Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Inye Ihe?
Ihe Baịbụl kwuru
Baịbụl kwuru na ọ dị mma inye ndị ọzọ ihe, nakwa na onye na-enye ihe kwesịrị iji obi ọcha ya na-enye ya. O kwukwara na iji obi ọcha nye ihe na-abara ma onye e nyere ihe ahụ uru ma onye nyere ya ihe ahụ. (Ilu 11:25; Luk 6:38) Jizọs sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ Ndịozi 20:35.
Olee ụdị inye ihe na-atọ Chineke ụtọ?
Ụdị inye ihe na-atọ Chineke ụtọ bụ nke mmadụ si n’obi ya nye. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”—2 Ndị Kọrịnt 9:7.
Mmadụ isi n’obi ya nye ndị ọzọ ihe so ‘n’ụdị ofufe’ Chineke na-anabata. (Jems 1:27) Onye na-eji obi ya enyere ndị ọzọ aka so Chineke na-arụ ọrụ, n’ihi na Chineke na-ele onye na-emesapụ aka anya ka onye gbazinyere ya ihe. (Ilu 19:17) Baịbụl kwuru na Chineke n’onwe ya ga-akwụghachi onye ahụ ụgwọ ihe o mere.—Luk 14:12-14.
Olee ụdị inye ihe na-anaghị amasị Chineke?
Ọ bụrụ na o nwere ihe mmadụ bu n’obi na-enye ya. Ihe ndị dị ka:
Ka ndị mmadụ too ya.—Matiu 6:2.
Iji ya nata ihe ọzọ.—Luk 14:12-14.
Iji ya zụtara onwe ya nzọpụta.—Abụ Ọma 49:6, 7.
Ọ bụrụ na e ji ya na-akwado ihe Chineke kpọrọ asị ma ọ bụ àgwà Chineke kpọrọ asị. Dị ka ihe atụ, ọ dị njọ inye mmadụ ego ka o jiri ya gbaa chaa chaa ma ọ bụ ka o jiri ya ṅụọ ọgwụ ike ma ọ bụ ṅụbiga mmanya ókè. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; 2 Ndị Kọrịnt 7:1) Otú ahụ ka ọ dịkwa iwere ego nye onye ahụ́ dị mma na-achọghị ịrụ ọrụ, ebe ọ bụ yanwa jụrụ ịrụ ọrụ ka o nwee ike ịna-akpata ego.—2 Ndị Tesalonaịka 3:10.
Ọ bụrụ na inye ihe ga-egbochi onye ahụ ịrụ ọrụ Chineke nyere ya. Baịbụl kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ndị isi ezinụlọ inye ndị ezinụlọ ha ihe ndị na-akpa ha. (1 Timoti 5:8) Ọ gaghị adị mma ka onyeisi ezinụlọ na-enye ndị ọzọ ihe ruo nke na ọ ga-eleghara ndị ezinụlọ ya anya. Jizọs katọdịrị ndị na-achọghị inyere ndị mụrụ ha merela agadi aka n’ihi na ha na-ekwu na ihe niile ha nwere bụ “onyinye a raara nye Chineke.”—Mak 7:9-13.
.—Psalm 49:6, 7.