Abụ 138
Jehova Bụ Aha Gị
Danloduo ya:
-
Ezi Chi anyị dị ndụ,
Onye ker’ihe niile,
N’ọgbọ niile ọ bụla,
Jehova bụ aha gị.
A’yị nọ n’ọgbakọ gị.
Ọ bụ ih’ùgwù i nyer’anyị.
A’yị n’ekwus’ebube gị
N’ebo dum, ná mba dum.
(KORỌS)
Jehova, Jehova,
Ị bụ Chi pụr’iche.
Ma n’el’igwe ma n’el’ụwa,
I nweghị oyiri.
’Madụ niile g’amara na
Naanị gị bụ Ọkaakaa.
Jehova, Jehova,
Naanị gị bụ Chinek’anyị.
-
Ih’ọ bụl’ị chọrọ
K’ị n’eme k’anyị bụrụ,
Iji mezuo uche gị,
Jehova bụ aha gị.
Anyị bụ Ndịàmà gị.
Ọ bụ ah’ị kpọ r’anyị.
A’yị nwer’obi ụtọ ịbụ
Ndị n’az’aha gị.
(KORỌS)
Jehova, Jehova,
Ị bụ Chi pụr’iche.
Ma n’el’igwe ma n’el’ụwa,
I nweghị oyiri.
’Madụ niile g’amara na
Naanị gị bụ Ọkaakaa.
Jehova, Jehova,
Naanị gị bụ Chinek’anyị.
(Gụọkwa 2 Ihe 6:14; Ọma 72:19; Aịza. 42:8.)