Ekwensu Ọ̀ Dị Adị n’Eziokwu?
Ihe Baịbụl kwuru
Ee, Ekwensu dị adị. Ọ bụ ya “na-achị ụwa.” Ọ bụbu mmụọ ozi, ma o mechara nupụrụ Chineke isi. (Jọn 14:30; Ndị Efesọs 6:11, 12) O nwere aha ndị Baịbụl kpọrọ ya iji mee ka anyị mata ụdị onye ọ bụ. Aha ndị a bụ:
Setan, nke pụtara “Onye Mmegide.”—Job 1:6.
Ekwensu, nke pụtara “Onye Nkwutọ” n’asụsụ Grik.—Mkpughe 12:9.
Agwọ, nke pụtara “Onye Nduhie” n’ọtụtụ ebe na Baịbụl.—2 Ndị Kọrịnt 11:3.
Onye Ọnwụnwa.—Matiu 4:3.
Onye Ụgha.—Jọn 8:44.
Ekwensu abụghị mmadụ ma ọ bụ ihe ọjọọ dị n’ime mmadụ
O nwere ndị na-asị na mmadụ bụ Ekwensu ma ọ̀ bụkwanụ na Ekwensu bụ ihe ọjọọ dị n’ime mmadụ. Ma, o nwere mgbe Ekwensu na Chineke kwurịtara okwu. Ebe ha nọ kwurịta okwu ahụ bụ n’eluigwe. N’ihi ya, ọ bụghị mmadụ ka ya na Chineke kwurịtara okwu ahụ, kama, ọ bụ otu mmụọ e kere eke. (Job 2:1-6) O nwekwara mgbe Ekwensu na Jizọs kwurịtara okwu. (Matiu 4:8-10) Ihe ndị a na-egosi na Baịbụl na-ekwu na Ekwensu bụ onye dị adị, ọ bụghị ihe ọjọọ dị n’ime mmadụ.
Ò kwesịrị iju anyị anya na ọtụtụ ndị ekweghị na Ekwensu dị adị? Mba, n’ihi na Baịbụl kwuru na Ekwensu na-eji aghụghọ eduhie ndị mmadụ. (2 Tesalonaịka 2:9, 10) Otu n’ime aghụghọ ya kachanụ bụ na ọ na-eme ka uche ndị mmadụ kpuo ìsì, ka ha ghara ịma na ọ dị adị.—2 Ndị Kọrịnt 4:4.
Ihe ndị ọzọ na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara Ekwensu
Ụgha: Aha ọzọ a na-akpọ Ekwensu bụ Lusifa.
Eziokwu: Okwu Hibru a sụgharịrị ka ọ bụrụ “Lusifa” na Baịbụl ụfọdụ pụtara “onye na-enwu dị ka ìhè.” (Aịzaya 14:12) Ihe ndị ọzọ e kwuru n’Aịzaya isi iri na anọ gosiri na ọ bụghị Ekwensu ka a kpọrọ Lusifa, kama ọ bụ ndị eze Babịlọn, bụ́ ndị Chineke ga-emenye ihere n’ihi na ha dị mpako. (Aịzaya 14:4, 13-20) E ji okwu a bụ́ “onye na-enwu dị ka ìhè” kwaa ọchịchị Babịlọn emo mgbe o mechara daa.
Ụgha: Chineke ji Ekwensu kwara ngwa ọrụ o ji anwa ndị mmadụ ọnwụnwa.
Eziokwu: Ekwensu bụ onye iro Chineke, ọ bụghị onye ozi Chineke. Ekwensu na-emegide ndị Chineke ma na-ebo ha ebubo.—1 Pita 5:8; Mkpughe 12:10.