Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị?

Gịnị Ka Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị?

Gịnị Ka Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị?

Biko jụgodị ụmụ anụmanụ. Ha ga-akụziri gị ihe. Jụọkwa ụmụ nnụnụ, ha ga-akọrọ gị. Ma ọ bụ, leruo ihe ndị dị n’ụwa anya. Ha ga-akụziri gị ihe. Azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ga-akọkwara gị ya.​—JOB 12:​7, 8.

KEMGBE ọtụtụ afọ ugbu a, ahịhịa na osisi dị iche iche nakwa ụmụ anụmanụ na-akụziri ndị sayensị na ndị njinia ihe. Ha na-amụ gbasara ihe dị iche iche e kere eke, na-ejikwa ihe ndị ha mụtara arụpụta ihe ụfọdụ. Ihe ndị ha mụtara na-enyere ha aka ịrụpụta ihe ọhụrụ, na-enyekwara ha aka ime ka ihe ndị ha rụpụtarala kakwuo mma. Ka anyị leba anya n’ihe atụ ụfọdụ. Ka anyị na-eleba ha anya, jụọ onwe gị, sị: ‘Ònye ka e kwesịrị ịna-eto maka ihe ndị sayensị na-elere anya arụ ihe dị iche iche?’

Ihe Nku Azụ̀ Weel Na-akụziri Ndị Sayensị

Olee ihe ndị na-arụ ụgbọelu nwere ike ịmụta n’otú e si kee azụ̀ weel? E nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụta. Nnukwu azụ̀ weel na-anyị arọ ka gwongworo ibu juru. Ahụ́ ya na-esi ike. O nwekwara nnukwu nku. Ọ na-adị mita iri na abụọ n’ogologo. Ma, otú o si adị garagara n’ime mmiri dị ịtụnanya. Dị ka ihe atụ, e nwee azụ̀ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ọ chọrọ iri, ọ na-amali elu ma gwuru mmiri na-agba ha gburugburu. Ọ na-abụ, ya na-egwugharị, ya ana-eme ka mmiri na-amali elu. Ihe ndị ahụ ọ chọrọ iri na-abịa zukọọ ebe ahụ mmiri ahụ na-amali elu gbara gburugburu. Ha zukọọ, ya erie ha niile.

Ihe kacha atụ ndị sayensị n’anya bụ otú azụ̀ a si atụgharị n’egbughị oge n’agbanyeghị na ahụ́ ya siri ike. Ha achọpụtala na ọ bụ otú nku ya dị na-eme ka ọ na-atụgharị n’egbughị oge otú a. Ọnụ ọnụ nku ya anaghị akwọ mụrụmụrụ otú nku ụgbọelu na-akwọ. Kama, ọ bụ akpụ akpụ.

Ka azụ̀ weel na-egwu mmiri, akpụ ndị ahụ na-eme ka mmiri ghara ịdọghachi ya azụ. Olee otú ha si eme ya? Akwụkwọ bụ́ Natural History kwuru na akpụ ndị ahụ dị na nku azụ̀ weel na-eme ka mmiri na-amali elu nke ọma, ma mgbe azụ̀ a na-amali na-amaba n’ime mmiri. A sị na ọnụ ọnụ nku azụ̀ a na-akwọ mụrụmụrụ, ọ gaghị enwe ike isi otú a na-amali ma na-amaba ná mmiri n’ihi na ahụ́ ya ga na-amị amị. Mmiri ahụ agaghị enwe ike ịmali elu ma nye aka bulie ya.

Olee uru ihe a ndị sayensị chọpụtara nwere ike ịba? O yiri ka ikuku agaghị na-enye ụgbọelu ndị a rụrụ nku ha ka ha dị ka nku azụ̀ weel nsogbu. O yikwara ka a gaghị arụnye ya ọtụtụ ihe ga na-enyere ya aka ịna-efe efe ma ọ bụ ihe ndị ga-egbochi nsogbu ikuku nwere ike ịna-enye ya. Nku ụgbọelu e si otú a rụọ ga-enye aka mee ka ụgbọelu ahụ ghara ịkpọka, nyekwa aka mee ka ịna-arụzi ya dị mfe. Otu onye sayensị ma nke a na-akọ aha ya bụ John Long kwuru na “otu ụbọchị, a ga-amalite ịrụnye ụdị akpụ ndị ahụ na-adị na nku azụ̀ weel n’ụgbọelu niile.”

