Ozi Ọma Luk Dere 13:1-35

  • A ga-ebibi unu ma ọ bụrụ na unu echegharịghị (1-5)

  • Ihe atụ gbasara osisi fig na-amịghị mkpụrụ (6-9)

  • Otu nwaanyị na-ehu ehu a gwọrọ n’Ụbọchị Izu Ike (10-17)

  • Ihe atụ gbasara mkpụrụ osisi mọstad na ihe iko achịcha (18-21)

  • Onye chọrọ isi n’ọnụ ụzọ dị warara banye ga-agbarịrị mbọ (22-30)

  • Herọd bụ “nkịta ọhịa” (31-33)

  • Jizọs beere Jeruselem ákwá arịrị (34, 35)

13  N’oge ahụ, ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ kọọrọ Jizọs gbasara ndị Galili Paịlet gburu ebe ha na-achụ àjà.  Ma, ọ sịrị ha: “Ùnu chere na ndị Galili ahụ mekarịrị ndị Galili ndị ọzọ niile ná mmehie n’ihi ihe a mere ha?  Ana m asị unu, mba. Ma, a ga-ebibi unu niile otú e bibiri ha ma ọ bụrụ na unu echegharịghị.+  Ka ùnu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ ụlọ elu dị na Siloam dagburu mekarịrị ndị ọzọ niile bi na Jeruselem ná mmehie?  Ana m asị unu, mba. Ma, a ga-ebibi unu niile otú e bibiri ha ma ọ bụrụ na unu echegharịghị.”  O mekwaara ha ihe atụ a: “Otu nwoke kụrụ osisi fig n’ubi vaịn ya. O wee bịa na-achọgharị mkpụrụ na ya, ma o nweghị nke ọ hụrụ.+  O wee gwa onye na-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ahụ, sị, ‘Kemgbe afọ atọ ka m na-abịa na-achọ mkpụrụ n’osisi fig a, ma o nweghị nke m na-ahụ. Gbutuo ya. Gịnị mere ọ ga-eji mee ka a ghara inwe ihe bara uru a ga-eji ala a mee?’  Ya asị ya: ‘Nna m ukwu, hapụkwuo ya otu afọ ka m gwuo ala gburugburu ya tinye nsị anụ.  Ọ bụrụ na o mechaa mịa mkpụrụ n’ọdịnihu, ọ dị mma, ma ọ bụrụ na ọ mịghị, e gbutuzie ya.’”+ 10  N’otu Ụbọchị Izu Ike, Jizọs nọ n’otu ụlọ nzukọ na-ezi ihe. 11  Ma, e nwere otu nwaanyị nọ ebe ahụ mmụọ ọjọọ mere ka ọ na-arịa ọrịa* kemgbe afọ iri na asatọ. Nwaanyị a na-ehu ehu, o nweghịkwa ike iguzo kwem. 12  Mgbe Jizọs hụrụ ya, ọ gwara ya, sị: “Nwaanyị, a gwọọla gị ọrịa gị.”+ 13  O bikwasịkwara ya aka, ya eguzoro kwem n’otu ntabi anya, malite ito Chineke. 14  Ma iwe were onyeisi oche ụlọ nzukọ ahụ maka na Jizọs gwọrọ onye ahụ n’Ụbọchị Izu Ike, ya asị ìgwè mmadụ ahụ: “E nwere ụbọchị isii e kwesịrị ịrụ ọrụ.+ N’ihi ya, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ unu. Unu abịala n’Ụbọchị Izu Ike.”+ 15  Ma, Onyenwe anyị sịrị ya: “Ndị ihu abụọ,+ ò nwere onye n’ime unu na-anaghị atọpụ ehi ya ma ọ bụ jakị ya n’ụlọ anụ n’Ụbọchị Izu Ike ma kpụrụ ya gaa ka o nye ya mmiri?+ 16  Setan mere ka nwaanyị a, bụ́ nwa Ebreham, na-arịa ọrịa a kemgbe afọ iri na asatọ. Ọ̀ bụ na e kwesịghị ịgwọ ya n’Ụbọchị Izu Ike?” 17  Mgbe o kwuru ihe a, ihere malitere ime ndị niile na-emegide ya. Ma ìgwè mmadụ ahụ niile malitere ịṅụrị ọṅụ n’ihi ihe niile dị ebube o mere.