ṄOMIE OKWUKWE HA | DEVID
“Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
O NWERE otu ụbọchị ndị agha obodo Devid hà gara agha, rute n’ọgbọ agha, ezigbo ụjọ ejide ha, ha erie mbọ mbọ. Ma, ka ha na-agbaghachi azụ, Devid si n’etiti ha gbara na-aga n’ọgbọ agha. Gịnị menyere ndị agha ahụ ụjọ? Ọ ga-abụrịrị na Devid nụrụ ka ha ji ụjọ na-akpọ aha otu nwoke. Nwoke ahụ gbara ajọ dimkpa. O guzo na ndagwurugwu dị ebe ahụ. O nwekwara ike ịbụ na Devid ahụtụbeghị onye gbara dimkpa ka nwoke ahụ.
Aha nwoke ahụ bụ Golayat. Devid hụrụ ihe mere ụjọ ji na-atụ ndị agha ahụ. Otú Golayat hà n’ogologo na-atụ ụjọ. Ọ bụrụgodị na o yighị uwe agha ya, ọ ga-adị arọ karịa ụmụ nwoke abụọ gbara agba. Ma ugbu a, o yi uwe agha, jirikwa ngwá agha. Ọ lụọla agha ọtụtụ afọ. Ọ bụkwa dike n’agha. Ọ malitere ịma ndị agha Izrel aka. Weregodị ya na ị nọ n’elu ugwu na-anụ ka ọ na-ebigbọ, na-agwa ndị agha Izrel na Sọl bụ́ eze ha, ka ha bịa lusoo ya ọgụ. Ọ nọ na-ama ndị Izrel aka ka ha kpọpụta otu nwoke ka ya na ya chịpụ ya.—1 Samuel 17:4-10.
Ezigbo ụjọ jidere ndị agha Izrel. Eze Sọl mawakwara jijiji. Devid nụrụ na ọ karịala otu ọnwa kemgbe ndị agha Izrel nọ na-atụ ụjọ ibuso Golayat agha. Ma ndị agha ndị Filistia ma ndị agha Izrel nọ nnọọ na-ele ibe ha ka Golayat na-ama ndị Izrel aka ụbọchị ọ bụla. Ihe a Devid nụrụ wutere ya. Devid weere ya na ọ bụ ihe ihere na eze Izrel, ndị agha Izrel na ụmụnne ya atọ ndị tọrọ ya na-atụ ụjọ. Ihe kacha wute Devid abụghị na Golayat na-emenye ndị agha Izrel ihere, kama, ọ bụ na ọ na-akparị Jehova bụ́ Chineke Izrel. Ma, oleekwanụ ihe Devid ka bụ́ nwatakịrị ga-emeli? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’okwukwe Devid?—1 Samuel 17:11-14.
“TEE YA MMANỤ, N’IHI NA Ọ BỤ ONYE A!”
O nwere ihe mere ọtụtụ ọnwa tupu ndị Filistia abịa ibuso ụmụ Izrel agha. Ihe a mere n’otu mgbede Devid nọ n’ugwu dị́ nso na Betlehem na-elekọta ìgwè atụrụ nna ya. Devid nwere ike ịdị ihe dị ka afọ iri na asaa n’oge ahụ. Ọ bụ asa bọbọ, anya ya makwara mma. Ọ na-abụ ya na-elekọta atụrụ, ebe niile daa jii, ya ebido kpọwa ụbọ akwara ya. Ya na-ele ihe ndị Chineke kere, ya ejiri ụbọ akwara ya na-eto Chineke. O megidere ihe a bụrụzie ọkà n’ịgụ egwú na ịkpọ ụbọ akwara. Ná mgbede ahụ Devid nọ na-elekọta atụrụ nna ya, nna ya ziri ozi ka ọ lọta ozugbo.—1 Samuel 16:12.
