Jenesis 23:1-20
-
Sera nwụrụ, e lie ya (1-20)
23 Sera nọrọ ndụ otu narị afọ na iri abụọ na asaa (127). Ọ bụ afọ ole a ka Sera dịrị ndụ.+
2 Sera wee nwụọ na Kiriat-aba,+ ya bụ, Hebrọn,+ n’ala ndị Kenan.+ Ebreham malitere ibe ákwá na iruru Sera uju.
3 Ebreham wee si n’ebe a dọsara ozu nwunye ya bilie gaa gwa ụmụ Het+ okwu. Ọ sịrị ha:
4 “Abụ m onye mbịarambịa bi n’ala unu.+ Sinụ n’ala unu nye m ala ebe m ga na-eli ozu ka m lie nwunye m.”
5 Ụmụ Het wee gwa Ebreham, sị:
6 “Onyenwe anyị, gee anyị ntị. Anyị weere gị ka onyeisi Chineke họpụtara.*+ I nwere ike ili nwunye gị n’ebe kacha mma n’ebe anyị na-eli ozu. E nweghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-ajụ ka ị ghara ili nwunye gị n’ebe ọ na-eli ozu.”
7 Ebreham biliri kpọọrọ ndị ala ahụ, ya bụ, ụmụ Het,+ isiala.
8 Ọ sịkwara ha: “Ọ bụrụ na unu* kwetara ka m lie nwunye m, geenụ m ntị ma rịọrọnụ m Ifrọn nwa Zoha arịrịọ
9 ka o resị m ọgba Mak-pila. Ọ bụ ya nwe ọgba ahụ. Ọ dị na nsọtụ ala ya. Ya nọrọ n’ihu unu resị m ya. M ga-akwụ ya ọlaọcha ole ọgba ahụ bụ,+ ka ọgba ahụ bụrụzie ebe m ga na-eli ozu.”+
10 Ifrọn so n’ụmụ Het ndị nọ n’ebe ahụ. N’ihi ya, Ifrọn onye Het zara Ebreham n’ihu ụmụ Het nakwa n’ihu ndị niile zukọrọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ,+ sị:
11 “Mba, onyenwe m. Gee m ntị. M na-enye gị ma ala ahụ ma ọgba dị na ya. M nọ n’ihu ụmụnna m na-enye gị ha. Lie nwunye gị n’ebe ahụ.”
12 Ebreham wee kpọọrọ ndị ala ahụ isiala
13 ma gwa Ifrọn n’ihu ha, sị: “Biko, gee m ntị. M ga-akwụ gị ọlaọcha ole ala ahụ bụ. Nara m ya, ka m lie nwunye m n’ebe ahụ.”
14 Ifrọn gwaziri Ebreham, sị:
15 “Onyenwe m, gee m ntị. Ihe m ga-ereta ala a bụ narị shekel* ọlaọcha anọ (400). Ma e nweghị ihe ọ bụ. Gaa lie nwunye gị n’ebe ahụ.”
16 Ebreham gere Ifrọn ntị, Ebreham wee tụọ ọlaọcha ole ahụ Ifrọn kwuru n’ihu ụmụ Het ma nye ya Ifrọn. Ọ dị narị shekel* ọlaọcha anọ (400). E ji ihe ndị ahịa ji atụ̀ ihe tụọ ya.+
17 E si otú a mee ka o doo anya na ala Ifrọn, nke dị na Mak-pila, n’ihu Mamri, ma ala ahụ ma ọgba dị na ya ma osisi niile dị na ya, bụzi
18 nke Ebreham. Ọ zụrụ ya n’ihu ụmụ Het, n’ihu ndị niile zukọtara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ.
19 Mgbe e mechara, Ebreham liri Sera nwunye ya n’ọgba dị na Mak-pila, n’ihu Mamri, ya bụ, Hebrọn, n’ala ndị Kenan.
20 Otú a ka ụmụ Het si nye Ebreham ala ahụ na ọgba dị na ya ka ọ bụrụ ebe ọ ga na-eli ozu.+