Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ndị Hibru 11:1—“Okwukwe Bụ Inwe Ntụkwasi Obi Na Ihe Anyị Na-ele Anya Ya Ga-Emezu”

Ndị Hibru 11:1—“Okwukwe Bụ Inwe Ntụkwasi Obi Na Ihe Anyị Na-ele Anya Ya Ga-Emezu”

 “Okwukwe bụ ezigbo obi ike e nwere na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu. Ọ bụ ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu.”​—Ndị Hibru 11:​1, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Okwukwe bụ inwe ntụkwasi obi na ihe anyị na-ele anya ya ga-emezu. Ọ bụkwa inwe ntụkwasị obi siri ike banyere ihe anyị na-ahụghị anya.”​—Ndị Hibru 11:1, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ihe Ndị Hibru 11:1 Pụtara

 Amaokwu Akwụkwọ Nsọ a kọwara okwukwe otú doro anya, o mekwara ka anyị mata na inwe okwukwe abụghị naanị n’ọnụ.

 “Okwukwe bụ inwe ntụkwasi obi na ihe anyị na-ele anya ya ga-emezu.” Okwu Grik e si na ya sụgharịta “okwukwe” ná Ndị Hibru 11:1 pụtara inwe obi ike, inwe ntụkwasị obi, ma ọ bụ ikwenyesi ike n’ihe. Onye nwere ụdị okwukwe a, anaghị enwe obi abụọ kama ọ na-enwe “ezigbo obi ike.” Okwu Grik e si na ya sụgharịta “ihe àmà doro anya” a nwere ike ịpụta “akwụkwọ mmadụ ji zụọ ala,” nke na-eme ka obi sie ya ike na ọ ga-emecha nweta ala ahụ.

 “Okwukwe bụ . . . ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu.” Okwukwe gbakwasịrị ụkwụ n’ihe àmà doro anya. Ụdị ihe àmà a na-eme ka mmadụ kweta na ihe dị adị n’eziokwu n’agbanyeghị na ọ naghị ahụ ihe ahụ anya.

Ihe Ndị Gbara Ndị Hibru 11:1 Gburugburu

 Akwụkwọ Ndị Hibru bụ akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst bi na Jeruselem nakwa gburugburu ya n’oge ochie. N’akwụkwọ ozi a, Pọl kwuru gbasara uru okwukwe baara. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na mmadụ enweghị okwukwe, ọ gaghị emeli ihe dị Chineke ezigbo mma, n’ihi na onye ọ bụla na-abịakwute Chineke ga-ekwetarịrị na ọ dị adị nakwa na ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Mgbe Pọl kwuchara ihe okwukwe bụ ná Ndị Hibru 11:1, ọ kpọziri aha ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Baịbụl kwuru na ha nwere okwukwe. Pọl kwuru otú ndị a si gosi na ha nwere okwukwe na Chineke. Otú ha si mee ya bụ ime uche Chineke.​—Ndị Hibru 11:​4-38.

a Okwu Grik a sụgharịrị “ezigbo obi ike e nwere” bụ hy·poʹsta·sis. Okwu a nwere ike ịpụta “ihe e gwunyere na ntọala siri ike.”