Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Mmanya Na-aba n’Anya? Ịṅụ Ya Ọ̀ Bụ Mmehie?
Ihe Baịbụl kwuru
Mmadụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya abụghị ihe ọjọọ. Baịbụl kwuru na mmanya bụ onyinye sí n’aka Chineke nke na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. (Abụ Ọma 104:14, 15; Ekliziastis 3:13; 9:7) O kwukwara na mmanya nwere ike ịgwọ ọrịa ụfọdụ.—1 Timoti 5:23.
Jizọs ṅụrụ mmanya mgbe ọ nọ n’ụwa. (Matiu 26:29; Luk 7:34) Otu n’ime ọrụ ebube ndị a ma ama Jizọs rụrụ bụ ime ka mmiri ghọọ mmanya mgbe ọ gara agbamakwụkwọ.—Jọn 2:1-10.
Nsogbu ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata
N’agbanyeghị na Baịbụl kwuru na ịṅụ mmanya abụghị ihe ọjọọ, o kwuru na anyị ekwesịghị ịṅụ oké mmanya ma ọ bụ ṅụbiga mmanya ókè. N’ihi ya, Onye Kraịst ọ bụla chọrọ ịṅụ mmanya na-aba n’anya ekwesịghị ịṅụbiga ya ókè. (1 Timoti 3:8; Taịtọs 2:2, 3) Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji ghara ịna-aṅụbiga mmanya ókè.
Ọ na-eme ka mmadụ ghara iche echiche nke ọma nakwa ka isi ghara ịkpakọ onye ahụ ọnụ. (Ilu 23:29-35) Onye mmanya na-egbu agaghị erubeli isi n’iwu a Baịbụl nyere anyị. Ọ sịrị: ‘Nyefeenụ Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.’—Ndị Rom 12:1.
Ịṅụbiga mmanya ókè na-eme ka mmadụ ghara ịna-ejide onwe ya. Ọ ‘na-anapụkwa ezi uche.’—Hosia 4:11; Ndị Efesọs 5:18.
O nwere ike ime ka mmadụ daa ogbenye, kpatakwara onye ahụ ọrịa ọjọọ.—Ilu 23:21, 31, 32.
Chineke kpọrọ ịṅụ oké mmanya na ịnụbiga mmanya ókè asị.—Ilu 23:20; Ndị Galeshia 5:19-21.
Iko ole ka mmadụ ga-aṅụ ya abụrụ na ọ ṅụọla oké mmanya?
Ọ bụrụ na mmanya mmadụ na-aṅụ na-akpatara ma yanwa ma ndị ọzọ nsogbu, onye ahụ na-aṅụ oké mmanya. Ihe Baịbụl kwuru e ji amata na mmadụ aṅụbigala mmanya ókè abụghị na onye ahụ tụbọrọ atụbọ, kama ọ bụ na uche anaghị akpakọ onye ahụ ọnụ, ya ana-adagharị adagharị, na-arụ ụka na-enweghị isi ma na-ekwugheri ekwugheri. (Job 12:25; Abụ Ọma 107:27; Ilu 23:29, 30, 33) Ndị na-agbadị mbọ ka mmanya ghara igbu ha nwedịrị ike ịṅụ oké mmanya, ma taa ahụhụ ọ na-akpata.—Luk 21:34, 35.
Mgbe mmadụ na-ekwesịghị idetụ mmanya ọnụ
Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ nwere ike ime ka Onye Kraịst ghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya:
Ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.—Ndị Rom 14:21.
Ọ bụrụ na iwu obodo machibidoro ịṅụ mmanya na-aba n’anya.—Ndị Rom 13:1.
Ọ bụrụ na mmadụ anaghị ejideli onwe ya ka ọ ghara ịṅụbiga mmanya ókè. Ndị aṅụrụma na ndị ọzọ mmanya na-aba n’anya na-akpatara nsogbu kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha nwee ike ịkwụsị ịna-aṅụ ya.—Matiu 5:29, 30.