Mgbe ọ lọrutere, ọ hụrụ Jesi nna ya ka ya na otu agadi nwoke na-ekwu okwu. Aha agadi nwoke ahụ bụ Samuel. Ọ bụ ezigbo onye amụma. Jehova gwara ya ka ọ gaa n’ụlọ Jesi tee otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke mmanụ. Onye ọ ga-ete mmanụ ga-abụ eze ga-anọchi Sọl. Tupu Devid abịarute, Samuel ahụla ụmụnne ya ndị nwoke asaa tọrọ ya, ma, Jehova gwara Samuel na ọ bụghị ha ka ya họọrọ. Mgbe Devid bịarutere, Jehova gwara Samuel, sị: “Tee ya mmanụ, n’ihi na ọ bụ onye a!” Ka ụmụnne Devid ndị nwoke nọ na-ele ihe ga-emenụ, Samuel weere mpi mmanụ nke mmanụ pụrụ iche juru, wụsa Devid mmanụ ahụ n’isi. Si mgbe ahụ gawa, ndụ Devid gbanwere. Baịbụl kwuru, sị: “Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ Devid malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.”—1 Samuel 16:1, 5-11, 13.
1 Samuel 17:34-36; Aịzaya 31:4.
Devid ò bidoro chọsiwe ike ịchị? Mba. Ọ nọ na-echere mgbe mmụọ Jehova ga-eme ka ọ mara na oge eruola ka ọ malite ịchị. Ọ gawakwara na-azụ atụrụ ọ na-azụ. Ọ na-eji obi ya niile arụ ọrụ a. O nwekwara obi ike. E nwere oge ọdụm bịara buru atụrụ n’ìgwè atụrụ nna ya, nweekwa mgbe anụ ọhịa bea bịara buru atụrụ ha. Ihe Devid mere n’oge ndị ahụ abụghị ịnọ n’ebe dị anya na-achọ otú ọ ga-esi achụpụ anụ ọjọọ ndị a. Kama, ọ chụwara ha, kụgbuo ha, ma napụta atụrụ ndị ahụ.—Obere oge ihe ndị a mechara, Eze Sọl ziri ozi ka Devid bịa hụ ya. Ọ nụla akụkọ gbasara ihe ndị Devid mere. Ọ bụ eziokwu na Sọl ka bụ dike n’agha, Jehova anọnyereghịzi ya n’ihi na o nupụụrụ ya isi. Jehova napụrụ Sọl mmụọ nsọ o nyeburu ya. Ọ bụzi mmụọ na-adịghị mma na-achị ya, nke mere na ọ na-ewekarịzi iwe ọkụ, na-enyo onye ọ bụla enyo, na-emekwa ihe ike. Mgbe ọ bụla mmụọ a na-adịghị mma banyere n’ime Sọl, egwú na-eme ka o nweta onwe ya. Ụfọdụ ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya na ha nụrụ na Devid ma akpọ ụbọ akwara nakwa na ọ bụ dike n’agha. Ọ bụ ya mere o ji sị Devid bịa hụ ya. O mechakwara mee Devid otu n’ime ndị na-akụrụ ya egwú n’obí ya, meekwa ya onye na-eburu ya ihe agha.—1 Samuel 15:26-29; 16:14-23.
Ndị na-eto eto karịchaa nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụta n’aka Devid. Otu ihe bụ na o ji oge ndị o ji ezu ike na-amụ gbasara ihe ndị ga-eme ka ya na Jehova dịkwuo ná mma. Ihe ọzọ bụ na o ji nwayọọ nwayọọ mụọ aka ọrụ ndị mere ka e nwee ike iwere ya n’ọrụ. Ma nke kachanụ bụ na o kwere ka mmụọ Jehova na-edu ya. Anyị niile kwesịrị ịmụta ịna-eme ka ya.—Ekliziastis 12:1.