Ihe Ndị Sayensị Rụpụtara Ka Ọ Na-arụ Ọrụ Ka Nku Nnụnụ Mmiri

Anyị manụ na a na-arụ nku ụgbọelu ka o yie nku nnụnụ. Ma n’oge na-adịbeghị anya, e nweela ihe ọzọ ndị sayensị leere anya na nku nnụnụ rụnye na nku ụgbọelu. Akwụkwọ bụ́ New Scientist kwuru, sị: “Ndị na-eme nchọpụta na mahadum dị na Flọrịda arụpụtala ihe a na-akpọ dron, nke yiri ụgbọelu. Ha rụrụ ihe a otú ọ ga-enwe ike ịkwụrụ n’elu, na-amaba ngwa ngwa ebe ọ bụla ọ chọrọ, na-efelikwa ngwa ngwa ka nnụnụ mmiri.”

Otú nnụnụ mmiri si efe dị ịtụnanya. Ihe mere o ji enwe ike ife otú a bụ n’ihi na ọ na-enwe ike ịpịaji nku ya n’ubu ya nakwa n’ebe yiri ikpere aka mgbe ọ na-efe. Akwụkwọ ahụ kwuru otú ndị njinia si lere nku nnụnụ mmiri rụọ nku dron ahụ. Ọ sịrị: “Dron ahụ nke dị inch iri abụọ na anọ nwere obere njin na-eme ka rọd ndị dị na ya na-agba gburugburu ma na-eme ka nku ya na-efegharị.” Otú a e si rụọ nku obere ihe a yiri ụgbọelu na-eme ka o nwee ike ịkwụrụ n’elu, nweekwa ike isi n’etiti ụlọ ndị dị ogologo fefere. Ndị agha ụgbọelu Amerịka na-agbasi mbọ ike ka ha rụpụta ụdị ụgbọelu ga na-esi otú ahụ na-efegharị ka ha jiri ya na-achọpụta ebe dị iche iche ngwá ọgụ dị n’obodo ndị mepere emepe.

Ihe Ndị Sayensị Leere Anya n’Ụkwụ Agụ Ụlọ Rụpụta

E nwekwara ọtụtụ ihe ụmụ anụmanụ ndị na-akpagharị n’ala na-akụziri anyị. Otu n’ime ụmụ anụmanụ ndị ahụ bụ agụ ụlọ. Agụ ụlọ na-adị obere, ma ọ na-arịgo n’ahụ́ ụlọ, si na ya rigoro n’uko ụlọ ma gagide aka na ya chee ihu n’elu n’adapụghị. Ọ bụ ụdị ihe a ka e ji mara agụ ụlọ, ma n’oge a ma n’oge a na-ede Baịbụl. (Ilu 30:28) Gịnị na-eme ka agụ ụlọ nwee ike ịnọ n’elu otú a n’adapụghị?

Agụ ụlọ na-enwe ụmụ irighịrị ihe yiri ajị n’ụkwụ ya. Ọ bụ ya mere ọ na-eji enwe ike anọ n’elu otú ahụ n’adapụghị, ya sọkwa ya ya bụrụ na ọ nọ n’ihe na-akwọ mụrụmụrụ. Ụkwụ ya anaghị anyagide n’ihe. Ihe na-enyere ya aka bụ ụmụ irighiri ihe dị n’ụkwụ ya nakwa ndị nke dị n’ihe ọ nọ n’elu ya. Ihe a na-akpọ van der Waals na-enyere ụmụ irighiri ihe ndị ahụ dị n’ụkwụ agụ ụlọ na n’ihe ọ nọ n’elu ya aka, mezie ka ọ rapara n’ihe ọ nọ n’elu ya n’adapụghị. Otú e si kee ụwa na-eme ka ụdị ihe a ghara ikwe omume. Ọ bụ ya mere na mmadụ agaghị enwe ike gagide aka nkịtị n’ahụ́ ụlọ rịgoro na ya. Ma, ụmụ irighiri ihe ndị ahụ yiri ajị ndị dị n’ụkwụ agụ ụlọ na-eme ka o nwee ike ịgagide aka n’ahụ́ ụlọ ma ghara ịdapụ. Ihe ahụ a na-akpọ Van der Waals na-ejupụta n’ihe ndị ahụ yiri ajị dị n’ụkwụ ya, ya enwee ike ịgagide aka ya na ụkwụ ya n’ihe n’adapụghị.

