Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
Ihe Baịbụl kwuru
Okwu Grik e si na ya nweta aha akwụkwọ Baịbụl a a na-akpọ Mkpughe bụ A·po·kaʹly·psis (apọkalips). Ihe ọ pụtara bụ “Imeghe” ma ọ bụ “Ikpughe.” Aha akwụkwọ a gosiri na o meghere ihe ndị e zochiri ezochi, kpugheekwa ihe ndị ga-emenụ ọtụtụ afọ e dechara akwụkwọ a. Ọtụtụ amụma ndị e dere na ya emezubeghị.
Isi ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe
Okwu mmalite.—Mkpughe 1:1-9.
Ozi Jizọs zigaara ọgbakọ asaa.—Mkpughe 1:10-3:22.
Ọhụụ Jọn hụrụ ka Chineke nọ n’ocheeze ya n’eluigwe.—Mkpughe 4:1-11.
Ọhụụ dị́ iche iche Jọn hụrụ, ya hụchaa otu, ọzọ esochie:
Ihe asaa a kara akara.—Mkpughe 5:1-8:6.
Opi asaa, atọ ndị nke ikpeazụ n’ime ha kpatara ahụhụ.—Mkpughe 8:7-14:20.
Efere asaa. Ihe dị́ n’ime nke ọ bụla n’ime ha bụ ihe otiti, ya bụ, ikpe Chineke nke a ga-awụpụ n’ime ụwa.—Mkpughe 15:1-16:21.
Ọhụụ ndị Jọn hụrụ gbasara mbibi ndị iro Chineke.—Mkpughe 17:1-20:10.
Ọhụụ ndị Jọn hụrụ gbasara otú Chineke ga-esi agọzi eluigwe na ụwa.—Mkpughe 20:11-22:5.
Okwu mmechi.—Mkpughe 22:6-21.
Ihe ndị ga-enyere mmadụ aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe
Ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe bara uru, ọ bụghị ihe na-emenye ndị na-efe Chineke egwu. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-ekwu na “apọkalips” pụtara oké ọdachi, ma ihe e kwuru ná mmalite akwụkwọ Mkpughe nakwa ná ngwụcha ya bụ na obi ụtọ ga-adịrị onye ọ bụla na-agụ ihe ndị e dere na ya, na-aghọta ha ma na-eme ha eme.—Mkpughe 1:3; 22:7.
E nwere ọtụtụ “ihe atụ” ma ọ bụ ihe nnọchianya n’akwụkwọ Mkpughe. E kwesịkwara ịghọta ha ka ihe atụ.—Mkpughe 1:1.
E nweela ebe ndị ọzọ na Baịbụl e bu ụzọ dee gbasara ọtụtụ ndị e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe nakwa ọtụtụ ihe atụ e dere na ya:
Jehova, “ezi Chineke n’eluigwe,” Onye kere ihe niile.—Diuterọnọmi 4:39; Abụ Ọma 103:19; Mkpughe 4:11; 15:3.
Jizọs Kraịst, “Nwa Atụrụ Chineke.”—Jọn 1:29; Mkpughe 5:6; 14:1.
Setan bụ́ Ekwensu, onye na-emegide Chineke.—Jenesis 3:14, 15; Jọn 8:44; Mkpughe 12:9.
Babịlọn Ukwu ahụ, onye iro Jehova Chineke na onye iro ndị na-efe Chineke. Ọ bụ na ya ka e si nweta ụgha ndị a na-akụzi n’okpukpe dị́ iche iche. Babịlọn Ukwu ahụ yiri Babịlọn oge ochie (ya bụ, Bebel) n’ihi na Babịlọn oge ochie bụkwa onye iro Jehova na ndị fere Jehova, e sikwa na ya nweta ọtụtụ ozizi ụgha.—Jenesis 11:2-9; Aịzaya 13:1, 11; Mkpughe 17:4-6; 18:4, 20.
“Oké osimiri,” ya bụ, ndị ajọ omume na-emegide Chineke.—Aịzaya 57:20; Mkpughe 13:1; 21:1.
Ihe ndị dị́ n’ụlọikwuu e ji fee Chineke n’oge ochie. Ụfọdụ n’ime ha bụ igbe ọgbụgba ndụ, oké osimiri nke yiri enyo (ya bụ, nnukwu efere mmiri dị n’ime ya), oriọna, ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na ebe ịchụàjà.—Ọpụpụ 25:10, 17, 18; 40:24-32; Mkpughe 4:5, 6; 5:8; 8:3; 11:19.
Anụ ọhịa nke nọchiri anya ọchịchị ụmụ mmadụ.—Daniel 7:1-8, 17-26; Mkpughe 13:2, 11; 17:3.
Ọnụ ọgụgụ ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha.—Mkpughe 1:20; 8:13; 13:18; 21:16.
Ọhụụ ndị ahụ bụ maka ‘ụbọchị Onyenwe anyị,’ nke malitere mgbe Alaeze Chineke bidoro n’afọ 1914, Jizọs amalitekwa ịchị. (Mkpughe 1:10) Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịtụ anya na ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe ga-akacha emezu n’oge anyị a.
Ihe ndị ga-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe bụkwa ihe ndị na-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ, ya bụ, amamihe sí n’aka Chineke na aka ndị ghọtarala ihe Baịbụl na-ekwu ga-enyere anyị.—Ọrụ Ndịozi 8:26-39; Jems 1:5.