Job 38:1-41
38 Jehova wee si n’oké ifufe gwa Job,+ sị:
2 “Ònye bụ onye a nke na-agba otú m si eme ihe ụkwụMa na-ekwu okwu n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ma?+
3 Biko, jikere ka dimkpa.
M ga-ajụ gị ajụjụ, ị ga-azakwa m.
4 Olee ebe ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?+
Gwa m, ma ọ bụrụ na i chere na ị na-aghọta ihe.
5 Ònye kpebiri otú ọ ga-aha, ma ọ bụrụ na ị ma?
Ma ọ bụ, ònye ji eriri e ji atụ̀ ihe tụọ ya?
6 Na gịnị ka e gwunyere ntọala ya,Ma ọ bụ, ònye dọnyere nkume ji ya,+
7 Mgbe kpakpando ụtụtụ+ tikọrọ mkpu ọṅụ ọnụ,Ụmụ Chineke* niile+ amalitekwa iti mkpu otuto?
8 Ònye mechibidoro oké osimiri ụzọ+Mgbe o si n’ebe o si asọpụta* sọpụtasiwe ike,
9 Mgbe m yiwere ya ígwé ojii ka uwe,Jirikwa oké ọchịchịrị kee ya ka ákwà,
10 Mgbe m kpaara ya ókè,Tinyekwa ihe e ji atụchi ya nakwa ibo ụzọ ya,+
11 M wee sị, ‘Ebe a ka ị ga-erute. Ị gaghị agafe ya.
Ebe a ka ebili mmiri gị nke na-amali elu ga-ejedebe’?+
12 È nweela mgbe i nyere anyanwụ ụtụtụ iwu ka ọ waaMa ọ bụ mee ka chi mara ebe ọ ga-abọ,+
13 Ka ọ bọọ n’ebe niile ụwa sọtụrụNakwa ka ọ yọgharịa ụwa, yọpụ ndị ajọ omume?+
14 Ọ na-agbanwe otú ụwa dị otú ahụ ihu ụrọ si agbanwe ma e bie ihe e ji aka ihe akara na ya,Ihe ndị dị n’ụwa apụtazie ìhè otú ihe e sere n’ákwà si apụta ìhè.
15 Ma a na-eme ka ìhè kwụsị inwuru ndị ajọ omume,Meekwa ka ndị ajọ omume kwụsị imegbu ndị mmadụ.*
16 Ị̀ gatụla n’ebe oké osimiri si asọpụtaMa ọ bụ gagharịa n’ime mmiri miri emi ka ị chọpụta ihe ndị dị na ya?+
17 È gosila gị ọnụ ụzọ ọnwụ?+
Ka ị̀ hụtụla ọnụ ụzọ oké ọchịchịrị?+
18 Ị̀ ghọtala otú ụwa si buo ibu?+
Gwa m, ma ọ bụrụ na ị ma ihe a niile.
19 Olee ebe ìhè bi?+
Oleekwa ebe bụ́ ụlọ ọchịchịrị,
20 Ka i wee kpọrọ ya gaa n’ebe ahụ,Ma ghọta ụzọ e si aga n’ụlọ ya?
21 Ị̀ ma ihe a maka na a mụọla gị mgbe ahụNakwa maka na ị dịteela ndụ aka?
22 Ị̀ banyetụla n’ebe snoo si apụta?+
Ka ị̀ hụtụla ebe akụ́ mmiri ígwé si apụta,+
23 Bụ́ ihe ndị m dowere maka oge ahụhụ,Maka ụbọchị ọgụ na agha?+
24 Olee ebe e si ekesa ìhè?*
Oleekwa ebe ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ si eku n’ụwa?+
25 Ònye waara idei mmiri ụzọ,Waakwara égbè eluigwe na ígwé ojii nke mmiri rujuru ụzọ,+
26 Ka mmiri zoo n’ebe mmadụ na-ebighị,N’ala ịkpa mmadụ ọ bụla na-ebighị,+
27 Ka mmiri ju n’ala kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị,Meekwa ka ahịhịa pulite na ya?+
28 Mmiri ozuzo ò nwere nna,+Ma ọ bụ, ònye bụ nna igirigi?+
29 Ònye na-eme ka mmiri kpụkọọ akpụkọọ?
Ònyekwa na-amụpụta mkpụrụ mmiri ígwé?+
30 Ònye na-ekpuchi mmiri ka à ga-asị na e ji nkume kpuchie ya,Meekwa ka mmiri miri emi kpụkọọ?+
31 Ì nwere ike ikechi ụdọ ndị ji ìgwè kpakpando Kaịma*Ma ọ bụ tọọ ụdọ ndị ji ìgwè kpakpando Kisịl?*+
32 Ì nwere ike iduru otu ìgwè kpakpando* pụta n’oge yaMa ọ bụ duzie ìgwè kpakpando Ash* na ụmụ ya?
33 Ị̀ ma iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe,+Ka ì nwere ike ime ka iwu ndị ahụ chịwa ụwa?
34 Ì nwere ike iti mkpu gwa ígwé ojii okwuKa nnukwu mmiri wee zoo dee gị ahụ́?+
35 Ì nwere ike ime ka àmụ̀mà gbuo?
Hà ga-abịa sị gị, ‘Lee anyị’?
36 Ònye mere ka ígwé ojii* mara ihe+Ma ọ bụ mee ka ihe ndị dị na mbara igwe* na-aghọta ihe?+
37 Ònye ma ihe nke na ọ ga-agụli ígwé ojii ọnụ?
Ma ọ bụ, ònye nwere ike ikpu ite mmiri ndị dị n’eluigwe ihu?+
38 Ònye na-eme ka uzuzu kpụkọọ ọnụ,Ájá ụrọ anyakọtakwa ọnụ?
39 Ì nwere ike igbutere ọdụm anụ ọ ga-eri
Ma ọ bụ nyejuo ụmụ ọdụm agụụ ji afọ+
40 Mgbe ha makpu n’ebe ha na-ezoMa ọ bụ mgbe ha makpu n’ebe ha bi na-eche anụ?
41 Ònye na-akwadebere ugoloọma nri+Mgbe ụmụ ya na-ebe ákwá ka Chineke nyere ha aka,Ha ana-adagharịkwa maka na ihe ha ga-eri adịghị?
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ihe a bụ akpaala okwu Hibru nke pụtara ndị mmụọ ozi.
^ Na Hibru, “n’akpa nwa.”
^ Na Hibru, “Gbajiekwa aka ha weliri elu.”
^ O nwere ike ịbụ, “ebe àmụ̀mà si egbu.”
^ O nwere ike ịbụ kpakpando Pledis ndị dị n’ìgwè kpakpando a na-akpọ Tọrọs.
^ O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Ọrayọn.
^ Na Hibru, “Mazarọt.”
^ O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Nnukwu Anụ Bea (Ọsa Mejọ).
^ O nwere ike ịbụ, “mmadụ.”
^ O nwere ike ịbụ, “mee ka uche.”