Nkasi Obi
Otú Baịbụl si akasi anyị obi ma anyị daa mbà
Nchegbu
Gụọ isiokwu bụ́ “Nchegbu”
Obi mgbawa; iwe
Ọtụtụ nsogbu ma ọ bụ mmegbu na-eme ka iwe ju ụfọdụ ndị obi
I nwekwara ike ịgụ Ọma 142:4; Ekli. 4:1; 7:7
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
-
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
-
Rut 1:6, 7, 16-18; 2:2, 19, 20; 3:1; 4:14-16—Naomi malitere inwe obi ụtọ ọzọ mgbe ọ laghachiri n’Izrel, ndị mmadụ enyere ya aka, ya enyekwara ndị ọzọ aka
-
Job 42:7-16; Jems 5:11—Okwukwe Job nwere mere ka o die nsogbu ndị bịaara ya. Jehova gọzikwara ya otú na-enweghị atụ
-
Ụfọdụ ndị anaghị enwe obi ụtọ n’ihi àgwà ọjọọ a na-akpaso ha
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 1:6, 7, 10, 13-16—Hana anaghị enwe obi ụtọ n’ihi àgwà ọjọọ Penina na-akpaso ya. Nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ịlaị chekwara na ọ na-aṅụ oké mmanya
-
Job 8:3-6; 16:1-5; 19:2, 3—Mmadụ atọ sị na ha bịara ịkasi Job obi bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha. Ha bokwara Job ebubo na ọ bụghị ezigbo mmadụ. Ihe a wutere Job
-
-
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
-
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
-
1 Sam. 1:9-11, 18—Obi bịara ruo Hana ala mgbe o kpechara ekpere o ji gwa Jehova ihe na-ewute ya n’obi
-
Job 42:7, 8, 10, 17—Mgbe Job gbaghachaara ndị enyi ya, Jehova mere ka ọ gbakee, ya amalitekwa ịna-enwe obi ụtọ
-
Obi amamikpe
Ezra 9:6; Ọma 38:3, 4, 8; 40:12
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Eze 22:8-13; 23:1-3—Eze Josaya na ndị ọ na-achị bịara ghọta otú ihe ọjọọ ha mere jọruru ná njọ mgbe a gụụrụ ha ihe dị n’Iwu Mosis
-
Ezra 9:10-15; 10:1-4—O wutere onye nchụàjà bụ́ Ezra na ndị Izrel ndị ọzọ maka na ụfọdụ ụmụ nwoke Izrel nupụụrụ Jehova isi gaa lụọ ndị ala ọzọ
-
Luk 22:54-62—O wutere Pita onyeozi na ọ gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ
-
-
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
-
I nwekwara ike ịgụ Aịza. 38:17; Maị. 7:18, 19
-
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
-
2 Ihe 33:9-13, 15, 16—Manase bụ otu n’ime ndị eze ọjọọ chịrị Juda. Ma, Chineke meere ya ebere mgbe o chegharịrị
-
Luk 15:11-32—Jizọs mere ihe atụ banyere nwa mmefu iji gosi otú Jehova si eji obi ya niile agbaghara ndị mmadụ kpamkpam
-
Mgbe obi na-ajọ anyị njọ maka na ndị ọzọ gharịpụrụ anyị ma ọ bụkwanụ mejọọ anyị
Gụọ isiokwu bụ́ “Obi Ịjọ Mmadụ Njọ”
Mgbe obi na-ajọ anyị njọ n’ihi adịghị ike anyị ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe anyị mejọrọ
Gụọ isiokwu bụ́ “Obi Ịjọ Mmadụ Njọ”
Mgbe ọ dị anyị ka anyị abaghị uru
Gụọ isiokwu bụ́ “Inwe Obi Abụọ”
Anyị nwere ike ịna-eche na anyị agaghị emerili nsogbu bịaara anyị ma ọ bụ na anyị agaghị arụli ọrụ e nyere anyị
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọpụ. 3:11; 4:10—Mosis onye amụma echeghị na ya ruru eru ịgakwuru Fero mgbe Chineke gwara ya ka ọ gaa gwa Fero ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka yanwa bụ́ Mosis duru ha pụọ n’Ijipt
-
Jere. 1:4-6—Jeremaya chere na ya ka bụ nwata nakwa na o rubeghị ịbụ onye amụma nke ga na-agwa ndị isi ike ihe Jehova ga-eme ha
-
-
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
-
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
-
Ọpụ. 3:12; 4:11, 12—Jehova gwara Mosis onye amụma ugboro ugboro na ya ga-enyere ya aka ka o nwee ike ịrụ ọrụ o nyere ya
-
Jere. 1:7-10—Jehova mesiri Jeremaya onye amụma obi ike na ya ga-enyere ya aka n’ọrụ ahụ siri ike o nyere ya
-
Ekworo; anyaụfụ
Gụọ isiokwu bụ́ “Anyaụfụ”
Ndị ọrịa na nká na-egbochi ime ihe ha chọrọ ime
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Eze 20:1-3—Eze Hezekaya bere ezigbo ákwá mgbe ọ dara ọrịa ma nọrọ n’ọnụ ọnwụ
-
Fil. 2:25-30—Obi dara Epafrọdaịtọs mbà maka na ọ nọ na-echegbu onwe ya na ụmụnna nọ na Filipaị nụrụ na ahụ́ adịghị ya nakwa na ha nwere ike ịna-eche na ọ rụlighị ọrụ e nyere ya
-
-
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
-
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
-
2 Sam. 17:27-29; 19:31-38—Bazilaị nọ na-akwado Eze Devid. Devid na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù. Ma, mgbe Devid gwara ya ka o soro ya gaa biri na Jeruselem, ọ jụrụ maka na ọ ma na ya emeela agadi
-
Ọma 41:1-3, 12—Mgbe ọrịa na-arịasi Eze Devid ike, obi siri ya ike na Jehova ga-enyere ya aka
-
Mak 12:41-44—Jizọs jara otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye mma maka onyinye o nyere n’ihi na o nyere ihe niile o nwere
-
Obi nwere ike ịjọte anyị njọ aka maka ihe e mere anyị
Gụọ isiokwu bụ́ “Mmegbu”
Egwu; ụjọ
Gụọ isiokwu bụ́ “Egwu”
Mkpagbu
Gụọ isiokwu bụ́ “Mkpagbu”