Septemba 2-8
ABỤ ỌMA 79-81
Abụ nke 29 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Gosi na Ị Hụrụ Aha Jehova Dị Ebube n’Anya
(Nkeji 10)
Emela ihe ọ bụla ga-eme ka e kwujọọ Jehova (Ọma 79:9; w17.02 9 ¶5)
Na-akpọ aha Jehova (Ọma 80:18; ijwbv 3 ¶4-5)
Jehova na-akwụ ndị na-erubere ya isi maka na ha hụrụ aha ya n’anya ezigbo ụgwọ ọrụ (Ọma 81:13, 16)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Ọma 80:1—Gịnị mere e ji akpọ aha Josef mgbe ụfọdụ ma e kwuwe gbasara ebo niile e nwere n’Izrel? (it-2 111)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 79:1–80:7 (th ihe ọmụmụ nke 10)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(1 nkeji) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
6. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)
7. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye na-ekwebughị ka a mụwara ya Baịbụl ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)
Abụ nke 10
8. “Ha . . . Ga-edo Aha M Nsọ”
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Setan malitere ikwutọ aha Jehova n’ogige Iden. Kemgbe ahụ, ihe kacha mkpa ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi kwesịrị ikpebi bụ ma hà ga-edo aha Jehova nsọ ka ọ̀ bụ na ha agaghị edo ya.
Legodị okpookpo ụgha ole na ole Setan ghagiderela Jehova. O boro ya ebubo na ọ bụ onye ọchịchị aka ike nke na-ahụghị ndị ọ na-achị n’anya. (Jen. 3:1-6; Job 4:18, 19) Ọ na-ekwu na ndị na-efe Jehova ahụghị Jehova n’anya n’eziokwu. (Job 2:4, 5) O meedịla ka ọtụtụ nde mmadụ kweta na ọ bụghị Jehova kere ọmarịcha ihe ndị dị n’ụwa anyị a.—Rom 1:20, 21.
Olee otú obi dị gị maka ụgha ndị ahụ Setan na-agha? Ọ ga-abụ na ha na-eme ka ị chọọ ịgbachitere Jehova. Ọ ma na ndị na-efe ya ga-achọ iso mee ka e doo aha ya nsọ. (I nwere ike ịtụle Aịza. 29:23.) Olee otú ị ga-esi soro mee ya?
-
Nyere ndị ọzọ aka ka ha mata Jehova ma hụ ya n’anya. (Jọn 17:25, 26) Dị njikere igosi na Jehova dị adị, dịkwa njikere ịkụziri ndị ọzọ banyere ọmarịcha àgwà ndị o nwere.—Aịza. 63:7
-
Jiri obi gị niile hụ Jehova n’anya. (Mat. 22:37, 38) Na-erubere iwu ndị Jehova nyere isi, ọ bụghị naanị maka na ha ga-abara gị uru, kama, maka na ị chọrọ ime Jehova obi ụtọ.—Ilu 27:11
Kpọnye VIDIO bụ́ Ka Ịhụnanya Gị Ghara Ịda, Ọ Bụrụgodị na . . . Ndị Gị na Ha Na-agụkọ Akwụkwọ Na-akpa Àgwà Ọjọọ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Olee otú Ariel na Diego si gbachitere aha Jehova?
-
Gịnị mere ha ji chọọ ịgbachitere Jehova?
-
Olee otú i nwere ike isi mee ka ha?
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 14 ¶8-14, igbe 13A