Bịaruo M Nso
Were Ya:
1. Obi dịm ụtọ
Nam so ná ndị Jehova dọtara.
Jehova kam ga n’agwa
Nsogbu niile dịm n’obi.
Ọ n’eme k’obi ruom ala,
Meekwa ka m nwet’ume.
(UKWE)
Ọ sịm: “Bịaruom nso, ruom nso.
M g’abịakwa gịn-so.
M g’edu gị, mee k’ị hụ
N’ị ka bakwara uru.
Biko, bịaruom nso.”
2. Ọ bụ Jehova
Kam n’akpọ m’obim bidokwa mawam ikpe.
M kpe’ekpere kọọrọ ya,
Obi n’abịazi ruom ala.
M cheta na Jehova som,
Ọ n’eme kam dịr’ike.
(UKWE)
Ọ sịm: “Bịaruom nso, ruom nso.
M g’abịakwa gịn-so.
M g’edu gị, mee k’ị hụ
N’ị ka bakwara uru.
Biko, bịaruom nso.”
(AHỊRỊ ỌZỌ)
Mgbem ka nọ n’ọchịchịrị,
O jim kpọrọ ihe.
Ugbua anyị dịzi nám-ma,
M ga n’akpọku ya.
(UKWE)
Ọ sịm: “Bịaruom nso, ruom nso.
M g’abịakwa gịn-so.
M g’edu gị, mee k’ị hụ
N’ị ka bakwara uru
Biko, bịaruom nso.”