òtù bụ́ Zọpụta Ụmụaka, si kwuo, nchegbu e nwere banyere iji ụmụaka eme ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’Internet anọwo na-aka njọ. Na Norway, òtù a natara ihe ọmụma dị 1,883 na 1997 banyere ebe a na-edebe foto ụmụaka na-akpali agụụ mmekọahụ n’Internet. N’afọ sochiri ya ọnụ ọgụgụ ihe ọmụma ndị dị otú ahụ rịruru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 5,000. E sere ihe ka ukwuu na foto ndị ahụ ná mba ebe gọọmenti ma ọ bụ ndị isi obodo na-apụghị ịchịkwa ihe omume a na-asọ oyi.
Oge Gara Aga Ọ̀ Ka Mma?
Ọtụtụ ndị bụ́ ndị nretọ omume e nwere n’ụwa taa na-awụ akpata oyi n’ahụ pụrụ iji mmasị cheta njikere nke ndị mụrụ ha ma ọ bụ nne na nna ha ochie dị ime ihe ga-abara obodo ha uru n’oge ha. Ikekwe ha anụwo na ndị mmadụ biri ndụ dị nnọọ jụụ karị n’oge ahụ nakwa na e jiri ịkwụwa aka ọtọ na omume ọma ndị ọzọ kpọrọ oké ihe n’akụkụ nile nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ndị meworo okenye pụrụ ikwuworị banyere mgbe ndị na-arụsi ọrụ ike nyeere ibe ha aka, nkekọ ezinụlọ siri ike, ndị ntorobịa anọrọkwa ná nchebe ma nyere ndị mụrụ ha aka n’ugbo ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ.
Nke a na-akpali ajụjụ bụ́: Omume ndị mmadụ ọ̀ ka mma n’oge gara aga n’ezie? Ka ọ̀ bụ nanị na e nwere agụụ nke na-eme ka ihe ndị mere n’oge gara aga anyị na-echeta yie ihe ha na-abụghị? Ka anyị hụ otú ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọzọ na-enyocha ọha mmadụ si zaa ha.
[Igbe dị na peeji nke 3]
A Kọwaa Ihe Omume Pụtara
E jiri okwu bụ́ “omume” mee ihe n’isiokwu ndị a n’ụzọ na-ezo aka n’ụkpụrụ na-ekpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi n’akparamàgwà ụmụ mmadụ. Nke a na-agụnye ịkwụwa aka ọtọ, ikwu eziokwu, na ụkpụrụ omume ndị dị elu n’ihe metụtara mmekọahụ na ihe ndị ọzọ.