ABỤ NKE 105
“Chineke Bụ Ịhụnanya”
-
1. Chineke hụr’anyị n’anya.
Ọ bụ ya bụị-hụnanya.
K’anyị hụ Chineke n’anya,
Hụ ’madụ niile n’anya.
Ọ g’eme k’anyị dị n’otu.
Ọ g’eme k’anyị dịn-dụ.
N’agbalị n’eṅomi Jizọs.
N’egosi ịhụnanya.
-
2. Eziokwu Chineke g’eme
K’ị mụta ịhụnanya.
Chineke hụrụ gị n’anya.
Ọ g’eme k’ị mụta ya.
Ịhụnanya nwer’obiọma.
Ọ n’edi ihe niile.
K’anyị hụ ụmụnna n’anya.
Jehova g’agọzia-nyị.
-
3. Ekwela k’iwe n’ewe gị.
Ekwela k’o merie gị.
N’amụta iwu Chineke.
Iwu ya ga n’edu gị.
K’anyị hụ Chineke n’anya,
Hụkwan-dị ’madụ n’anya.
N’agbalị n’ahụ ha n’anya.
Chineke bụị-hụnanya.
(Gụọkwa Mak 12:30, 31; 1 Kọr. 12:31–13:8; 1 Jọn 3:23.)