Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 7

Gịnị Ka M Ga-eme ma Mmadụ Chọọ Ka Mụ na Ya Nwee Mmekọahụ?

Gịnị Ka M Ga-eme ma Mmadụ Chọọ Ka Mụ na Ya Nwee Mmekọahụ?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ihe i mere ma mmadụ chọọ ka gị na ya nwee mmekọahụ ga-abara gị uru ma ọ bụ ghọ gị ahịa n’ọdịnihu.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: O ruola naanị ọnwa abụọ Heather na Mike kpawara, ma ọ dị Heather ka ò ruola ọtụtụ afọ. Ha na-eji ekwentị edegara ibe ha ozi ọtụtụ ugboro. Ha na-anọ ọtụtụ awa ma ha kwurịtawa okwu n’ekwentị. Otu onye kwuwa okwu, onye nke ọzọ na-amadị ihe ọ chọrọ ikwu. Ma, ihe Mike chọziri ugbu a abụghị naanị ikwurịta okwu.

N’ime ọnwa abụọ ahụ ha kparala, naanị ihe Mike na Heather na-eme bụ ijide ibe ha aka na isusutụ ibe ha ọnụ. Heather achọghị ka ọ gafee otú ahụ. Ma, ọ chọghị ihe ga-eme ka Mike hapụ ya. O nweghị onye ọzọ na-eme ya obi ụtọ, na-emekwa ya ka ọ̀ bụ àkwá ugo otú Mike si eme ya. Heather gwara onwe ya, sị: ‘Mụ na Mike hụrụ ibe anyị n’anya . . . ’

Ọ bụrụ na i toruola ka gị na nwoke kpawa, ya abụrụ na ị bụ Heather, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

Mmekọahụ bụ onyinye Chineke nyere naanị ndị bụ́ di na nwunye. Mmadụ nwee mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye, ọ pụtara na o nweghị ihe o ji onyinye ahụ kpọrọ. Ọ ga-adị ka ebe mmadụ ji ọmarịcha uwe a zụtaara ya na-ehicha ụlọ

Mmadụ sí n’ebe dị́ ezigbo elu wụtuo, ọ ga-emerụ ahụ́. Otú ahụ ka ọ dị ma i nupụ isi n’iwu Chineke nke kwuru, sị: “Zere ịkwa iko.” 1 Ndị Tesalonaịka 4:3.

Olee nsogbu inupụrụ iwu ahụ isi na-akpata? Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Olee otú o si bụrụ eziokwu?

A chọpụtala na ọtụtụ ndị na-eto eto nwerela mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye na-emecha nwee otu n’ime nsogbu ndị a ma ọ bụ karịa.

  • OBI MGBAWA. Ọtụtụ ndị na-eto eto nwerela mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye kwuru na ha mechara kwaa mmakwaara.

  • ATỤKWASỊGHỊ IBE HA OBI. Nwoke na nwaanyị nwee mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị, ihe onye ọ bụla n’ime ha ga na-eche bụ, ‘Ònye makwanụ onye ọzọ ya na ya nwerela mmekọahụ?’

  • ILEWE IBE HA ANYA ỌJỌỌ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ụmụ agbọghọ chọrọ ka ụmụ okorobịa ha na ha na-akpa na-echebe ha, ọ bụghị imebi ha. Ọtụtụ ụmụ okorobịa na-achọpụta na ụmụ agbọghọ ndị kwere ka ha na ha nwee mmekọahụ anaghịzi amasịcha ha.

  • Ihe kacha mkpa: I nwee mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, i reela ùgwù gị n’ihi na ị tụfuola ihe bara ezigbo uru i nwere. (Ndị Rom 1:24) Ahụ́ gị bara ezigbo uru. I kwesịghị ikwe ka e mebie ya.

Gosi na i kpebisiri ike irube isi n’iwu ahụ Chineke nyere ‘ka anyị zere ịkwa iko.’ (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) I mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, ị ga-enwezi ike inwe mmekọahụ. Obi ga-adị gị ezigbo ụtọ inwe ya mgbe ahụ n’ihi na ị gaghị na-echegbu onwe gị, na-akwa mmakwaara, ma ọ bụ nwee nsogbu ndị ọzọ ịkwa iko na-akpatakarị.Ilu 7:22, 23; 1 Ndị Kọrịnt 7:3.

GỊNỊ KA I CHERE?

  • Onye hụrụ gị n’anya n’eziokwu ọ̀ ga-eme ihe ga-akpatara gị nsogbu ma ọ bụ ihe ga-eme ka obi na-ajọ gị njọ?

  • Onye na-echere gị echiche ọma n’eziokwu ọ̀ ga-eme ka i mee ihe ga-eme ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma?Ndị Hibru 13:4.