Akụkọ
AKỤKỌ NDỊ SI N'OBODO DỊ ICHE ICHE
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024—Agba nke 7
Na vidio a, anyị ga-amata otú ụmụnna anyị nọ ebe dị iche iche n’ụwa mere, gerekwa ajụjụ ọnụ tọrọ ụtọ a gbara Nwanna Jody Jedele na Nwanna Jacob Rumph bụ́ ndị a họpụtara ọhụrụ ka ha soro n’Òtù Na-achị Isi.
AKỤKỌ NDỊ SI N'OBODO DỊ ICHE ICHE
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024—Agba nke 7
Na vidio a, anyị ga-amata otú ụmụnna anyị nọ ebe dị iche iche n’ụwa mere, gerekwa ajụjụ ọnụ tọrọ ụtọ a gbara Nwanna Jody Jedele na Nwanna Jacob Rumph bụ́ ndị a họpụtara ọhụrụ ka ha soro n’Òtù Na-achị Isi.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024—Agba nke 6
Na vidio a, anyị ga-ahụ otú anyị ga-esi lekwasị anya n’ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024—Agba nke 5
Na vidio a, anyị ga-ahụ otú anyị ga-esi na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu ụmụ mmadụ niile.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024—Agba nke 4
Na vidio a, anyị ga-ahụ otú ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị a tụrụ mkpọrọ maka ihe ha kweere, si ‘na-eme ihe ọma ka ha wee merie ihe ọjọọ.’—Ndị Rom 12:21.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024—Agba nke 3
Na vidio a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ikpebi otú anyị ga-esi na-eji ejiji.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024—Agba nke 2
Na vidio a, anyị ga-ahụ otú Nna anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova si gosi na “ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Anyị ga-ahụkwa ihe ụfọdụ a gbanwere n’otú anyị si eji ejiji mgbe anyị chọrọ ịga ọmụmụ ihe, ịga ozi ọma, ma ọ bụ ịga mgbakọ.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024—Agba nke 1
Chọpụta otú ịhụ ndị mmadụ n’anya si eme ka anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023—Agba nke 8
Chọpụta otú uwe anyị na ejiji anyị si eme ka a mata na anyị bụ ndị ozi Chineke nakwa otú anyị ga-esi na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023—Agba nke 7
Mata gbasara akwụkwọ ọhụrụ e wepụtara bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova nakwa isiokwu afọ 2024.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023—Agba nke 6
N’akụkọ a, onye so n’Òtù Na-achị Isi gosiri vidio ajụjụ ọnụ na-agba ume a gbara Nwanna Negede Teklemariam.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023—Agba nke 5
N’akụkọ a, onye so n’Òtù Na-achị Isi gbara Nwanna Dennis Christensen na Irina nwunye ya ajụjụ ọnụ. Ajụjụ ọnụ ahụ na-agba ume.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023—Agba nke 4
N’akụkọ a, otu onye so n’Òtù Na-achị Isi ga-agwa anyị okwu ga-eme ka ịga mgbakọ ukwu ihu na ihu gụsiwa anyị agụụ ike. Ọ ga-akọwakwa otú Jehova si na-echebe ndị ya.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023—Agba nke 3
Otu onye so n’Òtù Na-achị Isi ga-akọrọ anyị otú ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ na Jamanị, ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka nakwa na Bahamas si mee Jehova ebe mgbaba ha n’agbanyeghị nsogbu ma ọ bụ ihe isi ike ndị tara akpụ.
Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023—Agba nke 2
Onye so n’Òtù Na-achị Isi ga-agwa anyị banyere ụmụnna anyị nọ na Tọkiye. Ọ ga-agbakwa ụmụnna abụọ so n’Òtù Na-achị Isi ajụjụ ọnụ ga-agba anyị ume.
Ebe Ndị A Tụrụ Ndịàmà Jehova Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere
Ebe ndị a tụrụ Ndịàmà Jehova mkpọrọ n’ihi na ha na-ekpe okpukpe ha, na-emekwa ihe ndị ha nweere onwe ha ime, ọtụtụ n’ime ha nọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya.