Baịbụl Ò Kwuru na Ndị Mmadụ Ga Na-eche Echiche Otú Ha Si Eche Taa ma Na-akpa Àgwà Otú Ha Si Akpa?
Ihe Baịbụl kwuru
Ee. Baịbụl kwuru na àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa ga-aka njọ n’oge anyị a. O kwuru na ọtụtụ ndị enweghị ihe ha ga-eji àgwà ọma na àgwà ndị na-eme ka ihe na-aga aga n’obodo kpọrọ. a (2 Timoti 3:1-5) Ma Baịbụl kwukwara na ụfọdụ ndị agaghị eso na-akpa àgwà ọjọọ ndị ahụ. Kama ịna-akpa ha, Chineke ga-enyere ha aka ha akwụsị ime ihe ndị na-adịghị mma ma mụta iche echiche na ịkpa àgwà otú dị ya mma.—Aịzaya 2:2, 3.
Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a
Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara otú ndị mmadụ ga-esi na-eche echiche n’oge anyị a nakwa otú ha ga-esi na-akpa àgwà?
Baịbụl kwuru àgwà ọjọọ dị iche iche ndị mmadụ ga na-akpa, ha ga na-akpakwa àgwà ndị ahụ maka na ha na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-anaghị ejideli onwe ha,” “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya,” na “ndị ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ, ọ bụghị ịhụ Chineke n’anya.”—2 Timoti 3:2-4.
Ndị mmadụ taa na-akpa nnọọ àgwà ndị a Baịbụl kwuru na ha ga na-akpa. Ha na-eche naanị banyere onwe ha, na-achọ naanị ihe ga-abara ha uru, ihe ga-eme ka obi dị ha mma, ihe ga-eme ka a mara na ha sokwa biri, nakwa àgwà ndị ọzọ yiri ndị a. Ụdị àgwà ndị a na-akazi njọ ka chi na-abọ, ọtụtụ ndị na-echezi naanị gbasara onwe ha. Àgwà a eriela ọtụtụ ndị ahụ́ nke na ha aghọọla “ndị ihe ọma na-anaghị amasị,” ya bụ, àgwà ọma agaghịzi amasịli ha. Ha anaghịkwa echeta igosi na obi dị ha ụtọ maka ihe ndị ha nwere ma ọ bụ maka ihe ọma ndị ọzọ meere ha n’ihi na ha bụ “ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe.”—2 Timoti 3:2, 3.
Ọ bụkwa maka na ndị mmadụ na-achọ naanị ọdịmma onwe ha mere ha ji akpa àgwà ndị ọzọ a Baịbụl kwuru ga-eju ebe niile n’oge anyị a:
Ndị anyaukwu. Ọtụtụ ndị bụ “ndị hụrụ ego n’anya.” Ha chere na ọ bụ ego ole ha nwere ma ọ bụ otú ha baruru ọgaranya ka e ji ama na ihe na-agara ha nke ọma.—2 Timoti 3:2.
Ndị mpako. Ọtụtụ ndị bụ “ndị na-etu ọnụ, ndị mpako,” na “ndị onwe ha na-ebu isi.” (2 Timoti 3:2, 4) Ụdị ndị a na-eto onwe ha. Ha kwuwe gbasara ihe ndị ha ga-emeli, àgwà ha na-akpa, ma ọ bụ otú ha nweruru akụnụba, ha etinye ya nnu na ose.
Ndị nkwutọ. “Ndị na-ekwulu ndị ọzọ” na “ndị na-ekwutọ ndị ọzọ” juru ebe niile n’ụwa. (2 Timoti 3:2, 3) Ikwulu ndị ọzọ na ikwutọ ndị ọzọ nwekwara ike ịpụta na ha na-akparị ma ndị ọzọ ma Chineke ma ọ bụkwanụ na-agha ụgha banyere ha.
Ndị na-anaghị ekwe ekwe. Ọtụtụ ndị mmadụ bụ “ndị na-agharịpụ ndị ọzọ,” “ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla,” “ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ,” na “ndị isi ike.” (2 Timoti 3:2-4) Ndị na-akpa àgwà ndị a anaghị ekwe ka ha na ndị ọzọ kwurịta ihe e kwesịrị ime ma ọ bụ otú a ga-esi dozie okwu, ha anaghịkwa eme ihe ndị ha na ndị ọzọ kwekọrịtara.
Ndị tigbuo zọgbuo. Ọtụtụ ndị taa bụ “ndị tigbuo zọgbuo” na ndị na-ewe iwe ọsọ ọsọ. Ihe a na-emekwa ka ha na-alụkarị ọgụ ma ọ bụ na-emerụ ndị ọzọ ahụ́.—2 Timoti 3:3.
