Ndidi
Olee ihe na-egosi na Jehova na-enwe ndidi?
I nwekwara ike ịgụ Nehe. 9:30
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Jere. 7:23-25—Jehova kwuru otú o si na-enwere ndị ya bụ́ ndị na-enupụrụ ya isi ndidi
2 Pita 3:3-9, 15—Pita onyeozi kọwara otú Jehova si na-enwe nnọọ ndidi na ihe mere o ji na-enwe ya. O kwukwara na Jehova agaghị na-enwe ndidi ruo mgbe ebighị ebi
Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụta ịna-enwe ndidi?
Ilu 25:15; Efe. 4:1-3; 2 Tim. 2:24, 25; 4:2
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Jen. 39:19-21; 40:14, 15, 23; 41:1, 9-14—N’agbanyeghị na e rere Josef ka ọ gbawa ohu, mechaakwa tụọ ya mkpọrọ ọtụtụ afọ n’Ijipt maka ihe ọ na-emeghị, o nwere ndidi ma nwee okwuwe na Chineke
Hib. 6:10-15—Pọl onyeozi ji akụkọ Ebreham kụziere anyị na ọ dị mkpa ka anyị na-enwe ndidi