Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Brais Seara/Moment via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Oké Ọkọchị—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Oké Ọkọchị—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
  •   Akwụkwọ akụkọ a na-akpọ The Guardian, nke Septemba 7, 2022 kwuru na ndị Chaịna sịrị na ọkọchị ha nwere n’afọ a kacha nyụọ ha ịkpakwụ nakwa na ọ bụ nke ugboro atọ ụdị ihe a na-eme n’obodo ha.

  •   UN News, nke Ọgọst 26, 2022 kwuru na a ga-enwe oké ọkọchị n’ụfọdụ ebe n’Afrika ruo afọ ise n’akwụsịghị akwụsị.

  •   BBC News, nke Ọgọst 23, 2022 kwuru na ihe karịrị ọkara ná mba ndị e nwere na Yurop nwere ike inwe oké ọkọchị nakwa na o nwere ike ịbụ nke kacha njọ ha nwetụrụla n’ime narị afọ ise.

 Ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu na a ga na-enwe ụdị oké ọkọchị a nakwa na o nwedịrị ike ịkakwu njọ. È nwere olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Otú amụma ndị e buru na Baịbụl si gbasa oké ọkọchị

 Baịbụl kwuru ihe ndị ga-eme n’oge anyị a. Ọ sịrị:

  •   “A ga-enwe . . . ụkọ nri . . . n’ebe dị iche iche.”​—Luk 21:11.

 Oké ọkọchị na-akpatakarị ụkọ nri. Ụkọ nri a na-akpatakwa ahụhụ na ọnwụ. Ihe a niile na-emezu amụma Baịbụl.​—Mkpughe 6:​6, 8.

Ihe mere oké ọkọchị ji aka njọ

 Baịbụl kwuru isi sekpụ ntị mere e ji enwe oké ọkọchị. Ọ sịrị:

  •   ‘Mmadụ enweghị ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.’​—Jeremaya 10:23.

 Ihe ọ pụtara bụ na ndị mmadụ agaghị achịli onwe ha nke ọma ma ọ bụkwanụ duzie onwe ha. Mkpebi ọjọọ ndị ha na-eme na-eme ka e nwee oké ọkọchị na ụkọ mmiri.

  •   Ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu na ndị mmadụ na-eme ihe dị iche iche na-emebi ọtụtụ ihe n’ụwa, ya emeekwa ka a na-enwe oké ọkọchị n’ụwa niile.

  •   Ndị mmadụ dị anyaukwu, ha anaghịkwa eche banyere ihe mkpebi ha chọrọ ime ga-akpata n’ọdịnihu. Ha na-egbutusị osisi ndị dị n’ọhịa, na-emebi ikiku, na-emebisịkwa ihe dị iche iche bara uru dị n’ụwa. Ihe ndị a na-eme ka a gharazie inwe mmiri, bụ́kwanụ ihe dị anyị ezigbo mkpa.

 Ma, Baịbụl na-eme ka anyị nwee olileanya.

È nwere olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu?

 Na Baịbụl, Chineke kwere nkwa na ọ ga eme ka a gharazie inwe ụkọ mmiri. Olee otú ọ ga-esi eme ya?

  1.  1. Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Chineke ga-ewepụ otu n’ime ihe ndị na-akpata oké ọkọchị, ya bụ, ndị anyaukwu na-emebi ụwa anyị a.​—2 Timoti 3:​1, 2.

  2.  2. “Ala kpọrọ nkụ ga-adị ka ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru.” (Aịzaya 35:​1, 6, 7) Chineke ga-emezi ihe niile oké ọkọchị mebiri. Ọ ga-emekwa ka ụwa anyị a bụrụ paradaịs, ebe a na-agaghị na-achọ mmiri achọ.

  3.  3. “Ị na-elekọta ụwa, na-eme ka ọ na-eme ezigbo nri n’ụba.” (Abụ Ọma 65:9) Chineke ga-agọzi ụwa, mee ka nri ju ebe niile, e nweekwa ezigbo mmiri n’ebe niile.