Olee uru ihe a ndị sayensị chọpụtara nwere ike ịba? E nwere ike iji ihe ndị ha leere anya n’ụkwụ agụ ụlọ rụọ dochie ihe a na-akpọ majik gọm. * Ndị rụrụ ya leere anya n’ihe ndị e kere eke rụọ ya. Akwụkwọ bụ́ The Economist kwuru ihe otu onye na-eme nchọpụta kwuru. Ọ sịrị na bandeeji ndị sayensị leere anya n’ụkwụ agụ ụlọ rụọ bara uru, karịchaa “mgbe a na-agwọ mmadụ ọrịa, ya abụrụ na a gaghị ejili bandeeji kemikal dị na ya gwọọ onye ahụ.”

Ònye Ka E Kwesịrị Ịna-eto Maka Ihe Ndị A?

Otu ụlọ ọrụ a na-akpọ NASA na-agba mbọ ka ha rụọ rọbọt nwere ọtụtụ ụkwụ ma na-aga ije ka akpị. Na Finland, ndị njinia arụpụtala traktọ nwere ụkwụ isii. Traktọ a nwere ike ịrị ihe ọ bụla nọchiiri ya ụzọ elu otú ahụ nnukwu ahụhụ nwere ike ime. Ndị sayensị arụọkwala ụdị ákwà ndị nwere oghere ndị nwere ike ịna-asaghe ma na-asachi. Ha leere anya n’otú mkpụrụ paịn si emechi ma na-emepe rụọ ha. E nwekwara otu azụ̀ na-efe ọsọ dị ịtụnanya n’ime mmiri. Otu ụlọ ọrụ na-arụ ụgbọala na-achọ ịrụ ụgbọala ga na-efe ọsọ ka ya. E nwekwara ndị sayensị na-amụ gbasara mkpo eju a na-akpọ abalọn. Ha chọrọ ịmata ihe mere o ji sie ike ma na-echebe eju dị ya n’ime. Ihe ha bu n’obi bụ ịrụ ihe na-agaghị adị arọ, ma ọ ga-esi ike, ka onye agha jiri ya na-echebe onwe ya.

E nwere ọtụtụ ọmarịcha ihe ihe ndị e kere eke na-akụziri anyị. Ha dị ọtụtụ nke na ndị sayensị enweela ebe ha na-edeba otú ọtụtụ n’ime ha si arụ ọrụ na kọmputa. Akwụkwọ bụ́ The Economist sịrị na e nwee ihe siiri ndị sayensị ike n’ihe ha na-arụ, ha nwere ike gaa na kọmputa mepee ebe ha na-ede ihe ndị ahụ ha chọpụtara mara ma hà ga-achọta ihe ga-enyere ha aka. Ọ na-abụkarị onye mbụ debara aha ihe ọhụrụ ọ chọpụtara ma ọ bụ ụlọ ọrụ mbụ debara aha ihe ọhụrụ ha rụrụ ka a na-ewere ka onye nwe ihe ahụ ma ọ bụ ka ndị rụrụ ihe ahụ. Akwụkwọ ahụ kọwakwuru banyere ihe ndị ahụ ndị sayensị na-edenye na kọmputa. O kwuru na “ebe ọ bụ na e nwere ebe ndị sayensị na-elere anya arụ ihe dị iche iche ha na-arụ, ọ pụtara na ọ bụghị ha bụ ndị mbụ rụrụ ihe ahụ. Kama, e nweela onye bu ụzọ rụọ ha, ya bụ, onye kere ihe ndị ahụ.”

Olee otú ọmarịcha ihe ndị a niile ndị sayensị na-elere anya arụ ihe ndị ha na-arụ si malite ịdị? Ọtụtụ ndị sayensị na-ekwu na ọmarịcha ihe ndị a niile nọkatara dịrị n’onwe ha, na ọ bụ ihe na-eme kemgbe ọtụtụ ijeri afọ. Ha na-ekwukwa na ọ na-abụ otu ihe nọkata, ya aghọọ ihe ọzọ. Ma, e nwekwara ndị nke na-ekwu ihe dị iche. N’afọ 2005, otu onye sayensị aha ya bụ Michael Behe dere n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times, sị: “Ihe ọmarịcha ihe ndị e kere eke na-agwa anyị bụ na ịchọwa otú ihe ndị a si malite abaghị uru ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe doro anya na-egosi otú ha si malite.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ihe ọ na-ekwu bụ na “mmadụ ekwesịghị ileghara ihe mara mma a haziri nke ọma anya naanị n’ihi na ọ ghọtara otú ihe ahụ si arụ ọrụ.”