+ 18  O kwuziri, sị: “Gịnị ka Alaeze Chineke dị ka ya? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19  Ọ dị ka mkpụrụ osisi mọstad mmadụ weere kụọ n’ubi ya. O wee too ma ghọọ osisi, ụmụ nnụnụ ebiri n’alaka ya.”+ 20  Ọ sịkwara: “Gịnị ka m ga-eji tụnyere Alaeze Chineke? 21  Ọ dị ka ihe iko achịcha otu nwaanyị weere tinye n’ime ntụ ọka juru arịa* atọ buru ibu ruo mgbe ntụ ọka ahụ niile koro.”+ 22  Ka Jizọs na-aga Jeruselem, o si n’otu obodo ukwu banye n’ọzọ, sikwa n’otu obodo nta banye n’ọzọ, na-ezi ndị mmadụ ihe. 23  Ma otu nwoke sịrị ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta?” O wee sị ha: 24  “Gbalịsienụ ike ka unu si n’ọnụ ụzọ dị warara banye.+ N’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị ga-achọ ịbanye ma ha agaghị abanyeli. 25  Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ ebilie kpọchie ụzọ, unu ga-eguzoro n’èzí na-akụ aka n’ụzọ, sị, ‘Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ.’+ Ma ọ ga-asị unu: ‘Amaghị m ebe unu si.’ 26  Unu ga-amalitekwa ịsị, ‘Anyị na gị rikọrọ ihe, ṅụkọọkwa ihe, i zikwara ihe n’okporo ámá anyị.’+ 27  Ma ọ ga-asị unu, ‘Amaghị m ebe unu si. Sinụ ebe m nọ pụọ. Unu bụ ndị ajọ omume.’ 28  Ọ bụ ebe ahụ ka unu ga-ebe ákwá, taakwa ikikere ezé, mgbe unu ga-ahụ Ebreham, Aịzik, Jekọb, na ndị amụma niile n’Alaeze Chineke, ununwa anọrọ n’èzí.+ 29  Ndị mmadụ ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ bịa, sikwa n’ebe ugwu nakwa n’ebe ndịda, ha ga-anọdụkwa ala na-eri ihe na tebụl n’Alaeze Chineke. 30  Ma, e nwere ndị ikpeazụ ga-abụ ndị mbụ, e nwekwara ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ.”+ 31  N’oge ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịara sị ya: “Si ebe a pụọ, n’ihi na Herọd chọrọ igbu gị.” 32  O wee sị ha: “Gaanụ gwa nkịta ọhịa ahụ, sị, ‘Ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-agwọkwa ndị ọrịa taa na echi, m ga-emechakwa n’ụbọchị nke atọ.’ 33  Ma, m ga na-arụ ọrụ m taa, echi, na nwanne echi. O nweghịkwa ihe ga-eme m ruo mgbe m ruru Jeruselem, n’ihi na ọ bụ na Jeruselem ka a na-egbu ndị amụma.+ 34  “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume,+ achọọla m ịchịkọta ụmụ gị ọtụtụ ugboro dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya, ma ị chọghị ya.+ 35  A hapụrụla unu ụlọ unu.+ Ana m asị unu, unu agaghị ahụ m ruo mgbe unu ga-asị: ‘Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova* bụ onye a gọziri agọzi.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mere ka o nwee nkwarụ.”
Na Grik, “sia.” Otu sia bụ lita 7.33. Gụọ B14.
Gụọ A5.