Abụ nke 129
Ijisi Olileanya Anyị Ike
1. Ndị ’madụ nọ n’ọchịchịrị kemgb’ụwa.
Ha n’agbalị n’efu ijide ifufe.
H’emeela k’ezugh’okè ha doo anya:
Ha apụgh’ịzọpụta ’madụ.
(KORỌS)
Jir’ọṅụ bụ’abụ, Al’eze dị nso!
Ọchịchị Ọkpara Jaa g’ewep’ụjọ.
Ọ g’ewepụ ihe ọjọọ n’isi nso;
Olil’any’ahụ n’ewusi any’ike.
2. A’yị n’ekwusa n’ụbọchị Jehova dị nso;
A g’akwụs’ịjụ Chineke, “Ru’ole mgbe?”
Ọ g’eme ka ndị ya kwụsị ịs’ude.
Too Chineke, sor’anyị bụ’abụ.
(KORỌS)
Jir’ọṅụ bụ’abụ, Al’eze dị nso!
Ọchịchị Ọkpara Jaa g’ewep’ụjọ.
Ọ g’ewepụ ihe ọjọọ n’isi nso;
Olil’any’ahụ n’ewusi any’ike.
(Gụọkwa Hab. 1:2, 3; Ọma 27:14; Joel 2:1; Rom 8:22.)