Gịnị Ka ‘Ịsọpụrụ Nna Gị na Nne Gị Pụtara’?
Ihe Baịbụl kwuru
Iwu ahụ bụ́ “sọpụrụ nna gị na nne gị” pụtara ọtụtụ ugboro na Baịbụl. (Ọpụpụ 20:12; Diuterọnọmi 5:16; Matiu 15:4; Ndị Efesọs 6:2, 3) E nwere ihe anọ iwu ahụ pụtara.
Na-ekele ha. Otu ụzọ ị ga-esi na-asọpụrụ nna gị na nne gị bụ ịna-ekele ha maka ihe niile ha meere gị. Ihe ga-egosi na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị ha meere gị bụ ịna-eme ihe ha kwuru. (Ilu 7:1, 2; 23:26) Baịbụl kwuru ka ị na-ele ndị mụrụ gị anya ka “ịma mma” gị, ya bụ, ka i jiri ha na-eme ọnụ.—Ilu 17:6.
Na-erubere ha isi. Ọ bụrụ na ị ghọta na ọ bụ Chineke nyere nna gị na nne gị ikike ịgwa gị ihe ị ga na-eme , ị ga na-asọpụrụ ha, karịchaa mgbe ị ka na-eto eto. Ndị Kọlọsi isi atọ amaokwu nke iri abụọ gwara ndị na-eto eto, sị: “Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile, n’ihi na nke a na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.” Mgbe Jizọs na-eto eto, o rubeere ndị mụrụ ya isi.—Luk 2:51.
Na-akwanyere ha ùgwù. (Levitikọs 19:3; Ndị Hibru 12:9) Otú i si agwa ndị mụrụ gị okwu na ihe ị na-agwa ha ga-egosi ma ị̀ na-akwanyere ha ùgwù ma ọ bụ na ị naghị eme otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị nne na nna na-eme ihe na-eme ka o sie ike ịkwanyere ha ùgwù. Ọ dịgodi otú ahụ, ụmụaka ekwesịghị ịna-akparị ha, kama ha kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù. (Ilu 30:17) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na mmadụ ikwujọ nna ya ma ọ bụ nne ya bụ ihe arụ.—Matiu 15:4.
Na-egboro ha mkpa ha. Ọ bụrụ na nne gị na nna gị emee agadi, ha ga-achọ ka ị na-emere ha ihe ụfọdụ. Ihe i nwere ike ime iji gosi na ị na-asọpụrụ ha bụ ime ike gị niile iji na-egboro ha mkpa ha. (1 Timoti 5:4, 8) Dị ka ihe atụ, obere oge tupu Jizọs anwụọ, o mere ndokwa ka e lekọta nne ya.—Jọn 19:25-27.
Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara mmadụ ịsọpụrụ nna ya na nne ya
Ụgha: Ọ bụrụ na ị chọrọ ịsọpụrụ nna gị na nne gị, ị ga-ahapụ ha ka ha na-agwa gị ihe niile ị ga-eme n’alụmdi na nwunye gị.
Eziokwu: Baịbụl na-akụzi na mmadụ kwesịrị iji di ya ma ọ bụ nwunye ya kpọrọ ihe karịa onye ọ bụla ọzọ. Jenesis 2:24 sịrị: “Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya.” (Matiu 19:4, 5) Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị di na nwunye nwere ike ịmụta ihe na ndụmọdụ ndị mụrụ ha ma ọ bụkwanụ nke nne na nna di ha ma ọ bụ nwunye ha. (Ilu 23:22) Ma, di na nwunye nwere ike ikpebi na ọ bụghị ihe niile ka ndị nne na nna ha ga-etinyere ha ọnụ.—Matiu 19:6.
Ụgha: Ọ bụ nne gị na nna gị ka ị ga-akacha erubere isi.
Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na Chineke nyere ndị nne na nna ikike n’ezinụlọ, ma e nwere ebe ikike ụmụ mmadụ ruru. Ọ karịghị ikike Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe otu ụlọikpe gwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha nụpuru Chineke isi, ha sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ Ndịozi 5:27-29) Otú ahụkwa ka ụmụaka kwesịrị irubere ndị mụrụ ha isi “n’ime Onyenwe anyị,” ya bụ, mgbe ọ na-emegideghị iwu Chineke.—Ndị Efesọs 6:1.
Ụgha: Irubere ndị mụrụ gị isi pụtara na ị ga-eso ha ekpe okpukpe ha.
Eziokwu: Baịbụl gwara anyị na anyị kwesịrị iji aka anyị chọpụta ma ihe a na-akụziri anyị ọ̀ bụ eziokwu. (Ọrụ Ndịozi 17:11; 1 Jọn 4:1) Ọ bụrụ na mmadụ achọpụta na ihe okpukpe ndị mụrụ ya na-akụzi abụghị eziokwu, o nwere ike ikpebi ịhapụ ya, họrọ ọzọ. E nwere ụfọdụ ndị Baịbụl kwuru na ha kpere okpukpe dị iche na nke ndị mụrụ ha, ndị dị ka Ebreham, Rut, nakwa Pọl onyeozi.—Jọshụa 24:2, 14, 15; Rut 1:15, 16; Ndị Galeshia 1:14-16, 22-24.
Ụgha: Irubere ndị mụrụ gị isi pụtara na ị ga na-efe ndị nna nna gị hà.
Eziokwu: Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Luk 4:8) Onye na-efe ndị nna nna ya na-eme ihe na-ewe Chineke iwe. Baịbụl kwudịrị na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.” Ha amaghị ma à na-efe ha, ha enweghịkwa ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́.—Ekliziastis 9:5, 10; Aịzaya 8:19.