“KA OBI GHARA ỊWỤBA ONYE Ọ BỤLA N’AFỌ”
Mgbe Devid bidoro ịrụ n’obí eze Sọl, ọ na-eme, ya gụrụ gụrụ, ya agaa ụlọ ha gaa lekọta atụrụ nna ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-anọ ọdụ tupu ya alọta. Ọ bụ n’otu n’ime oge ndị ahụ ọ gara ụlọ ha ka Jesi nna ya gwara ya ka ọ gaa lee otú ụmụnne ya atọ so ná ndị agha Sọl mere. Devid mere ihe nna ya gwara ya, kwakọjuo ihe ọ ga-enye ụmụnne ya ndị ahụ, gawa na Ndagwurugwu Ila bụ́ ebe ha nọ n’ọgbọ agha. Ọ bụ mgbe ọ bịarutere ka ihe ahụ anyị kọrọ ná mmalite isiokwu a mere. Ọ hụrụ na ma ndị agha Izrel ma ndị agha Filistia nọcha na-ele ibe ha. Ndị Filistia guzo n’ugwu dị́ n’otu akụkụ nke ndagwurugwu ahụ, ndị Izrel eguzoro n’ugwu dị́ n’akụkụ ya nke ọzọ.—1 Samuel 17:1-3, 15-19.
Ihe a na-emenụ were Devid ezigbo iwe. Ọ ga-abụ na ọ nọ na-ajụ onwe ya ihe mere ndị agha nke Chineke dị ndụ ga-eji na-agbara mmadụ nkịtị ọsọ, nke ka nke, onye na-ekpere arụsị. Devid weere ya na Golayat na-akparị Jehova. O bidoziri jụwa ndị agha nọ ya nso ihe a ga-emere onye meriri Golayat. Mgbe ihe a ọ na-ajụ febara Elayab bụ́ ọkpara nne ya ntị, ya abawara Devid, sị na ihe mere o ji bịa ebe ahụ agwụla ka ọ hụ otú agha na-adị. Ma Devid sịrị ya: “Gịnịkwa ka m mere ugbu a? Ọ́ bụghị naanị okwu ka m kwuru?” Mgbe o kwuchara ihe a, ya atụgharịa gwa ndị agha ndị ọzọ otu ihe ahụ ọ gwara ndị nke mbụ, ruo mgbe mmadụ gwara Sọl ihe ọ nọ na-ekwu. Sọl gwaziri ha ka ha kpọta Devid.—1 Samuel 17:23-31.
Mgbe Devid bịarutere, ọ gwara eze okwu gbara ya ume gbasara Golayat. Ọ gwara ya, sị: “Ka obi ghara ịwụba onye ọ bụla n’afọ.” Obi awụnyela Sọl na ndị agha ya n’afọ kemgbe n’ihi Golayat. Ọ ga-abụ na ha 1 Samuel 17:32.
lewara otú Golayat hà tụwazie ụjọ. Ha weere ya na ọ ga-emeri ha n’otu ntabi anya n’ihi na ọ kagburu ha akagbu, jirikwa ngwá agha. Ma, Devid echeghị otú ahụ. Otú Devid si lee ihe anya dị iche. Ọ bụ ya mere o ji kwuo na ya ga-alụso Golayat agha.—Ma Sọl ekwetaghị. Ọ sịrị: “Ị gaghị enwe ike ịga zute onye Filistia nke a lụso ya ọgụ, n’ihi na ị ka bụ nwata, ma ya onwe ya bụ dike n’agha malite n’oge ọ bụ nwata.” Ma, Devid ọ̀ bụ nwata n’eziokwu? Mba. Ma, o rubeghị ịba amị, ọ ga-abụkwa na ọ dị obere n’anya. Ma, a marala Devid amara ka dike n’agha. O nwekwara ike ịbụ na ọ dị ihe dị ka afọ iri na asaa n’oge ahụ.—1 Samuel 16:18; 17:33.
Devid gwara Sọl gbasara otú o si gbuo ọdụm na anụ ọhịa bea. Devid ò ji ihe a o mere na-etu ọnụ? Mba. Devid ma onye nyeere ya aka igbu anụ ọhịa ndị ahụ. Ọ sịrị: “Jehova, bụ́ onye napụtara m n’aka ọdụm nakwa n’aka anụ ọhịa bea, ọ bụ ya ga-anapụta m n’aka onye Filistia nke a.” Sọl mechara kweta, gwazie Devid, sị: “Gawa, ka Jehova nọnyekwara gị.”—1 Samuel 17:37.