Ndị na-emebi iwu. Jizọs kwuru na ‘mmebi iwu ga-eju ebe niile’ n’oge anyị a. (Matiu 24:12) O kwukwara na a ga na-enwekwu “ọgba aghara” n’ebe dị iche iche.—Luk 21:9.
Ndị na-ahụghị ndị ezinụlọ ha n’anya. Ọtụtụ ndị taa bụ “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi” na “ndị na-enweghị obi mmadụ.” O meekwala ka ọtụtụ ndị ghara ịna-elebara ndị ezinụlọ ha anya, na-emegbu ha ma ọ bụ na-akụ ha isi aba okpu.—2 Timoti 3:2, 3.
Ndị na-eme ka hà hụrụ Chineke n’anya ma e nweghị ihe ha ji ya kpọrọ. Ọtụtụ ndị taa na-eme ka “hà ji Chineke kpọrọ ihe.” (2 Timoti 3:5) Kama ha ga-eme ihe Chineke chọrọ, ha na-eso ndị isi okpukpe, bụ́ ndị na-agwa ha ihe ndị ha chọrọ ịnụ.—2 Timoti 4:3, 4.
Olee ihe ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha nwere ike ịkpatara ndị ọzọ?
Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, o meela ka e nwee ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha na ndị uche na-anaghị akpakọcha ọnụ. Ha dịkwa ọtụtụ n’oge a karịa oge ọ bụla ọzọ. (Ekliziastis 7:7) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị hụrụ ego n’anya na-egwu ndị ọzọ wayo. Ndị na-enweghị obi mmadụ nwere ike imegbu ndị ezinụlọ ha, ya emezie ka ike ụwa gwụ ha ma ọ bụ ka ha chọwa igbu onwe ha. Ndị na-emekwa ndị ọzọ ihe ọjọọ na-akpatara ndị ahụ ha mere ihe ọjọọ obi mgbawa ha na-agaghị echefu echefu.
Gịnị mere àgwà ọtụtụ ndị ga-eji ka njọ?
Baịbụl kwuru ihe mere ndị mmadụ jizi akpa àgwà ọjọọ:
Ndị mmadụ anaghịzi ahụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya n’eziokwu. (Matiu 24:12) O meekwala ka ọtụtụ ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha.
A chụpụla Setan bụ́ Ekwensu n’eluigwe ma chụdata ya n’ụwa. (Mkpughe 12:9, 12) Kemgbe ahụ, o meela ka ndị mmadụ na-achọkwu naanị ọdịmma onwe ha.—1 Jọn 5:19.
Gịnị ka anyị kwesịrị ime gbasara otú àgwà ndị mmadụ si akakwu njọ?
Okwu Chineke kwuru, sị: “Na-eze ụdị ndị a eze.” (2 Timoti 3:5) Ihe a o kwuru apụtaghị na anyị na ndị mmadụ agaghị na-emekọ ihe. Kama, ọ pụtara na anyị ekwesịghị imete ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, ndị na-ekweghịkwa na Chineke, enyi.—Jems 4:4.
Ọ̀ bụ mmadụ niile ka àgwà ha ga na-akakwu njọ?
Mba. Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị ga “na-asụkwa ude n’ihi arụ niile a na-akpa” n’ụwa. (Ezikiel 9:4) Ha ga na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ ma ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Ọ ga-edo anya na okwu ha na omume ha dị iche na nke ndị ọzọ. (Malakaị 3:16, 18) Dị ka ihe atụ, ha ga na-agba mbọ ka ha na mmadụ niile dịrị n’udo, ha agaghịkwa na-etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara agha na tigbuo zọgbuo.—Maịka 4:3.
Àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa ọ̀ ga-eru nke na ọgba aghara ga-adịzi ebe niile n’ụwa?
Mba. Ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme agaghị eme ka ebe niile bụrụzie naanị ọgba aghara na tigbuo zọgbuo. Kama, ihe ga-eme bụ na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi ndị niile na-emebi iwu ya. (Abụ Ọma 37:38) Ọ ga-eme ka e nwee “ụwa ọhụrụ,” ya bụ, ụmụ mmadụ dị umeala n’obi, ndị ga-ebi n’ụwa a. Ha ga-ebikwa n’udo ruo mgbe ebighị ebi. (2 Pita 3:13; Abụ Ọma 37:11, 29) Ihe a ga-eme eme, ọ bụghị ịmụ anya arọ nrọ. Baịbụl na-enyere ndị mmadụ aka taa ịgbanwe ndụ ha, na-ebizi ndụ otú Chineke si chọọ.—Ndị Efesọs 4:23, 24.
a Amụma Baịbụl na ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi na oge a anyị bi na ya bụ “oge ikpeazụ,” nke e kwuru na ọ “ga-adị oké egwu,” “taakwa akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ị chọọ ịmatakwu gbasara oge ikpeazụ, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?”