Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Owu Kwụsị Ịna-ama Gị—Ihe Baịbụl Kwuru
Owu na-ama ọtụtụ ndị ebe niile n’ụwa, ha ana-echekwa na ha agaghị emetali ndị ọzọ enyi. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na inyere ndị ọzọ aka bụ otu ụzọ mmadụ nwere ike isi kwụsị owu ịma ya.
Òtù Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike n’Amerịka kwuru, sị: “Inyere ndị nọ ná mkpa aka nwere ike ime ka ndụ anyị nwee isi, ọ na-enyekwara ndị na-eche na owu na-ama ha ma ọ bụ na ha agaghị emetali ndị ọzọ enyi aka ịkwụsị iche otú ahụ.”
Baịbụl kwuru ihe ndị bara uru anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka. Ime ihe ndị o kwuru nwere ike inyere anyị aka ime ka owu kwụsị ịma anyị.
Ihe i nwere ike ime
Na-emesapụ aka. Na-achọ ohere gị na ndị ọzọ ga-eji na-anọrị, karịchaa ihu na ihu. Gbaakwa mbọ na-enyetụ ndị ọzọ ihe ndị i nwere. I mee otú ahụ, ọ ga-abụrịrị na ha ga-ekele gị, gị na ha nweziri ike isi otú ahụ bụrụ enyi.
Ihe Baịbụl kwuru: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.”—Luk 6:38.
Na-emere ndị ọzọ ihe. Na-achọ ohere ị ga-eji nyere ndị ihe na-esiri ike aka. Otu ụzọ i nwere ike isi mee ya bụ iwetu obi gee ha nnọọ ntị ma ọ bụkwanụ iwepụta onwe gị meere ha ihe ga-eme ka ihe dịtụrụ ha mfe.
Ihe Baịbụl kwuru: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya.”—Ilu 17:17.
Ị chọọ ịmatakwu otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-adịkwu ná mma, gụọ isiokwu bụ́ “Ezinụlọ na Ndị Enyi.”