Ị̀ ga-achọ ka okwukwe gị sie ike ka nke Devid? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, i kwesịrị ịghọta na okwukwe Devid adịghị ka ebe mmadụ mụ anya na-arọ nrọ. O nwere okwukwe na Chineke n’ihi na ọ ma ya nke ọma, hụkwa ihe ndị o meerela ya. Ọ ma na Jehova bụ Onye na-echebe ndị ya na Onye na-emezu nkwa ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ụdị okwukwe a, anyị kwesịrị ịnọgide na-amụ banyere Chineke e dere okwu ya na Baịbụl. Ọ bụrụkwa na anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta, ihe ọma ndị anyị ga-enweta ga-emekwa ka okwukwe anyị na-esikwu ike.—Ndị Hibru 11:1.
“JEHOVA GA-ENYEFE GỊ N’AKA M”
Ihe mbụ Sọl mere bụ iyiwe Devid uwe agha nke yanwa na-eyi. O yichara nke ahụ Golayat yi. E ji ọla kọpa mee ya. O nwekwara ike ịbụ na o nwere akpịrịkpa ndị dị n’elu ibe ha. Ma, mgbe Devid chọrọ ịgawa, o nwelighị ike ịga ebe ọ bụla, n’ihi na ihe agha ndị o ji na uwe agha ahụ o yi na-anyị ya arọ. A zụbeghị Devid ka ọ bụrụ onye agha, n’ihi ya, iyi uwe agha amabeghị ya ahụ́, ma ya fọzie iyi uwe agha Sọl, bụ́ onye kacha ndị Izrel niile ogologo. (1 Samuel 9:2) O yipụziri ihe niile ahụ, ma yiri uwe o yi na-elekọta atụrụ gawa.—1 Samuel 17:38-40.
Devid weere mkpara o ji azụ atụrụ, koro akpa ya n’ubu, ma were èbè ya. Mmadụ nwere ike ịna-eche sị: “Oleekwanụ ihe Devid ga-ejili èbè mee? Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-akpa ike dị egwu. Èbè bụ obere akpụkpọ anụ ma ọ bụ obere ákwà nwere oghere e kegidere eriri n’isi ya abụọ. Ndị ọzụzụ atụrụ na-eji ya egbu anụ ndị bịara igbu atụrụ ha. Ha na-ewere nkume tinye n’etiti obere ákwà ahụ, fegharịa ya gburugburu isi ha ma hapụzie otu n’ime eriri abụọ ahụ ka nkume ahụ gbapụ. Nkume ahụ na-efere gaa tụọ n’ihe a chọrọ ka ọ tụọ na ya. N’ihi otú a èbè si akpa ike, a na-enwe ndị agha ụfọdụ a na-azụ ka ha jiri ya lụọ agha mgbe ụfọdụ.
Ozugbo Devid werechaara ihe ndị a, ọ gawara ịlụso onye iro ya ahụ ọgụ. Were ya ugbu a na ị na-ahụ Devid ka ọ na-ekpesi ekpere ike, hulata n’akụkụ iyi ndagwurugwu ahụ, tụtụrụ nkume ise kacha akwọ mụrụmụrụ. Mgbe ọ tụtụtachara nkume ise a, ọ gbaara ọsọ gawa n’ọgbọ agha.
Olee otú obi dị Golayat mgbe ọ hụrụ onye na-abịa ịlụso ya agha? Baịbụl kwuru, sị: “Ọ malitere ileda ya anya n’ihi na ọ bụ nwata, na-achakwa ọbara ọbara ma maa mma ile anya.” Golayat bidoro bawara Devid, sị ya: “M̀ bụ nkịta, mere i ji jiri mkpara na-abịa izute m?” Ọ ga-abụ na Golayat hụrụ mkpara Devid ji, ma ọ hụghị èbè ahụ o ji. O bidoro iji aha chi ndị Filistia na-akọcha Devid. O kwuru na ọ ga-egbu Devid ma were anụ ahụ́ ya nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa.—1 Samuel 17:41-44.
