Ndị Nne
Gịnị na gịnị bụ ọrụ nne na-arụ?
Ilu 31:17, 21, 26, 27; Taị. 2:4
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Jen. 21:8-12—Mgbe Sera hụrụ na Ishmel na-akpagbu obere nwa ya bụ́ Aịzik, ọ rịọrọ Ebreham ka o chebe nwa ya
1 Eze 1:11-21—Mgbe Adọnaịja chọrọ izoro ezoro mee onwe ya eze, Bat-shiba rịọrọ Eze Devid ka o chie Solomọn nwa ya eze ma chebe ya
Gịnị mere anyị ga-eji na-erubere nne anyị isi ma na-asọpụrụ ya?
Ọpụ. 20:12; Diut. 5:16; 27:16; Ilu 1:8; 6:20-22; 23:22
I nwekwara ike ịgụ 1 Tim. 5:9, 10
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
1 Pita 3:5, 6—Pita onyeozi kwuru na Sera dị ka nne ọtụtụ ụmụ nwaanyị maka na o nwere okwukwe siri ike
Ilu 31:1, 15, 21, 28—Nne Eze Lemuel nyere ya ndụmọdụ gbasara alụmdi na nwunye, kwuokwa gbasara ọrụ dị mkpa onye bụ́ nwunye na nne na-arụ
2 Tim. 1:5; 3:15—Pọl toro mama Timoti bụ́ Yunis maka na ọ malitere mgbe nwa ya ka bụ nwata kụziwere ya ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ n’agbanyeghị na di ya anaghị efe Jehova