Mkpughe E Kpugheere Jọn 22:1-21
22 Mmụọ ozi ahụ gosikwara m ka osimiri nke mmiri nke ndụ,+ nke dị ka enyo na-egbuke egbuke, si n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ+ na-asọpụta,
2 na-asọda n’etiti okporo ámá obodo ahụ. E nwere osisi nke ndụ n’akụkụ abụọ nke osimiri ahụ. Ha na-amị mkpụrụ ugboro iri na abụọ n’afọ. Ha na-amị mkpụrụ ha kwa ọnwa. Akwụkwọ nke osisi ndị ahụ bụ maka ịgwọ mba niile.+
3 Chineke agaghịzi abụ obodo ahụ ọnụ. Ma, ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ+ ga-adị n’obodo ahụ. Ndị ohu Chineke ga na-efekwa ya.*
4 Ha ga-ahụkwa ihu ya.+ A ga-edekwa aha ya n’egedege ihu ha.+
5 Abalị agaghịzi adị.+ Ìhè mpanaka* na nke anyanwụ agaghịzi abara ha uru, n’ihi na Jehova* Chineke ga-enye ha ìhè.+ Ha ga-abụ eze, na-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.+
6 Mmụọ ozi ahụ wee sị m: “E kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.+ Jehova,* bụ́ Chineke, onye mere ka ndị amụma si n’ike mmụọ nsọ kwuo okwu,+ zigara mmụọ ozi ya ka o gosi ndị ohu ya ihe ndị ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya.
7 Ana m abịa ngwa ngwa.+ Onye ọ bụla nke na-eme ihe e kwuru n’amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a na-enwe obi ụtọ.”+
8 Ọ bụ mụnwa bụ́ Jọn na-anụ ihe ndị a, na-ahụkwa ha. Mgbe m nụrụ ha, hụkwa ha, esekpuuru m ala n’ụkwụ mmụọ ozi nke nọ na-egosi m ihe ndị a ka m fee ya.
9 Ma ọ gwara m, sị: “Kpachara anya! Emela ya! Abụ m naanị ohu otú gị na ụmụnna gị, bụ́ ndị amụma, bụkwa. Abụkwa m ohu otú ndị na-eme ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ mpịakọta a bụ. Na-efe naanị Chineke.”+
10 Ọ sịkwara m: “Ezochila ihe e kwuru n’amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a, n’ihi na oge ahụ a kara aka dị nso.
11 Onye na-eme ajọ omume, ya mere ajọ omume ya na-aga. Onye na-akpa àgwà rụrụ arụ, ya kpara àgwà rụrụ arụ ya na-aga. Ma, onye na-eme ezi omume, ya mere ezi omume ya na-aga. Onye dịkwa nsọ, ya dịrị nsọ na-aga.”
12 “Ana m abịa ngwa ngwa, m ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà.+
13 Abụ m Alfa na Omega,*+ onye mbụ na onye ikpeazụ, mmalite na ọgwụgwụ.
14 Ndị sara uwe mwụda ha+ na-enwe obi ụtọ. A ga-enye ha ikike ịta mkpụrụ si n’osisi nke ndụ ahụ,+ na isi n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’obodo ahụ banye na ya.+
15 N’azụ obodo ahụ ka ndị na-eme ka nkịta* nọ, ha na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-akwa iko* na ndị na-egbu mmadụ* na ndị na-ekpere arụsị na onye ọ bụla ịgha ụgha na-amasị, nke na-aghakwa ụgha.+
16 “Mụnwa, bụ́ Jizọs, zigara mmụọ ozi m ka ọ gbaara unu àmà banyere ihe ndị a ga-abara ọgbakọ niile uru. Abụ m mgbọrọgwụ Devid, bụrụkwa nwa ya.+ Abụkwa m kpakpando ụtụtụ+ nke na-enwu gbaa.”
17 Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị, “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa, “Bịa!” Onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịa.+ Onye ọ bụla nke chọrọ, ya bịa ṅụọ mmiri nke ndụ n’efu.+
18 “Ana m agwa onye ọ bụla nụrụ okwu amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a, sị: Ọ bụrụ na e nwee onye tinyere ihe n’ihe ndị a e dere,+ Chineke ga-ata ya ahụhụ ndị e dere n’akwụkwọ mpịakọta a.+
19 Ọ bụrụkwa na e nwee onye wepụrụ ihe n’okwu amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a, Chineke agaghị ekwe ka o nweta ihe ọma ndị e dere n’akwụkwọ mpịakọta a, ya bụ, ọ gaghị ekwe ka ọ taa mkpụrụ si n’osisi nke ndụ.+ Ọ gaghịkwa ekwe ka ọ banye n’obodo nsọ ahụ.+
20 “Onye ahụ nke na-ekwu na ihe ndị a bụ eziokwu kwuru, sị, ‘Ana m abịa ọsọ ọsọ.’”+
“Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.”
21 Ka Onyenwe anyị Jizọs meere ndị nsọ amara.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “na-ejekwara ya ozi dị nsọ.”
^ Ma ọ bụ “oriọna.”
^ Ma ọ bụ “A na Z.” Alfa bụ mkpụrụ akwụkwọ mbụ na Grik, Omega abụrụ mkpụrụ akwụkwọ ikpeazụ.
^ Ya bụ, ndị na-eme ihe rụrụ arụ n’anya Chineke.
^ Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
^ Ma ọ bụ “na-egbu ọchụ.”