Ma, Devid gwara Golayat, sị: “I ji mma agha na ube na árọ̀ na-abịa izute m, ma m ji aha Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke nke ndị agha Izrel, onye ị maworo aka, na-abịa izute gị.” Ruokwa taa, ndị mmadụ weere ya na ihe a Devid kwuru gosiri na o nwere okwukwe siri ike na Chineke. Devid ma na ike mmadụ na ngwá agha adịghị ezigbo mkpa n’agha ahụ. Ọ ma na Golayat akparịala Jehova, n’ihi ya, Jehova ga-eme ya ihe. Ọ bụ ya mere Devid ji kwuo “na ọ bụ Jehova nwe agha a.”—1 Samuel 17:45-47.
Devid hụrụ na Golayat gbara ajọ dimkpa, hụkwa ngwá agha o ji. Ma, Devid ekweghị ka ihe ndị a menye ya ụjọ. O kweghịkwa ka ha mee ka obi wụnye ya
n’afọ otú o mere Sọl na ndị agha Izrel. Devid ejighị onwe ya tụnyere Golayat. Kama o lere Golayat lee Jehova ma hụ na o nweghị ihe Golayat bụ. Golayat dị ihe dị ka mita atọ n’ogologo. Ọ ka ndị niile ọzọ nọ ebe ahụ ogologo. Ma, Golayat ọ̀ ha ka onye ma e jiri ya tụnyere Ọkaakaa eluigwe na ụwa? N’eziokwu, n’anya Chineke, mmadụ niile dị ka ụkpara. Ọ bụkwa otú ahụ ka Golayat dị n’anya Chineke. Jehova na-agakwa imemila ya.Devid gbaara ọsọ gawa n’ebe onye iro ya ahụ nọ, tinye aka n’akpa ya, wepụta otu nkume, tinye ya n’èbè ya, na-efegharị ya gburugburu isi ya. Golayat bịawara nso ebe Devid nọ, o nwekwara ike ịbụ na ọ nọ nso n’azụ onye bu ọta ukwu ya. E nwere ike ịsị na ogologo Golayat bụụrụ ya nsogbu n’ihi na onye na-eburu ya ọta ukwu agaghị ewelili ọta ahụ elu otú ọ ga-enwe ike igbochi ihe ịtụ Golayat n’isi. Ọ bụkwa ebe ahụ ka Devid chọrọ ịtụ ya nkume ahụ.—1 Samuel 17:41.
Devid gbapụziri nkume ahụ dị́ n’èbè ya, nkume ahụ agawa ebe ọ chọrọ ka ọ tụọ. Jehova mere ka naanị otu nkume ahụ Devid gbapụrụ gbata Golayat ozugbo. Nkume ahụ tụrụ ya n’egedege ihu ma bamie n’egedege ihu ya. Dimkpa ahụ bụ azụ eru ala, dara n’ala, kpuo ihu n’ala. Ọ ga-abụ na ụjọ jidere onye na-eburu ya ọta ukwu, ya agbalaga. Devid gbaara ọsọ bịarute ebe Golayat nọ, mịrị mma agha Golayat, gbupụ ya isi.—1 Samuel 17:48-51.
Sọl na ndị agha ya tiwere mkpu na ha emeriela, katazie obi chụrụ ndị Filistia gawa. Ihe Devid gwara Golayat emeela. Ọ gwara ya, sị: “Jehova . . . ga-enyefekwa unu n’aka anyị.”—1 Samuel 17:47, 52, 53.
Ma, ndị na-efe Chineke taa anaghị alụ agha. Chineke achọghịzi ka ha na-alụ agha. (Matiu 26:52) Ma, anyị ka kwesịrị iṅomi okwukwe Devid. Anyị kwesịrị iwere Jehova otú Devid si were ya. Anyị kwesịkwara ịghọta na Jehova bụ naanị Chi anyị kwesịrị ife ma na-atụ egwu ya. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka nsogbu bịaara anyị hà karịrị anyị, ma o nweghị nsogbu anyị Jehova na-agaghị enweli ike ịnapụta anyị na ya. Ọ bụrụ na anyị ewere Jehova ka Chineke anyị, nwee okwukwe na ya otú Devid nwere, e nweghị nsogbu ọ bụla kwesịrị imenye anyị ụjọ. O nweghị ihe nyịrị Jehova.