Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE

Di ma Ọ Bụ Nwunye ịṅụbiga Mmanya Ókè

Di ma Ọ Bụ Nwunye ịṅụbiga Mmanya Ókè

 Di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ gwatụla gị na otú i si aṅụ mmanya na-aba n’anya na-echegbu ya? Ọ bụrụ na ọ gwatụla gị ya, e nwere ihe ụfọdụ i kwesịrị ichebara echiche.

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata nsogbu n’ezinụlọ

 Ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpata ọrịa dị iche iche, dị ka, ọrịa obi, ọrịa imeju, nakwa ọrịa kansa. Ma, ọ bụghị naanị ọrịa ka ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpata, ọ na-akpatakwa nsogbu ndị ọzọ n’ezinụlọ, dị ka, di ma ọ bụ nwunye iti ibe ya ihe, nsogbu ego, di ma ọ bụ nwunye ịgba n’èzí, nakwa ịgba alụkwaghịm.

 Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na mmadụ aṅụbiga mmanya ókè, “ọ na-ata ka agwọ, ọ na-atanyekwa mmadụ elò ka ajụala.” (Ilu 23:32) Olee otú ị ga-esi ama ma ịnụ mmanya na-aba n’anya ò riela gị ahụ́?

 Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ò riela gị ahụ́?

 Ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ịmata ma ò riela gị ahụ́:

  •   Ọ̀ na-esiri gị ike ịma ebe ị ga-aṅụru mmanya kwụsị?

  •   Ị̀ na-adị echekarị banyere oge ọzọ ị ga-aṅụ mmanya?

  •   Ị̀ ka na-anụ mmanya n’agbanyeghị nsogbu ndị ọ na-akpatara gị, ma nsogbu ezinụlọ?

  •   Ahụ́ ọ̀ na-arịawa gị oge ọ bụla ị kwụsịwara ịṅụ mmanya?

  •   Otú i si aṅụ mmanya ọ̀ na-eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-arụkarị ụka?

  •   Ị̀ na-aṅụzi mmanya na-aba n’anya karịa otú ị na-aṅụbu?

  •   Ị̀ na-ezo ezo aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụkwanụ zoo ya n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ị na-arụ ọrụ?

 Ọ bụrụ na ị zara ee n’otu ma ọ bụ karịa n’ime ajụjụ ndị a, o nwere ike ịbụ na mmanya na-aba n’anya eriela gị ahụ́. O nwere ike ịbụ na mmanya ị na-aṅụ akpatarala gị nsogbu, gị abụrụzie aṅụrụma.

 Ekwula na mmanya abụrụghị gị nsogbu

 Di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ gwatụla gị na otú i si aṅụ mmanya na-echegbu ya? Ọ bụrụ na ọ gwatụla gị, o nwere ike ịbụ na ị gbalịala ime ka ọ dị ka mmanya ị na-aṅụ abụghị nsogbu. O nwere ike ịbụ na ị taadịla ndị ọzọ ụta, ma di gị ma ọ bụ nwunye gị, kwuo ihe ndị dị ka:

  •   “A sị na ị na-emeta m ọfụma, agaghị m na-aṅụ mmanya.”

  •   “A sị na ị na-arụ ụdị ọrụ a na-agwụ ike m na-arụ, ị gakwaara na-aṅụ mmanya.”

  •   “E nwere ọtụtụ ndị m ma na-aṅụ mmanya karịa m.”

 Ọ bụrụ na i kwuru ụdị ihe ndị a, ọ̀ ga-abụ na ị na-ewere na ịṅụ mmanụ dị mkpa karịa gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ịna-enwe obi ụtọ? Olee nke kwesịrị ị ka gị mkpa?

 Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Onye lụrụ nwaanyị na-echegbu onwe ya . . . na-achọ ime ihe dị nwunye ya mma.”​—1 Ndị Kọrịnt 7:33.

Ikwu na mmanya na-aba n’anya anaghị akpatara gị nsogbu dị ka ebe mgbidi nọchiri nwunye gị ịgwa gị okwu, ma ikweta na i nwere nsogbu dị ka ebe i si na window na-ege nwunye gị ntị

 Ihe i nwere ike ime

  •   Ejila ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuru egwu egwu. Ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka mmanya ị na-aṅụ abụchaghị nsogbu, leenụ ma è nwere ihe ụfọdụ ị ga-agbanwe? Ọ bụrụ na e nweghị ihe ọ bụla ị ga-agbanweli, ọ bụrụkwa na i sie ọnwụ na ị ka ga na-aṅụ mmanya n’agbanyeghị na otú i si aṅụ ya na-echegbu di gị ma ọ bụ nwunye gị, o nwere ike ịpụta na ịṅụ mmanya na-aba n’anya abụrụla gị nsogbu.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ka onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị yanwa uru.”​—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

  •   Mata eziokwu gbasara mmanya. Ọ bụrụ na onye agha chọrọ imeri n’agha, o kwesịrị ịmata otú ndị iro ya si alụ ọgụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị gị. Ị chọọ ịkwụsị ịṅụ mmanya na-aba n’anya, i kwesịrị ịmata ihe niile gbasara ya na otú o si etinye mmadụ ná nsogbu. I kwesịkwara ịma ihe ị ga-eme ka mmanya gharazie iri gị ahụ́ nakwa ka ị ghara ịmalitekwa ịṅụ ya ọzọ.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Na-agbara ihe ọjọọ ndị gị na ha na-alụ ọgụ ọsọ.’​—1 Pita 2:11.

  •   Gaa ka e nyere gị aka. E nwere ndị na-ahụ maka ahụ́ ike na-enyere ndị ha na mmanya na-aba n’anya na-alụ aka. Ha na-ahazi ihe ụfọdụ ndị ahụ nwere ike ịna-eme, ebe ha ga-aga nara ọgwụ, nakwa ụlọ ọgwụ ndị ha nwere ike ịga. I nwekwara ike ịgwa enyi gị ma nke a na-akọ ka o nyere gị aka ịmata ihe ndị ọzọ mere mmanya na-aba n’anya ji rie gị ahụ́. Gaakwa ka enyi gị a nyere gị aka mgbe ọ bụla ọ gụwara gị agụụ ibidokwa ṅụwa oké mmanya.

    Maranụ ma ị̀ ga-aga ka ndị na-ahụ maka ahụ́ ike nyere gị aka

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

 Ịṅụbiga mmanya ókè abụghị obere nsogbu mmadụ ga-akwụsị naanị ma ọ gụọ otu obere isiokwu ma ọ bụkwanụ naanị ma o kwuo na ya ga-agba mbọ kwụsị ịṅụ mmanya. Ma, i kwesịrị ịma na ihe ọ bụla i mere gbasara ya ga-agbasa ahụ́ ike gị, gbasakwa di gị ma ọ bụ nwunye gị.

 Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe a: Gụọ isiokwu ndị a ka ị hụ otú ndị ọzọ si kwụsị ịṅụbiga mmanya ókè.

 Anaghịzi M Echi Nwunye M Ọnụ n’Ala

 Ihere Onwe M Anaghịzi Eme M

 M Malitere Ibi n’Okporo Ámá

 Leekwa vidio isiokwu ya bụ ‘Ndụ M Na-ebi Gwụrụ M Ike’