N’eziokwu, onye rụrụ nku ụgbọelu nke na-arụ ọrụ nke ọma kwesịrị ka a jaa ya mma. Ndị rụrụ bandeeji e ji eme ọtụtụ ihe, ndị rụrụ ákwà ndị dị mma, nakwa ndị rụrụ ụgbọala bụ́ ọkpọka kwesịkwara ka e too ha maka ihe ndị ahụ ha rụrụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ike ikwu na mmadụ bụ onye ohi ma ọ bụrụ na o leere anya n’ihe onye ọzọ rụrụ rụọ ihe n’anataghị onye ahụ ike ma ọ bụkwanụ n’ekwughị na ya leere ihe onye dị otú ahụ rụrụ anya wee rụọ nke ya.

Ọ bụrụ otú ahụ, ì chere na ọ dị mma na onye sayensị ma ọrụ ya nke ọma ga-elere anya n’ihe e kere eke rụọ ihe ga-eju ndị mmadụ anya, ma ya ekwuo na ihe ahụ o leere anya rụọ ihe nọkatara dịrị? Ọ bụrụ na ihe ahụ ọ rụpụtara gosiri na ọ ma ọrụ ya nke ọma, gịnịkwanụ ka ihe ahụ o leere anya rụpụta ya na-egosi? Ònye ka e kwesịrị ịja mma karịa, ọ̀ bụ onye leere anya n’ihe rụpụta ihe ka ọ̀ bụ onye rụrụ ihe e leere anya na ya?

Ihe Ihe A Niile Na-egosi

Mgbe ọtụtụ ndị chebaara otú ihe ndị e kere eke si maa mma echiche, ha kwetara na ihe otu ọbụ abụ kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Jehova, ọrụ ị rụrụ dị nnọọ ọtụtụ. I ji amamihe rụọ ha niile. Ihe ndị i kere eke juru n’ụwa.” (Abụ Ọma 104:24) Onye ọzọ so dee Baịbụl aha ya bụ Pọl kwukwara ụdị ihe ahụ. Ọ sịrị: “N’ihi na e leruo otú e si kee ụwa anya, a na-ahụ àgwà [Chineke] ndị a na-anaghị ahụ anya. Ihe ndị o kere na-eme ka a ghọta ụdị onye ọ bụ. Ha na-eme ka a mata na ike ya na-adịru ebighị ebi nakwa na ọ bụ Chineke.”​—Ndị Rom 1:​19, 20.

O nwere ọtụtụ ndị ji obi ha niile kwere na Chineke dị nakwa na Baịbụl bụ Okwu ya. Ma, ha na-ekwu na o nwere ike ịbụ eziokwu na Chineke kere ihe ụfọdụ, ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya anọkatazie si n’ihe ndị ahụ o kere pụta. Gịnịkwanụ ka Baịbụl kwuru gbasara otú e si kee ihe ndị dị n’ụwa?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Majik gọm bụ ihe a na-adụnye n’ákwà ma ọ bụ n’akpụkpọ ụkwụ. A na-eji ya akpọchi olu uwe ma ọ bụkwanụ akpụkpọ ụkwụ. Ọ na-abụ a pịa aka ebe abụọ a dụnyere ya, olu uwe ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ akpọchie. E leere anya ná mkpụrụ osisi yiri mkpụrụ agbịrịgba rụpụta ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo]

Olee otú ọmarịcha ihe ndị dị n’ụwa si malite ịdị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo]

Olee onye e kwesịrị ịna-eto maka ihe ndị e kere eke dị n’ụwa?

[Igbe/​Foto]

Ọ bụrụ na ihe ahụ ọ rụpụtara gosiri na ọ ma ọrụ ya nke ọma, gịnịkwanụ ka ihe ahụ o leere anya rụpụta ya na-egosi?

E leere anya na nku nnụnụ mmiri rụọ ihe a na-akpọ dron yiri ụgbọelu nke na-amaba ngwa ngwa ebe ọ bụla ọ chọrọ, na-efelikwa ngwa ngwa

Ụkwụ agụ ụlọ anaghị eru unyi, a naghị ahụ ihe na-egosi ebe ọ zọrọ ụkwụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọ na-agagide ma aka ma ụkwụ n’ihe niile, ọ naghịkwa esiri ya ike ịgagide ma ọ bụ ịgapụ ha n’ihe. Ndị sayensị na-agba mbọ ịrụpụta ihe ga na-eme ka ya

Otu ụlọ ọrụ na-arụ ụgbọala leere anya n’otu azụ̀ na-efe ọsọ dị ịtụnanya n’ime mmiri na-achọ ịrụ ụgbọala ga na-efe ọsọ

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ebe e si nweta foto ụgbọelu: Kristen Bartlett/ University of Florida; ebe e si nweta foto ụkwụ agụ ụlọ: Breck P. Kent; ebe e si nweta foto azụ̀ na ụgbọala: Mercedes-Benz USA

[Igbe/​Foto]

HA MA NNỌỌ IHE

Otú ihe ndị Chineke kere eke si aga ebe ọ bụla ha chọrọ ịga n’ụwa na-egosi na “ha ma nnọọ ihe.” (Ilu 30:​24, 25) Legodị abụọ n’ime ha.

Ụzọ Ụmụ Ahụhụ Si Aga Olee otú ụmụ ahụhụ si amata otú ha ga-esi laghachi ebe ha si ma ha gaa ịkpa nri? Na Briten, ndị na-eme nchọpụta chọpụtara na ha na-eji ísìsì si ha n’ahụ́ amata ụzọ ha si alaghachi ebe ha si. Ụfọdụ na-abụkwa ha na-aga, ha ana-akpụ ájá n’ụzọ iji nyere ha aka ịmata ụzọ ha ga-esi laghachi ebe ha si. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ aha ya bụ New Scientist kwuru gbasara otu ahụhụ. Ọ sịrị na ahụhụ a na-esi n’ebe ha rụrụ ụlọ kpụrụ ájá na-apụ iji hụwa ụzọ ama. O nwere ebe ha na-akpụrụ ya ruo, ya awaa ngalaba. Olee uru ngalaba a na-abara ha? Ha laghachiwe, rute ebe ahụ wara ngalaba, ha na-esoro nke kacha nso n’ebe ha si. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ebe ahụ wara ngalaba na-eme ka ọ dịrị ha mfe ịma ebe ha ga na-aga, karịchaa ma ọ bụrụ na e nwere ndị nke si n’ụzọ ahụ na-aga aga na ndị nke na-alọta alọta. Ọ na-emekwa ka ahụhụ nke ọ bụla ghara ịgba mbọ n’efu gawa n’ụzọ ọ na-ekwesịghị ịga.”

Ihe Ụmụ Nnụnụ Ji Amata Ebe Ha Na-aga Ọtụtụ nnụnụ na-efere gaa ebe dị ezigbo anya n’agbanyeghị otú ihu igwe dị, ma ha agaghị efu ụzọ. Gịnị na-enyere ha aka? Ndị na-eme nchọpụta achọpụtala na o nwere ihe ndị dị n’ụwa na-enyere ha aka. Ma, akwụkwọ bụ́ Science kwuru na ebe mmadụ nọ n’ụwa na-eme ka ihe ndị ahụ dị n’ụwa na-agbanwetụ ma ọ bụ dịtụ iche, ha anaghị anọ otu ebe mgbe niile. Gịnịzi na-eme ka nnụnụ ndị a ghara ifu ụzọ? O yiri ka o nwere ihe dị n’ụbụrụ ha na-enyere ha aka ịmata mgbe anyanwụ ji ada ná mgbede ọ bụla. Ebe ọ bụ na oge na otú ụwa si atụgharị na-eme ka ebe anyanwụ na-ada na-agbanwe mgbe ụfọdụ, ndị na-eme nchọpụta kwuru n’akwụkwọ ahụ bụ́ Science na “o nwere ihe ụmụ nnụnụ bu pụta ụwa na-agwa ha oge a nọ na ya n’afọ.”

Ònye mere ụmụ ahụhụ ka ha nwee ike ịna-akpụ ájá ma ha na-aga iji nyere ha aka ịmata ụzọ? Ònye mere ụmụ nnụnụ, nye ha ihe na-edu ha ịmata ụzọ na oge a nọ n’afọ, nyekwa ha ụbụrụ ha ji aghọta ihe ndị a? Hà ji aka ha dịrị? Ka ọ̀ bụ na e nwere Onye kere ha?

[Ebe E Si Nweta Foto]

© E.J.H. Robinson 2004